Enugu-Ezike tragedy: 'Ọnwụ ụmụokoroọbịa nwụrụ n'ọmị mmiri na-ewute anyị'

Ndị obodo Igogoro, Enugu-Ezike dị n'okpuruọchịchị Igboeze Nọt, n'Enugu steeti, ka na-eru uju ụmụ ha nwụrụ n'ime ọmị mmiri.

Otu n'ime ha gwara BBC Igbo na iwe na-ewe ya makana ọ bụ ụmụokoroọbịa ike juru n'ahụ nwụfuru etu ahụ.

Ha kọwara etu ụmụokoroọbịa ahụ si wee na-agba mbọ ebe a na-egwu ntọala e ji arụ ụlọ, tupu ọdachi a adakwasị ha.

Cheta na akụkọ pụtara ụbọchị Mọnde bụ Julaị 22, 2019, na ụmụnwoke asatọ nwụrụ n'ime ọmị mmiri ka ha gara ịzọpụta otu onye dabara n'ime ya.