Nigeria Presidential Election 2023: Mkpebi Tinubu mere ga-ebute ọgbaghara - Ohaneze Ndigbo
Ohaneze ndígbo ekwuola hohaa na ha anabataghị etu Bola Ahmed Tinubu bụ aka chiburu lagos si kwuo na ya na-azọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'afọ 2023.
Alex Ogbonnia bụ odeakwụkwọ otu ahụ kwuru na nke a gosiri na Mazi Tinubu ebughị idinotu Naịjirịa n'obi.
N'ọnụ ya, " O were onye ọbụla anya na etu e si atụgharị ọchịchị, na ọ bụ ndị Igbo ka o ruru mana Tinubu kpacha anya na-chọ itinye onwe ya n'ihe na-adịgh ị mma."
Ọ gara n'ihu sị, "Chukwu ga-eme ka ebum uche ya kpụọ n'ala kpam kpam makana ọ bụ ihe mmegide ka ọ na-eme."
Ihe ndị ọzọ o kwuru dị n'onyonyo a dị ebe a.