Rochas Okorocha: E nwee ndị Prof Ibeawuchi natara ego, ya nyeghachị ha
Ọkammụta Ibeawuchi Izuchukwu gwara BBC Igbo na ndị na-akwado Rochas Okorocha wakporo ma jiri ike mee ka ọ kpọpụta ọnụọgụgụ vootu a tụrụ na mpaghara Ọlụ maka ọkwa sineti.
Dịka Izuchukwu kwuru, Okorocha nyere ya otu elekere iji gụpụta ya bụ aha.
Mana, na mkparitaụka ya na BBC Igbo nwere, Okorocha sị na ọ bụ asị ka Ọkammụta na-atụ.
Okorocha jụkwara sị na Ibeawuchi "ọ bụkwa ezigbote ọkammụta?"
Lee ihe ndi ọzọ o kwuru n'ihe onyonyo a.