You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ekene Franklin Ezeunala: Etu m siri nwetekarịa onye ọbụla na Jamb 2019
N'ụlọakwụkwọ Ekene Franklin Ezeunala dị na mpaghara Mieran na Legọs, ndi nkuzi na-akọwa na ọ bụ onye akwụkwọ na-atọ ezigbote ụtọ.
Ihe a mere ojighi tụọ ha n'anya mgbe ọ tụrụ ugo dịka onye kachasị mee ọfụma n'ụle ngalaba na-ahụ maka ule e ji abanye mahadum bụ Joint Admission and Matriculation Board (Jamb) nke 2019.
Ekene gwara BBC na ọ bụ ịgụ akwụkwọ ọfụma na ịhụ akwụkwọ n'anya nyere ya ikike ituru ugo a.
Ọ gwakwara BBC Igbo na ihe mmadụ dị ka Albert Einstein mere so na-enye ya olileanya na ihe ọbụla o tinyere uche, ọ ga-emenwu ha.
Gee ya ntị n'uju n'ihe nkiri a: