Chinmark Ijomah: Aka m nọ Naijiria, o nweghị onye m ji ego ya gbaa ọsọ

Onyeisi ụlọọrụ Chinmark Group bụ Chinedu Ijoma ekwuola na ihe mere ya ji ghara imezu nkwa ịkwụ ndị tinyere ego n'ụlọọrụ ya bụ n'ihi na ngalaba na-ahụmaka itinye ego n'azụmahịa a kpọrọ Security Exchange Commission(Sec) natara ikike gbachie akpaego ya na nke ụlọrụ ya dị n'ụlọakụ.

Chinmark na Chinedu Ijomah na-ewu kemgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụnwa.

Ọtụtụ ndị a na-eti mkpu ego ha kwuru na mbọ niile ha gbarala maka nke a dara mmiri dịka Ijomah gbachiri ekwentị ya ma were ndị agbro wujuo n'ụlọọrụ ya dịga na mpaghara di iche iche na Naijiria nakwa na Dubai.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ijomah kwuru na ọ bụghị ọsọ ka ya gbara kama na SEC gbachiri akpaego ya, nke nwunye ya na nwa ya.

O kwuru na o nweela ndị ya kwụrụ ụgwọ n'ime ihe ruru mmadụ 400 tinyere ego n'ụlọahịa ya. ma kwekwa nkwa na ya ga-anwụ ndị fọrọ afọ ma ọ bụrụ na ha nye ya ohere ọnwa asaa na-abịa.

Kedụ etu ndị mmadụ siri mara na nnu aṅaala ofe n'okwu ụlọọrụ Chinmark?

Ha dọrọ ndị mmadụ aka na nti ka ha mata na Chinmark group nke nọ n'okpuru aha Fin Africa Investment Limited edenyeghị aha azụmahia ya n'akwụkwọ SEC ma na-ekwu na onye ọbụla ya na ha na-emekọ ihe, ihe ọ hụru ya jiri isi ya buru.

Nke a eme ka ndị ụlọọrụ ọba ego amachie ego niile ụlọọrụ Chinmark n'ọba ego ha.

O mere ka ndị niile tinyere ego karịrị mmadụ puku anọ.

Onye bụ Chinmark?

Chinedu Ijomah na-ewu kemgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụnwa.

Ọ bụ onye a maaama ka onye ojiego achọ ego nwere ọtụtụ ụlọọrụ ebe ana-akọ ugbo, na-agbasa ozi ma na ụlọoriri.

Ndị mmadụ ma ya dịka onye na-enye ọha aka.

O lụọla nwunye ma mụkwa ụmụ.

Mana Chinedu Marksman kwuru na ha na-aga ije ya iji mata ma SEC ọ ga-akpọpere ha ọbaego ha niile.