Nigeria Election 2019: Etu ndị akaọrụ mbiputa si erite uru n'oge ntuliaka
Kedụ ndị ka erite uru ma oge ntuliaka ruo?
BBC Igbo sogharịrị ndị akaọrụ ha bụ ibiputa ihe, ha kọwara etu oge ntuliaka si bụrụ oge ha kacha eri.
Makana ha sị na ndị ndọrọndọrọ na-ebuputere ha nnukwu ego iji achụ nta vootu, ọ na-eme ka nnukwu ego na-abanye n'akpa ndị na-ebiputa okpu, akwa, ọkọlọtọ nakwa ihe ndị ọzọ ha na-eke ndị mmadụ.
