Etu 'social media' si mee ka ahịa abacha nne m bụrụzie nke gara mahadum - Amarachi Igbo

Otu ọkpụrụkpụ ihe nne na nna ji eziga ụmụ ha mahadum bụ ka ọdịnihu ha wee dị mma.

Olileanya bụ na nwata gụchaa akwụkwọ dị elu pụta, ọ ga-achọta ọrụ wee malite inyere onwe ya na ndị ezinụlọ ya aka.

Amarachi Igbo bụ nwaada gụchara akwụkwọ mahadum, ma fee ala Naịjirịa n'afọ 2021.

Mana kama ọ ga-anọ nkịtị chọwa ọrụ oyibo, o sonyeere nne ya n'ahịa abacha ọ na-azụ.

Iji gosi na ya agaala mahadum lọta, Amarachi malitere iji soshal midia ewulite ahịa abacha nne ya.

Ugbua, ọtụtụ ndị ntorobịa na-akpọzị ya 'abacha gara mahadum'.

Lee etu Amarachi si eme ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Vining Ogu.