You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Plateau: 'Oke ihe anya mmiri mere'
Ụfọdụ ndị gabigara ihe ize ndụ na Plateau steeti akọwala ihe anya ha hụrụ n'ogbugbu ndị mmadụ ahụ.
Akụkọ kwuru na e gburu mmadụ ruru iri asatọ na isii n'ọgbaghara ahụ mere n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụugbo mana ndị hụrụ ihe mere kwuru na ọnụọgụgụ a nwereike ịkarị.
Onyeisiala gara steeti ahụ ụnyaahụ wee rịọ ka ndị mmadụ ghara itinye iwu n'aka ha ma hapụrụ ndị ọrụ nchekwa ọrụ ha ichekwa obodo.
Onyeisiala kwuru nke a ka ndị otu ọchịehi Miyetti Allah Cattle Breeders Associaltion kwuru na ihe kpatara ya bụ mmemina bụ na ndị obodo ahụ gburu ehi ha ruru narị atọ.
Ndị agha "Operation Safe Haven" kwuru na ha anwụchila mmadụ iri na atọ a na-enyo nwereike iso n'otu abụọ ahụ butere ọgbaghara ahụ mere.