Lee emume Ada siri kpọtụọ n'Aguleri

Iji wee mepee afọ ọhụrụ 2019, ndị Aguleri ma okenye, ndị ntorobịa nakwa ụmụaka ezukọtala mee oriri Ada.

Ada bụ mmemme ha ji echeta mmeri ha meriri ndị Arochukwu n'agha mgbe ochie.

Ya bụ mmemme Ada bụ nke a na-eme otu ụbọchị n' afọ bụkwazịrị oriri ha ji anabata afọ ọhụrụ.

Ha na- amalite ya bụ njem Ada site na ama Igwe ebe Eze C N Idigo 1V, Eze Aguleri ga enye ha ngozi tupu ha eburu egwu na ihe ngosi di iche iche were gbagharịa ala Aguleri niile.

Ụmụ okorobịa niile jikere n'ụdị eji anụ agha iji gosiputa njikere ha dị ichekwaba obodo ha.

Na nke afọ a, ndị na-eme ya bụ ihe ngosi kwụrụ na ahịrị na ahịrị site na ama Igwe rue na ahịa Otuocha.

Ha gara ebe akpụrụ onye nsọ Cyprain Iwene Tansi ga nara ngọzi tupu ha alaghachị n'ama Igwe.

Eze CN Idigo gwara igwe n'ụmụ ndị Aguleri na ndị bịara ịgbara anya ha afọ ọhụrụ n'obodo Aguleri bụ nke agọzịrị agọzi.

Ọ rịọrọ ha ka ha were udo na egwu nke Chineke were na eso ihe uwa.

Otu ọgbọ dị iche iche mere ngagharị oriri Ada ahụ jikwa ịkụ ngajị n'eze wee na ezu ike.