Etu anyị si jiri Facebook rụọrọ ụmụnwaanyị ogbenye abụọ ụlọ - Charles Ogbu
Ọ bụ na Facebook ka akụkọ a malitere.
Charles Ogbu, bụ onye a ma ama n'ogige ahụ, kọọrọ ndị enyi ya akụkọ maka ụmụnwaanyị ọ hụrụ oge ọ na-eme mgbasaozi banyere coronavirus n'ime obodo.
Dịka Maazị Ogbu siri kwuo, ụmụnwaanyị ndị a bi n'ụlọ dịka ikuku kuo, ha adaa.
Ọtụtụ ndị mmadụ malitere ịjụ etu ha ga-esi nyere aka.
Ugbua, site n'aka ndị a amaghịdị onwe ha, a rụọla ụlọ abụọ bụ ebe ụmụwaanyị ndị a bi ugbua.
Ndị mmadụ kwanyekwara ngwongwo eji ebi n'ụlọ n'ime ụlọ ndị a.
Lee akụkọ a n'uju.
Ndị mere akụko a bụ Chiagozie Nwonwu na Vining Ogu.


