Ọ ga-ekwe gị mee, kwuo ihe bụ 'Flag' n'Igbo
Asụsụ Igbo amaka ma dịkwa ụtọ ịsụ mana ụfọdụ mmadụ na-ahụtazi ya ka ihe rịara ahụ maka na a naghị asụzi ya kwa mgbe.
Nke a kpatara na a tufuola ụfọdụ mkpụrụokwu n'Igbo.
Ndị ka na-eto eto ma ndị okenye ụfọdụ echezola ụfọdụ okwu ndị a.
Nke a mere BBC igbo jiri banye ahịa Agụleri n'Anambara steeti jụọ ndị mmadụ ihe a na-akpọ 'Flag' n'asụsụ Igbo.
Azịza ha ga-akpa gị ọchị.
