Governorship Election: Ihe mere ọtụtụ Ndigbo apụtaghị tụọ vootụ na Legọs

Ọdọ atụmvootu n' otụtụ mpaghara ebe Ndịgbo bị dị Oshodi, Okota,Orile,Ajegunle,Amukoko dị ka ebe udele nwụrụ n'ihi na ha apụtaghị tụọ vootu.

Ụfọdụ ndị kara obi pụtara Legọs kọwara na ọ bụ egwu ọgbaghara ime dịka o siri mee na nke ọkwa onyeisiala nakwa wuruwuru ha sị na e mere na ntuliaka ahụ mere ha jiri hara ịnọ n'ụlọ.