Orits Williki : "Etu egwu m tiri maka ọnọdụ Naịjirịa si butere m nsogbu n'aka DSS"

Oti egwu a ma ama bụ Orits Williki kọwaara BBC Igbo etu o si wee malite iti egwu.

Ọ kọwara na ezigbo aha ya bụ Orisebemigho Williki, bụrụkwa onye nna nna ya si na na mba Itiop (dị n'Itiopịa ugbua) wee bịa Naịjirịa.

Williki gwara BBC Igbo na mwute maka ọnọdụ Naịjirịa n'oge ahụ kpalitere etu egwu ha si wee daa n'oge ahụ.

Ọ kọwara na ọ dị mma ka ndị oti egwu jiri ohere ha nwere gbasaa ozi ndozi obodo ma kuziere ndị na-eso ha ihe dị mma, dịka ha si wee mee mgbe oge nke ha mgbe ogbugbu ndị mmadụ karịrị n'ihi nghọtahie maka okpukperechi.

O lekwara anya ka ndị ọgbara ọhụrụ si agụ egwu nke ha ma nyekwa ndụmọdụ etu ha ga-esi eti egwu banyere ntaramahụhụ ndị mmadụ nakwa nke ga-akwọwa ka ọnọdụ si dị ugbua.

Oris Williki gwakwara BBC Igbo ka o ji ghọta asụsụ Igbo, ma kọwaa ka o si wee biri n'Ọnịcha afọ atọ.

Oris Williki kọwara na ụmụ ya karịrị ịgụ agụ.

Ọ katọkwara ise aṅụrụ, ma na-ekwu na ndị oti egwu n'onwe ha ekwesịghị ịna-aṅụ ihe ọbụla n'aha iji kwalite egwu ha.

Cheta na Oris Williki bidoro tiwe egwu n'afọ 1982, mana o bipụtara egwu e jiri mara ya n'afọ 1989.

O nwetala ọtụtụ ihe nrite maka egwu ya. Ụdịrị egwu e jiri mara ya bụ reggae, mana ugbua ọ gwara BBC Igbo na o bidola tiwe egwu ụka.

Ndị mere ihe onyoonyo a:Adline Okere, Chris Sanctus Okereke nakwa Vining Ogu

Kirie vidio a ka ị gee ihe o kwuru n'uju: