Ndị uweojii Naịjirịa akpọọla Joe Ajaero oku ọzọ

Akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile n'ọnwa Ọgọst 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Uche Akolisa

  1. NFF enyela Augustine Eguavoen ọrụ dịka onye nkuzi Super Eagles

    Augustine Eguavoen

    Ebe foto si, Augustine Eguavoen/Instagram

    Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation (NFF) enyela Augustine Eguavoen ọrụ dịka onye nkuzi bọọlụ ga-edu otu Super Eagles Naịjirịa gaa asọmpị Iko Afrịka na Morocco n’afọ 2025.

    Ozi anyị nwetara site na ngalaba mgbasa NFF kwuru na ihe mere ha jiri nye Eguavoen ọrụ ahụ bụ maka enweghị ezi nkwekọrịta dị n'etiti ha na onye nkụzị bọọlụ bụ Bruno Labbadia si mba Germany.

    Onyeisi NFF bụ Ibrahim Musa Gusau kwuru na “Kemgbe abalị atọ garaaga ka ha na Bruno Labbadia na-akpa gbasara etu a ga-esi kwụọ ego ụtụisi mba Germany manyere n’isi ego a ga-akwụ ya”.

    Gusau gara n'ihu kwuo na “Ụtụisi ahụ sị pasenti 32 ruo pasenti 40 bụ nke ọ chọrọ ka NFF kwụọ ya.

    NFF kwuru na ha na Bruno Labbadia nwere nkwekọrịta oge ha kpọpụtara aha ya dịka onye nkuzi otu egwu bọọlụ Super Eagles Naịjirịa, ma kwuo na ihe gbasara ụtụisi esoghị nkwekọrịta ahụ.

    Ka ọ dụ ugbua Augustine Eguavoen ga-anọ dịka onye nkuzi Super Eagles n'asọmpị itozu isonye n'asọmpi iko mba Afrịka ga-akpọtụ na mba Morocco n'afọ 2025.

    Super Eagels ga-ezuta Benin Repọblịk n’Uyo isi obodo Akwa Ibom steeti n’abali 7 n’ọnwa Septemba ma zute mba Rwanda na Kigali n’abali 10 ọnwa Septemba”.

    Cheta na Eguavoen agaala asọmpi iko Afrịka dịka onye nkuzi otu egwu bọọlụ Super Eagles ugboro anọ n’afọ 2005, 2007, 2010 na 2022.

  2. Ndị uweojii Naịjirịa akpọọla Joe Ajaero oku ọzọ

    Onyeisi ndị uweojii na Joe Ajaero

    Ebe foto si, Nigeria Police/NLC

    Ndị uweojii Naịjirịa akpọkuola onyeisi ụlọọrụ otu jikọrọ ndị ọrụ Nigeria Labour Congress (NLC) bụ Joe Ajaero ka ọ bịa n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja ụbọchị Tọzde, 5 Septemba.

    Akwụkwọ ozi Kọmishọna ndị uweojii Ibitoye Alajide binyere aka ụbọchị Fraịde, 30 Ọgọst, kwuru na Joe Ajaero na onye odeakwụkwọ otu NCL bụ Emmanuel Ugboaja ga-abịa n’isi ụlọọrụ ndị uweojii zara ọnụ ya maka ebubo dị icheiche e boro ya.

    Nke a bụ ugboro abụọ ndị uweojii na-akpọ Ajaero ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo dị icheiche a na-ebo ya.

    Cheta na ndị uweojii kpọrọ Joe Ajero ka ọ bịa n;isi ụlọọrụ ndị uweojii n’abalị 11 ọnwa Ọgọst maka ebubo mpụ na ịkwado ndị na-eyi ọha egwu.

    Mana Ajaero gwara onyeisi ndị uweojii na ya enweghị ohere ị bịa ụbọchị ahụ, ma kwuo na ya ga-aza oku ndị uweojii ahụ n’abalị 20 ọnwa Ọgọst.

  3. Ogbunigwe Rọshịa egbuola nwata nwaanyị dị afọ 14 n’ama egwuriegwu Kharkiv, Yukren

    Rọshịa atụọla ogbunigwe ya n'ama egwuregwu Yukren

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Rọshịa atụọla ogbunigwe ya na Yukren

    Ogbunigwe Rọshịa a dara n'ama egwuregwu dị na Kharviv, na mba Yukren ka gọọmenti mba ahụ si kwuo.

    Ihe ruru mmadụ ise ọzọ so na ndị e gburu ma ọtụtụ ndị ọzọ meruru ahụ ka ogbunigwe ahụ dara n’ụlọ ndị mmadụ bị na mpaghara Ukraine ahụ dị nso na Rọshịa

    Ihe onyonyo na-egosi awụrụ na ọkụ na-agba ụlọ ahụ ọgbunigwe dara n’isi ya.

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ji ohere ahụ arịọ mba niile na-akwado Ukraine ka ha nye Yukren ohere ịtụ ogbunigwe n’ime Rọshịa.

    Ogbunigwe ahụ dara naani nkenke awa ka Zelensky wepụrụ onyeisi agha ụgbọelu ha bụ ọchịagha Mykola Oleshchuk.

    Gọvanọ mpaghara ahụ bụ Oleg Sinegubov ji akara Telegram ya kwuo na ihe ruru mmadụ 59 merụrụ ahụ n’ogbunigwe ahụ, mmadụ ịrị na abụọ nọ na-ajọ ọnọdụ ebe a ga-ebe ndị ụfọdụ n’ime ha ụkwụ ma ọ bụ aka.

    Zelensky na-ekwu na Rọshịa na-atụ “ndị nkịtị” ogbunigwe bụ ihe ga-akwụsị ma ọbụrụ na “Yukren nwereike ịgbari ọdụ ụgbọelu agha ndị Rọsịa niile”.

    “Ihe a bụ ihe anyị chọrọ. A hụbeghị m ihe mere a ga-eji beneta ike ndịagha na nchekwa mba anyị”.

    Mana ndị na-akwado mba Yukren tinyere iwu ka Ukren ghara iji ngwa agha ha wakpoo ime Rọshịa maka na ha na-atụ ụjọ na o nwereike ime ka ọgụ ahụ gbasaa ebe niile.

  4. Ọnwụwa anyanwụ kacha kwụọ ụgwọ iji gbapụta ndị a tọọrọ n’ime otu afọ - Nyocha

    Ndị awuchiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ SBM Intelligence ekwuola na ndị ji egbe tọọrọ mmadụ 7,568 site n’ọnwa Julaị 2023 ruo ọnwa Juun 2024.

    Nke a pụtara ihe dịka ụlọọrụ ahụ wepụtara akwụkwọ ozi nnyocha ha mere n’ime oge ahụ.

    Nnyocha ahụ SBM mere kwuru na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa kachasi kwụọ ụgwọ nye ndị ntọ iji gbapụta ndị ezinaụlọ ha a tọọrọ..

    Ha gara n’ihu kọwaa na ndị ntọ nara ego dị ijeri naịra iri na otu (N11bn) mana ọ bụ naanị otu ijeri naịra ụma (N1.048bn) ka a kwụrụ.

    Nnyocha ahụ chọpụtara na ọ bụ n’Abuja ka ndị ji egbe kacha naa ego iji gbapụta ndị ahụ tọọrọ ebe Legọs na Kaduna na-esochi ya.

    Ọ gara n’ihu gosi na ndị ntọọ na-eji usoro dị iche iche anara ụgwọ n’aka ezinaụlọ ndị ha tọọrọ.

    Lee mmadụ ole a tọọrọ na steeti ha:

    Zamfara – 1639

    Kaduna – 1113

    Katsina -886

    Borno - 720

    Niger – 689

    Sokoto - 487

    Abuja – 404

    Benue -186

    Kogi – 170

    Taraba – 167

    Bauchi – 114

    Nasarawa – 113

    Ogun – 88

    Enugu – 84

    Kwara – 80

    Edo – 69

    Ondo – 67

    Rivers – 66

    Delta – 48

    Anambra – 46

    Abia – 40

    Imo -30

    Ebonyi – 29

    Kebbi -26

    Plateau -26

    Oyo – 26

    Osun -23

    Ekiti -17

    Akwa-Ibom – 12

    Legọs – 11

    Adamawa – 11

    Yobe – Bayelsa

    Gombe – 2

    Jigawa – 2

    Kano – 2

  5. Onyeisiala Bola Tinubu agawala China maka nzukọ China-Africa Cooperation

    Onyeisiala Bola Tinubu na-aba ụgbọelu

    Ebe foto si, Bola Tinubu

    Onyeisiala Bola Tinubu hapụrụ Naịjirịa ụbọchị Tọzde 29 Ọgọst, 2024 gawa mba China maka nzukọ China-Africa Cooperation.

    Ozi ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Ajuri Ngelale wepụtarar mere ka a mata na onyeisiala Tinubu ga-akwụsịtụ na mba UAE na njem ahụ.

    Ngelale kwuru na onyeisiala Tinubu na onyeisiala China bụ Xi Jinping na ndị isi isi azụmahịa ga-enwe mkparịtaụka na nzukọ ahụ.

    Ndị so onyeisiala Tinubu na njem ahụ gunyere ndị welitere isi na gọọmenti ya.

  6. Ndị uweojii anwụchiela nwoke ji mma bekasịa nwa agbataobi ya

    Nwoke ahu Chukwuemeka Nweke

    Ebe foto si, Enugu Police command

    Kọmishọna Uweojii Enugwu bụ CP Kanayo Uzuegbu, eweputala ozi kọwaa etu ha si nwụchie otu nwoke .

    Ha sị na Chukwuemeka Nweke gbara afọ 30 so were mma gbuo otu nwa nwaanyị bụ Zinachi Ugwu gbara afo anọ.

    Arụ ahụ mere na Orba Nsukka ụbọchị 18 nke ọnwa Ọgọst afọa.

    Nchọpụta ndị uweojii gosiri na Chukwuemeka nweke miiri mma malite chụgharịwa ndị yardị ahụ ọsọ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ chefuo nwa na-arahụ ụra.

    Nwoke ahụ weziri mma bepụ ya isi.

    Ka aka kpaara ya, ọ siri na ọ bụ mkpụrụ mmiri, Indian hemp na mmanya ọkụ ya ṅụrụ na-akwagharị ya.

    A chọpụtara na aka ya dị na ndị otu nzuzo Vikings gburu otu nwoke onye Otu nzuzo ọzọ ya na ha nwere nsogbu na Jos Plateau steeti m’afo 2022.

    Kọmoshona Uzuegbu kwuru na ya bụ onye ogbu mmadụ ka apụ ulọ ikpe oge adighị anya.

  7. Joe Ajero alaghachila isi ụlọọrụ ha dịka ọ zachara oku ndị uweojii

    Ajero Joeseph

    Onyeisi otu jikoro ndị ọrụ Naịjirịa (NLC) bụ Joe Ajaero alọghachịtara n’isi ụlọọrụ ndị otu ya dị n’Abụja ka ọ gachara zaa oku ndị uweoji kpọrọ ya taa bụ Thọzde, abịlị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọst, 2024.

    Ndị uweoji degara Joe Ajaero akwụkwọ sị ya bịa zara ọnụ ya n’ịzụ ụka garaaga maka ebubo dị icheiche e boro ya.

    Mana n’akwụkwọ Samuel Ogala binyere aka, ndị ọka iwu na-ekpere ọnụ Ajaero zaghachịrị ndị uweoji sị na ọ bụ taata bụ Wenezde ka Ajaero ga-abịa n’ụlọ ndị uweoji.

    NLC gwara ndị otu ha ka ha niile gbakọọ n’isi ụlọọrụ ndị uweoji niile dị na Naịjirịa bụ ebe ha ga-anọ donyere Ajaero ukwu ruo n’oge ọ ga-apụta n’ụlọọrụ ndị uweojji.

    Ajaero gwara ndị uweoji ka ha gwa ya ihe niile gbasara ebubo ha na-enyocha n’isi ya.

    NLC adọọla aka na ntị na ha ga-agba abụbọ ọrụ na-enwe ihe mere Joe Ajaero n’aka ndị uweoji.

  8. Ndị mmadụ agbarụọla ihu maka abụbụọrụ ndị Dọkịta na-eme n'Ebonyi

    Ulọọgwụ dị n'Ebonyi

    Ndị ọrịa egosila iwe ha n'Ebonyi steeti n'ihi abụbụọrụ ndị dọkịta

    Ụfọdụ ndị ọrịa n’ụlọogwụ Alex Ekwueme Federal Teaching Hospital Abakaliki dị n’Ebonyi steeti egosila ike ọgwụgwụ

    Nke a bụ n’ihi abụbụọrụ ịdọ aka na ntị otu jikọtara ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ bụ Nigerian Association of Resident Doctors (NARD) malitere gburugburu Naịjirịa kemgbe mkpụrụ ụbọchị abụọ gara aga.

    Ya bụ abụbụọrụ ndị ọrụ ahụike gbara bụ iji mee ka gọọmenti mata gbasara onye otu ha a tọọrọ kemgbe ihe karịrị ọnwa asatọ.

    Ụfọdụ ndị ọrịa na ndị nlekọta ha gosiri iwe na ọnụma banyere etu ya bụ abụbụọrụ si akụnye ụkwụ n'usoro ọrụ ụlọọgwụ ahụ.

    Victor Kalu na Ukaria Aruogu bụ ụfọdụ ndị ọrịa ka na-akwụgharị n'ụlọọgwụ ahụ.

    Ha na-arịọ Gọọmenti Naịjirịa na ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ ka ha weta abụbụọrụ ahụ n'isi njedebe n'ihi na o meela ka ndị ọrịa ghara inwe ezi nlekọta.

    Onye ntaakụkọ anyị enwetaghị onyeisioche otu jikọtara ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital bụ Sunday Nnaji maka mkparịtaụka mana

    Dr. Prisca Iheriohamma kwuru na ha ji obi ha niile erube isi na ntụziaka ahụ ndị isi ha nyere, dịka ọ kpọrọ oku ka gọọmenti hụ na a napụtara onye otu ha e ji eji na-enweghị mmerụahụ ọbụla.

    Cheta na otu jikọtara ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ kwupụtara abụbụọrụ ịdọ aka na ntị mkpụrụ ụbọchị asaa nke malitere n'ụbọchị Mọnde 26 Ọgọst 2024 iji kpọọ oku ka a tọhapụ onye otu ha bu Dr. Ganiyat Poopola ndị ntọrị tọọrọ kemgbe ọnwa asatọ gara aga.

  9. Okporoụzọ anyị bụzi ndagwurugwu – Ndị Bende na Ohafia

    Okporoụzọ siri Umuahia gawa Bende na Ohafia

    Ndị ndu obodo, ndị njem na ndị ji okporoụzọ eme ihe akpọọla oku ka Onyeisiala Bola Tinubu na ndị omeiwu etiti gbata ọsọ enyemaka ma rụchapụ okporoụzọ siri Ụmụahịa gawa Bende na Ọhafịa na-egbughị oge.

    Ha kpọkwara oku ka e mee ngwa ngwa rụchapụ akwammiri Nmori Bridge.

    Ha sịrị na akwammiri Nmori Bridge ụlọọrụ na-elekọta okporoụzọ etiti bụ Federal Roads Maintenance Agency (FERMA) na-arụ bụ nke oke idemmiri na-eyi nnukwu egwu ebe ndakpọ ya ga-ekewapụ obodo ahụ niile.

    Ndị obodo ahụ kwuru sị n’agbanyeghị ọrụngo ijeri Naịra ise na ụma iri anọ na itolu (5.49bn) e nyepụrụ n’afọ 2018, okporoụzọ ahụ agaala n’ihu nọrọ n’ọnọdụ ọjọọ ebe akwammiri Nmori Bridge bụ nke na-achọ ịdakpọ.

    Okporoụzọ siri Umuahia gawa Bende na Ohafia

    Oge ọ na-agwa onye ntaakụkọ anyị okwu, otu nwaafọ Bende dị n’Okpuru ọchịchị Bende bụ Ben Uche, onye ji okporoụzọ ahụ eme ihe kwa ụbọchị gosiri mmetụta gbasara ọnọdụ okporoụzọ ahụ.

    Ọ sịrị na okporoụzọ ahụ abụrụla nke ọnọdụ ya na-agba anya mmiri kemgbe ọtụtụ afọ gara aga ebe enweghị ihe doro anya a na-eme iji dozie ya maọbụ rụchapụ akwammiri ahụ dị oke mkpa.

    Maazị Ben kpọkuru Gọọmenti Etiti ka ha gbapụ ọsọ n’atụmatụ ọrụ okporoụzọ ahụ tupu ọnọdụ ya adị njọ karịa ka ọ dị ugbua.

    Okporoụzọ siri Umuahia gawa Bende na Ohafia

    N’okwu nke ya, Chisom Irene Chukwueke, nwaafọ Ebem Ọhafịa gosiri enweghị afọ ojuju gbasara etu ọrụ okporoụzọ ahụ si aga kemgbe afọ isii gara aga.

    O kwuru sị n’agbanyeghị akatamkpo ego a mawapụtara maka atụmatụ ọrụ okporoụzọ ahụ, enweghị ihe ọbụla bara uru ha na-ahụ.

    Odoziakụ Irene Chukwueke kwuru na ọ bụrụ ma a rụzie okporoụzọ ahụ siri Ụmụahịa gawa Ọhafịa, ndị mmadụ ga-enwe mmasị iji ya eme ihe karịa nke siri Ụmụahịa gawa Bende n’agbanyeghị na ọ dị nso karịa.

    Okporoụzọ siri Umuahia gawa Bende na Ohafia

    Cheta na ndị ọchịchị Naịjirịa nyere nkwado ka a gbakwunye ijeri Naịra iri na abụọ (12bn) maka atụmatụ ọrụ ahụ dịka ọ bụ naanị narị nde Naịra atọ (300m) ka a mawapụtara na bọjet afọ 2021.

    Ndị obodo ahụ na-akpọ oku ka e nye ezi ngụkọ gbasara etu e si mefuo ego a mawapụtara maka ya bụ atụmatụ ọrụ dịka ha na-ebo ụlọorụ jibu ọrụngo ahụ ebubo nrụrụaka na ejighị ọrụ ha kpọrọ ihe.

    Okporoụzọ siri Umuahia gawa Bende na Ohafia
  10. Ndịagha Israel emeela mwakpo kachasị na West Bank

    Ndịagha Israel emeela mwakpo kachasị na West Bank

    Ebe foto si, EPA

    Ndịagha Izrel egbuola opekatampe mmadụ iri na otu (11) na mgbago ugwu West Bank ha jichiri kemgbe.

    Ndị ọrụ ahụike Palestaịn kwuru na mgbọ e si n’elu gbapụ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na al-Far’a gburu mmadụ ise ebe e ji droonu gbuo mmadụ isii ndị ọzọ na Jenin.

    Ndịagha Izrel kwuru na ha “na-ebu agha megide iyi ndụ egwu iji kpochapụ ihe ize ndụ” na Jenin nakwa Tulkarm.

    Nke a bịara dị ka ọ bụ mwakpo kachasị njọ Izrel na-eme dịka ha wakporo opekatampe obodo anọ dị na Palestaịn n’otu mgbe, ndị gụnyere; Jenin, Tulkarm, Nablus na Tubas.

    Ozi e nwetara na Palestaịn kwuru na emechiela okporoụzọ ndị e si na ha abanye Jenin dịka e nwere ọgbaaghara ndịagha n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị n’obodo ahụ.

    E kwuru na ndịagha Izrel banyere n’otu ụlọọgwụ dị na Jenin ma mechiekwa abụọ ndị ọzọ dị na Tulkarm.

    Agha Izrel buru na Nablus bụ nke lekwasara anya n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ abụọ dị n’obodo ahụ.

    N’ogige Far’a dị n’akụkụ Tubas, ndị ọrụ ahụike sịrị na ọ na-esiri ụgbọala gbatagbata ike ịgaru ebe ndị merụrụ ahụ nọ dịka Izrel jichara droonu wakpoo ha.

  11. E bubatala ọgwụ mgbochi mpox na Naịjirịa

    Ọgwụ mgbochi ọrịa mpox
    Nkọwa foto, Ọgwụ mgbochi ọrịa mpox

    Ọgwụ mgbochi mpox puku iri (10,000) abatala Naịjirịa taa dịka nke ahụ bụ ọgwụ mgbochi mpox mbụ na-abata na mba Afrịka.

    Nke ahụ bụ onyinye sitere n’aka mba Amerịka nke ụlọọrụ Danish Pharma, Bavarian Nordic mepụtara.

    A nabatara ọgwụ mgbochi ahụ iji buo agha megide ụdị mpox na-adịghị akpa ike ọjọọ a kpọrọ Clade II bụ nke malitere ifesa na Naịjirịa kemgbe 2017.

    N’ime afọ 2024, Naịjirịa kwupụtara mmadụ narị asaa (700) dịka ndị a na-enyo enyo mabutere ọrịa mpox dịka iri anọ (40) n’ime ha bụ ndị nwere ya mana e nwebeghị onye nwụrụ site n’ọrịa ahụ na Naịjirịa.

  12. Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Adeola Ajayi a họpụtara dịka onyeisi ụlọọrụ DSS ọhụrụ

    Adeola Ajayi

    Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook

    A họpụtala Adeola Ajayi dịka onyeisi ụlọọrụ DSS ọhụrụ

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ahọpụtala Adeola Oluwatosin Ajayi dịka onyeisi ụlọorụ nchekwa Department of State Services (DSS) ọhụrụ.

    Onye ndụmọdụ pụrụiche onyeisiala na-ahụ maka mgbasaozi bụ Ajuri Ngelale kwupụtara nke a n’ozi o tinyere aka na ya n’ụbọchị Mọnde 26 Ọgọst 2024.

    A họpụtara Adeola Oluwatosin Ajayi dịka onyeisiụlọọrụDSS ọhụrụ n’ihi na onye bụbu onyeisi ụlọorụ ahụ bụ Yusuf Magaji Bichi gbara arụkwaghịm.

    Onye bụ Adeola Ajayi?

    • Onyeisi ụlọọrụ DSS ọhụrụ bụ Adeola Oluwatosin Ajayi gbagotere n’ọkwa dị iche iche iji rute n’ogogo osote onyeisi ụlọorụ ahụ tupu ahọpụta ya dịka onyeisi.
    • Dịka DSS siri kwuo, Ajayi bụ onye ọrụ gbasiri ike ma marakwa ihe ọ na-eme.
    • Ọ malitere ọrụ na DSS n’afọ 1990
    • Ọ natala ọtụtụ ọzụzụ na Naịjirịa nakwa na mba ofesi maka ngalaba nlekọta dị iche iche, ịbụ onyendu na ngalaba nchekwa, ọzụzụ pụrụiche na ọtụtụ ndị ọzọ.
    • Ajayi anọrọla n’isi ụlọorụ DSS na steeti dị iche iche ndị gụnyere Rivas, Bauchi, Enugwu, Bayelsa na Kogi.
  13. Ihe karịrị mmadụ anọ anwụọla dịka Russia mere Ukraine mwakpo ọzọ

    Ihe karịrị mmadụ anọ anwụọla dịka Russia mere Ukrain mwakpo ọzọ

    Ebe foto si, Reuters

    Opekatampe mmadụ anọ anwụọla oge Rọshịa ji abalị wakpoo Yukren nke ugboro abụọ dịka ọ gasịrị otu mkpụrụ ụbọchị ha mechara mba ahụ mwakpo kachasị njọ kemgbe agha dara n’etiti ha siri malite.

    Rọshịa kwuru na ha ji ngwaagha ndị na-agate aka n’ikuku nakwa na mmiri wakpoo ụlọọrụ ikikere ọkụ na akụrụngwa ndị ọzọ yiwere ya gburugburu Yukren tinyekwara mpaghara Kyiv, Lviv, Kharkiv na Odesa.

    Ndịagha elu Yukren na-adọ aka na ntị na mba ahụ nọ n’ihe izendụ n’ihi mwakpo e ji ngwaagha ọgwụrụmba mee.

    Ogbuniigwe tụtara ụlọ mmadụ nkịtị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Kryvyi Rih n’abalị Mọnde ma gbuo mmadụ abụọ dịka ọtụtụ ndị ọzọ na-efu efu.

    Onyeisi ọchịchị mpaghara Zaporizhia bụ Ivan Fedorov kwuru na e gburu otu nwoke ebe otu nwoke na otu nwaanyị nwetara mmerụahụ n’obodo ahụ.

    Akụkọ kwuru na a nụkwara ụda ogbuniigwe na mpaghara Kyiv, Sumy, Khmelnytsky na Mylkolayiv.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka Rọshịa sitere n’elu mee Yukren mwakpo kachasị njọ kemgbe agha dara n’etiti ha, gbuo mmadụ asaa ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

    Ka osiladị, ndịagha elu Yukren kwuru ha gbaturu ogbuniigwe ise na droonụ iri isii (60) oge Rọshịa mere ha mwakpo n’abalị.

  14. Onyeisiala Bola Tinubu ahọputala ndị isi ọhụrụ ụlọọrụ DSS na NIA

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

    Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala Ambassador Mohammed Mohammed dịka onyeisi ụlọọrụ National Intelligence Agency (NIA) na Adeola Oluwatosin Ajayi dịka onyeisi ụlọọrụ Department of State Services (DSS).

    Ozi onu na-ekwuru onyeisiala bụ Ajuri Ngelale weputara, kwuru na onyeisiala Tinubu họpụtara ha ka ndị bụbu ndị isi ụlọọrụ NIA na DSS gbaraa arụkwaghịm.

    Ambassador Mohammed Mohammed gụrụ akwụkwọ na mahadum Bayero University dị na Kano steeti, arụọla ọrụ na mba North Korea, Pakistan na Sudan.

    Adeola Oluwatosin Ajayi n’aka nke ọzọ rụburu ọrụ dịka onyeisi n’ụlọrụ DSS na Bauchi steeti, Enugu, Bayelsa, Rivers na Kogi.

    Onyeisiala Bola Tinubu gwara ndị isi ọhụrụ ahụ ka ha na ndị ọrụ nchekwa ndịọzọ dị na Naịjirịa jikọọ aka rụọ ọrụ iji nweta ezi nchekwa obodo.

  15. Ndị otu NARD amalitela abụbọ ọrụ maka onye otu ha a tọọrọ

    Njirimara NARD na dọkịta

    Ebe foto si, NARD TWITTER/GETTY IMAGES

    Otu National Association of Resident Doctors (NARD) ebidola abụbọ ọrụ ga-adị abalị asaa na Naịjirịa niile gbaa gburugburu.

    Ha kwuru na abụbọ ọrụ ahụ bụ iji kpọọ oku ka a tọghapụ onye otu ha bụ Dọkịta Ganiyat Popoola nọ n’aka ndị ntọọ ihe ruru ọnwa asatọ.

    Onyeisi NARD bụ Dọkịta Dele Abdullahi kwuru na abụbọ ọrụ ahụ ga-amalite ụbọchị Mọnde 26 Ọgọst,2024.

    Abdullahi kwuru na ha kpebiri ịgba abụbọ ọrụ ka ha mechara ọgbakọ ndị isi otu NARD ỤBỌCHỊ Satọde 25 Ọgọst, 2024.

    O kwuru na abụbọ ọrụ ahụ ga-emetụta ngalaba ọrụ ahụike niile tinyere ndị ọrụ gbatagbata.

    Ndị ahụ ji egbe tọọrọ Dọkịta Ganiyat Popoola nke ngalaba na-ahụ maka anya na ụlọọrụ National Eye Centre dị na Kaduna steeti, di ya na nwa nwanne ya ihe karịrị ọnwa asatọ.

    A tọghapụrụ di ya n’ọnwa Maachị, ebe ya na nwa nwanne ya ka nọ n’aka ndị tọọrọ ha.

    Cheta na ndị otu NARD mere ngagharịiwe n’ụlọọgwụ mahadum niile dị na Naịjirịa maka Dọkịta Popoola.

  16. Ọ bụ malite n’afọ 18 ka ụmụakwụkwọ ga-ede ule NECO na WAEC – Mịnịsta agụmaakwụkwọ

    Tahir Mamman

    Ebe foto si, @ProfTahirMamman

    Mịnịsta na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa bụ Tahir Mamman ekwuola na obere ụmụaka agaghịkwa enwe ohere isoro dee ule e ji apụta ụlọakwụkwọ sekọndrị.

    Mamman kwuru na afọ ole gọọmenti kwupụtara nwataakwụkwọ ọbụla ga-anọ dee ule ndị ahụ bụ iri na asatọ (18).

    Mịnịsta kwupụtara nke a n’ihe omume ụlọmgbasaozi Channels Television haziri n’ụbọchị Sọnde 25 Ọgọst 2024.

    O kwuru na Gọọmenti Etiti enyela ntụziaka ka ụlọọrụ na-ahazi ule West African Senior School Certificate Examination (WASSCE) bụ West African Examinations Council (WAEC) na ụlọọrụ nke na-ahazi ule Senior School Certificate Examination (SSCE) bụ National Examinations Council (NECO) rube isi na ntụziaka ọhụrụ ahụ.

    O kwukwara na afọ ole nwataakwụkwọ ọbụla ga-anọ dee ule e ji abanye ụlọakwụkwọ dị elu nke ụlọọrụ Joint Admissions and Matriculations Board (JAMB) na-ahazi bụkwa iri na asatọ (18).

    Dịka o siri kwuo, a tụwara anya na nwata ọbụla ga-agụcha ọtaakara mgbe ha gbara afọ ise; malite agụmaakwụkwọ praịmarị mgbe ha gbara afọ isii ma gụchaa mgbe ha gbara afọ iri na abụọ (12); malite agụmaakwụkwọ sekọndrị oge ha gbara afọ iri na abụọ (12) ma gụchaa mgbe ha gbara afọ iri na asatọ (18) tupu ha abanye ụlọakwụkwọ ndị dị elu.

  17. Ngalaba WHO n’Afrịka ebidola ọgbakọ iji buo agha megide ọrịa mpox

    Ogwụ mgbochi ọrị mpox

    Ebe foto si, Reuters

    Ngalaba ụlọọrụ World Health Organization (WHO) n’Afrịka ebidola nzukọ ga-enwe abalị ise na mba Congo iji chọpụta usoro ka mma a ga-eji chụọ ọrịa mpox ọsọ ụkwụ eru ala n’Afrịka.

    Ka ọ dị ugbua, enwela mmadụ 19,000 buteregoro ọrịa mpox n’Afrịka gba gburugburu.

    Ndị na-esonye n’ọgbakọ ahụ gunyere onyeisi WHO bụ Tedros Ghebreyesus, onyeisi WHO n’Afrịka bụ Matshidiso Moeti nakwa mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba 47 dị n’Afrịka.

    Ihe ga-abụ isiokwu n’ọgbakọ ahụ bụ mkparịtaụka gbasara ụzọ ka mma iji buo agha megide ọrịa gbatagbata mpox na inye mba Afrịka ego nkwado.

    Ọgbakọ a na-abịa dịka ụlọọrụ WHO na ụlọọrụ African Center for Communicable Diseases (CDC) kpọrọ oku ka enwe nkwado n’Afrịka n’ihe gbasara ọrịa dịka mpox.

    Cheta na onyeisi WHO bụ Tedros Ghebreyesus kwuru na a chọrọ ihe ruru otu narị nde dọla iri atọ na ise ($135m) iji buo agha megide ọrịa mpox.

    Mba Afrịka na-agba mbọ ị hụ na a kwụsịrị nfesa ọrịa mpox ebe mba Congo ebe ọrịa ahụ kacha metụta na-akwado mmalite inye ọgwụ mgbochi n’izu a.

  18. Okonjo Iweala agwala ndị na-azọ ọchịchị ka ha kwụsị ịkwado enweghị nchekwa

    Ngozi Okonjo-Iweala

    Ebe foto si, @NOIweala

    Nnukwu onyeisi otu azụmaahịa mbaụwa World Trade Organization (WTO) bụ Ngozi Okonjo-Iweala agwala ndị na-egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ka ha kwụsị ịdị na-akwado enweghị nchekwa megide ndị ha na-agba ụkwụ.

    Okonjo-Iweala kwuru nke a n’ụlọ oriri Eko Hotels dị na Legọs steeti oge a na-agbape ọgbakọ otu jikọtara ndị ọkaiwu Naịjirịa bụ Nigeria Bar Association (NBA).

    Onye ahụ bụbu mịnịsta na-ahụ maka ego kwuru na Naịjirịa agaghị ahụta mmepe ma ewezuga nchekwa dịkwa ka a na-agaghị enwe nchekwa ma ọ bụrụ na mmepe adịghị.

    Ọ sịrị na “anyị maara nke ọma na ndị na-azọ ọkwa ọchịchị na-akwado ọnọdụ enweghị nchekwa n’obodo anyị n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị”.

    “Anyị nwere ndị na-egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwenyere na ụzọ kachasị mma ha ga-esi mee ka ọchịchị onye ha na-agba ụkwụ dị njọ n’anya ndị mmadụ bụ ịkpalite ọnọdụ enweghị nchekwa iji mee ka ọ dị ka onye nọ n’ọchịchị amaghị ihe ọ na-eme,” ka Okonjo Iweala kwuru.

    Ọ gara n’ihu kwuo na oge eruola mgbe ọnọdụ ahụ ga-akwụsị n’ihi na o meela ka a tụfuo ọtụtụ ndụ mmadụ na akụnaụba.

  19. Ike agwụla ụmụafọ Naịjirịa – Ndị Bishọpụ Katọlik na-agwa Tinubu

    Bishop Ugorji na Tinubu

    Ebe foto si, Other

    Onyeisioche otu jikọtara ndị Bishọpụ Katọlik na Naịjirịa bụ Most Rev. Lucius Ugorji agwala onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ka o lebagharịa anya n’atụmatụ akụnaụba ndị o wepụtara n’ihi na ike agwụla ndị Naịjirịa.

    Ugorji kwuru nke a oge ọ na-ekwu okwu nnabata n’ọgbakọ ndị Bishọpụ Katọlik nwere n’Aụchi dị n’Edo steeti n’ụbọchị Sọnde 25 Ọgọst 2024.

    Ọ sịrị na atụmatụ akụnaụba ndị onyeisiala tinyere n’ọrụ ebutela nnukwu ihe isiike na nhujuanya n’ebe ndị Naịjirịa nọ.

    Archbishọpụ Ugorji sịrị na ọ bụrụ na atụmatụ ndị onyeisiala wepụtara anaghị amịta mkpụrụ na ọ ga-adị mkpa ka a laghachi n’usoro ọchịchị mpaghara iji buo agha megide nrụrụaka ma hụkwa na Naịjirịa chewere ihu n’ụzọ kachasị mma.

  20. Ndị ọrụ NMA akwụsịla abụbọ ọrụ ha gabara n’Anambra Steeti

    Njirimara otu Nigerian Medical Association

    Ebe foto si, Nigerian Medical Association

    Otu jikọrọ ndị dọkita ahụike bụ Nigerian Medical Association (NMA) ngalaba Anambra steeti akwụsịla abụbọ ọrụ ha gbara maka onye otu bụ Dọkita Stephen Ezeh a tọọrọ.

    NMA kwuru nke a n’ozi ha wepụtara ụbọchị Sọnde Ọgọst 25, 2024 ma gwa ndị otu niile na steeti ahụ ka ha laghachi ọrụ.

    Ozi ahụ kwuru na Dọkịta Eze nwere onwe n’aka ndị ahụ tọọrọ ya ụbọchị Satọde, Ọgọst 24.

    Otu NMA gara n’ihu kpọ oku ka gọọmenti Gọvanọ Chukwuma Soludo tinye anya n’ezi nchekwa ndụ na steeti ahụ.

    Ha kelere ndị Anambra maka nkwado ha nyere otu ahụ ma rịọ ka onye ọbụla nye gọọmenti nkwado iji hụ na-enwere nchekwa obodo n’Anambra Steeti.