Egbuola nnukwu onyendu Hamas, Ismail Haniyeh n’Iran

Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụwa n'ọnwa Julaị 2024

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu

  1. Atiku Abubakar adọọla Gọọmenti aka na ntị maka oke agụụụ na mpaghara ugwu

    Onyebubu osetere onyeisiala Naịjirịa, Atiku Abubakar

    Ebe foto si, Atiku Abubakar / X

    Nkọwa foto, Onyebubu osetere onyeisiala Naịjirịa, Atiku Abubakar

    Onye bubu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubabar adọọla Gọọmenti etiti na steeti aka na ntị maka oke agụụ na ihe ụkọ dị na Naịjirịa, ọkachasị na mgbago ugwu.

    Atiku mere ka amata nke a n’akara X ya ma kwa arịrị maka akụkọ BBC mere gbasara ọnọdụ ụmụaka bụ ndị agụụ ji aka na Katsina steeti.

    N’okwu Atiku “ndeko ndị World Food Programme (WFP) kwuru na ụmụaka ruru nde anọ na puku nari anọ (4.4million) nọ n’oke agụụ”.

    “Gọọmenti etiti na nke steeti kwesiri ịgba mbọ, mee ngwangwa kwụsị oke agụụ ugbua”.

    Atiku kọwara na ikesa ihe a ga akọ n’ụbị abụghị naanị ihe ga-akwụsị agụụ ngwangwa ma kọwaa na “Gọọmentị kwesiri ịkwụsị ihe niile na-akpata oke agụụ ma mee ka ọnụ ahịa nri belata maọbụ datuo.

    “Ha kwesiri ime ga ezigbo nchekwa dị, nweta usoro ga-akwụsị ọnụ ahịa ịrị elu ma mee ka ego Naịra ghara ịdamba ebe dollar dị na ihe ndị ọzọ”.

    Atiku gara n’ihu dụọ gọọmentị Kastina ndụmọdụ ka ha bido itinye uche na ịkọpụta nrị, ịkwado ndị ọrụ ugbo nakwa ime ka ezi nchekwa dị n’ime obodo bụ nke ga-akwụsị ime ka ọtụtụ mmadụ sị n’obodo ha na-agbapụ maka ọgbaaghara”.

  2. Egbuola nnukwu onyendu Hamas, Ismail Haniyeh n’Iran

    Ismail Haniyeh

    Ebe foto si, Reuters

    Egbuola nnukwu onyendu Hamas bụ Ismail Haniyeh na mwakpo Izrel mere n’isi obodo Ịran.

    Dịka ụlọmgbasaozi Ịran siri kwuo, Haniyeh nọ n’ụlọ ndị ochie dike dị na Tehran oge e mere mwakpo ahụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere abụọ.

    Ụfọdụ akụkọ na-ekwu na e si n’elu gbagbuo nwoke ahụ gbara afọ iri isii na abụọ (62) a hụtara dịka nnukwu onyendu Hamas.

    Izrel ekwubeghị okwu ọbụla gbasara ya mana ha kwere nkwa ibibi Hamas n’ihi mwakpo ha mere na ndịda Izrel n’abalị 7 nke ọnwa Oktoba 2023 ma gbuo mmadụ otu puku na narị abụọ (1,200).

    E gburu Haniyeh n’ime awa ole na ole Izrel kwuru na ya egbuola nnukwu ọchịagha Hezbolla nke Ịran na-akwado.

    Izrel kwuru na ya gburu Faud Shukr site na mgbọ o si n’elu gbapụ iji megwara maka ogbuniigwe a gbara na ngwụcha izu na Golan Heights nke Izrel jichiri.

    Hezbolla ekwupụtabeghị ma e gburu nnukwu ọchịagha ya na mwakpo Izrel mere na Beirut n’ụbọchị Tuzde mana ha kwuru na Shukr nọ n’ụlọ ahụ a gbara mgbọ.

  3. Southport, UK: Ụmụaka atọ n’ime mmadụ 11 a mara mma anwụọla

    Ụmụaka atọ ahụ nwụrụ

    Ebe foto si, Handout/PA MEDIA

    Nkọwa foto, Ụmụaka atọ ahụ nwụrụ

    Kemgbe abalị 29, Julaị 2024, mpaghara Southport dị na mba UK nọ n’ọgbaaghara n’ihi ihe mgbanwaobi mere ụmụaka iri na abụọ otu nwoke ji mma makasịa ahụ.

    N’ime mmadụ ịrị na abụọ ahụ, mmadụ atọ anwụọla ebe ndị ọzọ nọ na nnukwu ihe ụfụ.

    Mkpamkpa ahụ mere dịka ụmụaka ọnụọgụgụ ha dị ịrị abụọ na ise bụ ndị ezinaụlọ ha dugara ebe ha na amụ ihe ọmụmụ, nwee ohere gba egwu nakwa inwe ọbị aṅụrị.

    Mmeme ahụ bụ nke naanị ụmụaka dị afọ 6 ruo afọ 11. Ebum n’obi ezinaụlọ ụmụaka ahụ bụ ka ha mee ha obi ụtọ mana onye ahụ ji mma wakporo ha ma meruo ụmụaka ahụ ahụ.

    Ndị uweoji na Merseyside kwuru na ha nwetara ozi banyere ihe mere ma ziga ndị ọrụ ha bụ ndị wuchiri nwoke ahụ ji mma mana ha ekwughị ihe ọbụla ọzọ gbasara ya.

    Ndị uweojii kwuru na ha egbochiela mmadụ ị ga ebe ihe ahụ mere ruo oge ha mechara nyocha.

    Ozi ndị uweojii Merseyside weputara kwuru na aha ụmụaka atọ e gburu bụ Elsie Dot Stancombe gbaraa afọ 7, Alice Dasilva Aguiar dị afọ 9 na Bebe King gbaraa afọ 6.

    Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer gara leta ezinaụlọ ahụ ụmụaka ha nwụrụ ma tie ha aka n’obi.

    Keir Starmer gara n'ihu kelee ndị uweojii na ndị ọrụ gbatagbata bịara oge ihe ahụ mere ma nyere ndị o metutara aka tupu e buga ha ụlọọgwụ.

  4. Ndị na-ahazi ngagharịiwe ajụla ntụziaka ndị uweojii ka ha nọrọ otu ebe mee ngagharịiwe

    Ndị na-eme ngagharịiwe na onyeisi ndị uweojii Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images/Nigeria Police/X

    NdỊ na-ahazi ngagharịiwe ụmụntorobịa na-akwado ajụla iwu ndị uweojii nyere ka ha nọrọ otu ebe mee ngagharịiwe ahụ ma ghara ịgagharị n'okporoụzọ.

    N’ọgbakọ ha na onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun nwere, Egbetokun nyere iwu ka a nọrọ otu ebe mee ngagharịiwe ahụ.

    Na nzaghachi ya, otu onye ọkaiwu otu na-ahazi ngagharịiwe ahụ a kpọrọ ‘Take It Back Movement’ bụ Ebun-Olu Adegboruwa (SAN) gwara onyeisi ndị uweojii na ha ekwetaghị n’iwu ahụ.

    Ndịọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ gunyere ọkaiwu Femi Falana (SAN), ndị ọkaiwu ọzọ, ndị nnọchiteanya otu Nigeria Bar Association (NBA) na ndịọzọ so akado ngagharịiwe ahụ.

    Ngagharịiwe maka ihe isiike, agụụ na ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ka a na-atụanya na ọ ga-amalite ụbọchị Tozde abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst afọ 2024.

  5. Zerenụ ogige ụlọ mkpọrọ n’oge ngagharịwe - Ụlọọrụ NCS na-agwa ndị chọrọ ime ngagharịiwe

    Ogige ụlọ mkpọrọ Kuje dị n'Abuja

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ogige ụlọ mkpọrọ Kuje dị n'Abuja

    Gọọmenti etiti Naịjirịa agwala ndị ọbụla na-eme ngagharịiwe ka ha zere ụlọ mkpọrọ 256 niile dị na Naịjirịa.

    Onyeisi ụlọọrụ Nigeria Correctional Service bụ Hailey Nababa dọrọ aka na nti kwuo na ogige ụlọ mkpọrọ niile dị na Naịjirịa abụghị ebe ha chọrọ ị hụ ndị ngagharịiwe ọbụla.

    Hailey Nababa gara n’ihu kwupụta na iwu ahụ bụ iji chekwa ma gbochie ihe mwakpo ọbụla nke newereike ibute ọgbaghara n'obodo.

    Ọ gwara ndị ahụ na-eme ngagharịiwe ka ha ghara inupu isi n’iwu ahụ ma kwuo na a ga-ebulite ọnụọgụgụ ndị nchekwa n’ogige ụlọ mkpọrọ niile e nwere n’Naịjirịa n’oge ngagharịiwe ahụ.

  6. MTN agbachiela ụlọọrụ ha niile na Naịjirịa

    MTN agbachiela ụlọọrụ ha niile na Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    MTN agbachiela ụlọọrụ ha niile dị n’Naịjirịa maka nwakpo awakporo ha ụbọchị gara aga.

    MTN mere ka a mata nke a n'akara ọbaozi X ha, ma ghara ịkọwa ihe mere ha ji gbachie ụlọahịa ha niile.

    N'okwu ha “biko anyị na agwa unu na anyị agaghị emepe ụlọahịa anyị niile taa bụ 30 Julaị 2024”.

    “Anyị ga-eji akara intaneeti anyị niile nyere gi aka.

    Nke a na-eme naanị otu ụbọchị ndị mmadụ iwe ji wakpochara ọtụtụ ụlọọrụ ha maka na ha machịrị akara ekwentị ha dịka gọọmenti etiti si nye ha iwu.

  7. Gọọmenti Naịjirịa ga-amalite ire akpa osikapa 40,000

    Mohammed Idris na Bola Tinubu

    Ebe foto si, @HMMohammedIdris

    Gọọmenti Etiti Naịjirịa akpọọla oku ka onye ọbụla dere duu dịka a na-eme atụmatụ ime ngagharịiwe ma kwuo na ya ekepụtala ogige dị iche iche ebe ndị Naịjirịa nwereike ịzụta otu akpa osikapa (50kg) n’ọnụego 40,000.

    Ọ bụ minista mgbasaozi na nduziuche ọhanaeze bụ Mohammed Idris kwupụtara nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu banyere nzukọ ndị ọchịchị Naịjirịa nwere n’Abụja n’ụbọchị Mọnde 29 Julaị 2024.

    Idris kwuru na ihe omume ahụ bụ otu n’ime atụmatụ Onyeisiala Bola Tinubu wepụtara iji belata ihe isiike nke ụmụafọ Naịjirịa.

    O kwuru na ọ bazighị uru ime ngagharịiwe ebe ọ bụ na Onyeisiala amalitela ileba anya n’ihe ndị ahụ a chọrọ iji maka ha mee ngagharịiwe.

    Idris kwuru na Gọọmenti Naịjirịa tụrụ anya na ọnụahịa ihe oriri ga-ebelata n’ihi na “abanyela oge udummiri”.

  8. Mbụzeala egbuola mmadụ 63 dịka ọtụtụ ndị ọzọ tọrọ n’ala

    Mbụzeala India

    Ebe foto si, Arunchandra Bose

    Opekatampe mmadụ iri isii na atọ (63) anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ tọrọ n’ala dịka nnukwu mmiri ozuzo butere mbụzeala na Kerala steeti dị na Indịa.

    Mbụzeala ahụ kpọtụrụ na mpaghara ebe e nwere ugwu na Wayanad District n’ụzọ ụtụtụ Tuzde 30 Julaị 2024.

    Ọrụ nnapụta na-aga n’ihu ebe ahụ kama nnukwu mmiri ozuzo na akwammiri dara ada na-akụnyere ya ụkwụ.

    Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ bụ AK Saseendran gwara BBC Hindi na ha ga-enwe ike chọpụta ogogo mbibi mbụzeala ahụ butere naanị n’ime awa ole na ole.

    Ka osiladị, ndịagha Indịa ezipụla ndị ọrụ ha karịrị narị abụọ (200) na mpaghara ahụ iji nyere ndị ọrụ nchekwa aka na mbọ ha na-agba ịnapụta ndị tọrọ atọ.

    Ụlọọgwụ ndị e nwere na steeti ahụ na-elekọta ihe karịrị mmadụ otu narị (100) ndị merụrụ ahụ dịka a napụtara ihe ruru mmadụ narị abụọ na iri ise (250) ma kpọgaa ha n’ogige nlekọta.

    A hụtala mbụzeala n’ọtụtụ akụkụ obodo Wayanad District nke gụnyere Mundakkai, Attamala, Chooralmala na Kunhome.

  9. Onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka ndị ọrụ ya chekwaa ndị na-eme ngagharịiwe

    Onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun

    Ebe foto si, Nigeria Police Force

    Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun ekwetela ma gwa ndị uweojii ka ha chekwaa ndị chọrọ ime ngagharịiwe maliye n’ụbọchị mbụ ruo 10 Ọgọst, 2024.

    Cheta n’izuụka gara aga ka nwamadị a gwara ndị niile chọrọ ime ngagharịiwe ka ha bịa debanye aha ma gosi ihe njirimaara ha mana ọtụtụ ndị Naịjirịa katọrọ mkpebi a. Na nzaghachị, o kwuru na ozi ndị ahụ ga-enyere ha aka ichekwa ndị na-eme ngagharịiwe.

    Mana n’akwụkwọ ozi o degaara Ebun-Olu Adegboruwa, ọkaiwu na-ahụ maka ikike dịịrị onye n’ụbọchị Mọnde, Egbetokun nyere ndị uwojii ntuziaka ka ha chekwaa ndị a na-eme ngagharịiwe.

    Adegboruwa nọọrọ n’ụbọchị 26 Julaị degara IGP akwụkwọ n’aha otu ‘Take It Back Movement’ so na ndị na-ahazi ngagharịiwe #EndBadGovernance nke Ọgọst.

    Na nzaghachị, IGP nyere ndịisi uweojii iwu ka ha gee ntị n’ihe ọkaiwu a na-achọ.

    Onye tinyere aka n’akwụkwọ nzaghachị Egbetokun bụ onyeisi ọrụ ya bụ Johnson Adenola.

    Onyeisi ndị uweojii gara n’ihu kwuo na ọ ga-amasị ya ka ya na Adegboruwa nwee mkparịtaụka n’ụbọchị Tuzde Julaị 30, 2024 iji ‘’ kparịtaụka ọfụma” n’ihe ọ na-achọ.

    “Ana m agwa gị na onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka ndịisi ndị uweojii na Naịjirịa ka ha mee ihe anyị na-achọ.

    “Aga m agwakwa gị na onyeisi ndị uweojii chọrọ ka gị na ya nwee mkparịtaụka n’isiụlọọrụ ndị uweojii dị n’Abuja n’ụbọchị Tuzde 30 Julaị, 2024 iji nwekwuo mkparịtaụka banyere ihe ị na-achọ,” ka Adenola kwuru.

    Ndị uweojii, ndịagha na ndị DSS adịla mbụ dọọ aka na ntị banyere ime ngagharịiwe yiri nke e mere na mba Kenya. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru na ngagharịiwe a nwereike ịdapụta dịka nke EndSars n’ọnwa Ọktoba, 2020, ma na-arịọ ndị ntoroọbịa ka ha mịnye mma ha n’ọbọ mana ndị ntoroọbịa akpọọla ekwe nkụ na ha ga-eme ngagharịiwe.

  10. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Gbaa jụụ ebe a maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  11. Ụlọọrụ NCC enyela iwu ka e mepee akara ekwenti a machiri

    Njirimara NCC

    Ebe foto si, NCC/X/Getty

    Ụlọọrụ Nigerian Communications Commission (NCC) enyela ụlọọrụ mgbasaozi ekwenti iwu ka ha mepee akara ekwenti ndị mmadụ ha machiri maka na ha ejikọghị ya n’akara njirimara NIN ha.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọrụ NCC bụ Reuben Muoka kwuru n’iwu ahụ bụ iji belata afụfụ mmachi ahụ na-ata ndị mmadụ.

    Iwụ NCC nyere na-esote mmachi a machiri ọtụtụ akara ekwenti ndị mmadụ n’ihi na ha ejikọghị ya na akara njirimara NIN ha.

    Cheta na ụlọọrụ NCC wepụtara atụmatụ ijikọ akara ekwenti na akara njirimara NIN n'afọ 2020 iji nweta ezi nchekwa nye ohaneze tinyere iji mara ọnụọgụgụ ndị nwere akara ekwenti n’Naịjirịa

  12. D’Tigress Naịjirịa emeriela Australia n’egwuregwu Paris Olimpiks

    Ụmụnwaanyị egwuregwu Basketball

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu egwuregwu ụmụnwaanyị D'Tigress Naịjirịa emeriela otu egwuregwu ụmụnwaanyị mba Australia n'asọmpi Basketball mbụ ha na asọmpi Paris Olimpiks 2024.

    D'Tigress nke onye nkuzi ha bụ Rena Wakama gbara ezi mbọ ma were ọkpụ gọọlụ 75 merie ndị Australia nwetara naanị gọọlụ 62.

    Mmeri ahụ bụ mmeri mbụ D'Tigress nwetara na-enweta n'asọmpi Olimpik kemgbe egwuregwu Olimpiks Athens 2004, mgbe ha meriri mba Saụt Korea.

    Australia bụ ndị nọ n’ọkwa nke atọ na mbaụwa na-abịa n’egwuregwu Basketball nke ụmụnwaanyị, ebe Naịjirịa nọ n’ọkwa nke iri na abụọ.

  13. Ndịagha Naịjirịa egbuola otu onye ji egbe n’Abia Steeti

    Okporoụzọ Aba, Abia steeti

    E nwere ihe ọgbaghara n’Aba, Abia steeti ụbọchị Monde 29 Julaị oge ndị ji egbe gbara ọtụtụ ụgbọala ọkụ ma mebie otu ụlọ oriri n'ọṅụṅụ.

    Akụkọ kwuru na ndị ahụ ji egbe bụ ndị pụtara ịmanye ọnọdụ 'sit-at-home' na mpaghara Aba dị na steeti ahụ.

    Otu onye agha 14 Brigade, Ohaofia, kwuru na ha na ndị ahụ ji egbe kwatara mgbọ wee gbuo otu n’ime ha ebe ndịọzọ bu apa mgbọ egbe gbaa ọsọ

    O kwuru na-enwetara ụgbọala Sienna na Land Cruiser n’aka ndị ahụ ji egbe.

  14. Pati ANC achụpụla Jacob Zuma

    Jacob Zuma

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Jacob Zuma

    Pati ANC achụpụla Jacob Zuma onye bụbu onyeisiala mba Saụt Afrịka.

    Zuma gbara afọ 82 na pati ANC bidoro inwe nsogbu ngwa ngwa achụpụrụ ya n’ọkwa onyeisiala n’afọ 2018 maka ebubo nrụrụaka.

    E bokwara Zuma ebubo ịrụrụ otu pati uMkhonto we Sizwe (MK) ọrụ na ntụliaka mba Saụt Afrịka mere n’ọnwa Mee, 29, 2024.

    N'afọ 2021, a tụrụ Zuma mkpọrọ oge ọ jụrụ ka e mee nyocha maka nrụrụaka n'oge ọchịchị afọ itoolu ya.

  15. Onyeisiala Bola Tinubu ebinyela aka n’ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ndị ọrụ Naịjirịa

    Onyeisiaala Naịjirịa Bola Tinubu

    Ebe foto si, BOLA TINUBU/X

    Nkọwa foto, Onyeisiaala Naịjirịa Bola Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ebinyela aka n’iwu kwadoro ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ 70,000.

    Onyeisiala Tinubu binyere aka n’iwu ahụ n’obi ọchịchị dị n’Abuja taa Monde 29, Julaị 2024 ka ọ gasiri mkpụrụ ụbọchị ole n’ole ụlọ omeiwu Naịjirịa nabatara ya.

    Ndị nọ oge onyeisiala binyere aka n’iwu ahụ gunyere onyeisi ụlọ omeiwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio na ndịọzọ

  16. America, United Kingdom na Canada adọọla ụmụafọ ha bi na Naịjirịa aka na ntị maka ngagharịiwe

    Foto ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Amerịka, United Kingdom na Kanada adọọla ụmụafọ ha bi na Naịjirịa aka na ntị banyere nchekwa ha n’ihi ngagharịiwe a na-akwado ịhazi.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka ndị Naịjirịa na-eme atụmatụ ịmalite ngagharịiwe n’abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst afọ 2024 n’ihi oke agụụ na ihe isiike.

    Na ndụmọdụ mba ndị ahụ nyere n’otu n’otu, ha dọrọ ụmụafọ ha aka na ntị ka ha zeghara ebe ndị ahụ ndị ọrụ nchekwa na ndị na-eme mkpesa nwereike ibuso onwe ha agha.

    Ụlọọrụ Amerịka dị n’Abụja gwara ndị mba ahụ ka ha zeghara ọgbakọ ngagharịiwe ahụ nakwa ebe e nwere ọgbakọ igwe mmadụ ma na-egekwa ntị n’ụlọmgbasaozi.

    Ụlọorụ nnọchiteanya mba UK dọrọ aka na ntị na ngagharịiwe ahụ bụ nke nwereike ịmalite n’abalị 29 Julaị ruo 10 Ọgọst 2024 n’obodo ndị a ma ama dịka Abụja na Legọs.

    Ha gwara ụmụafọ Briten ka ha saa anya na mmiri, zeghara igwe mmadụ ma gaa n’ihu na-enweta ozi site n’ụlọmgbasaozi dị iche iche e nwere na Naịjirịa.

    N’otu aka ahụ, gọọmenti Kanada dọrọ ụmụafọ ha aka na ntị maka ngagharịiwe ahụ ma gwa ha ka ha na-atụ anya mfachi okporoụzọ dịka ngagharịiwe ahụ nwereike ịbanye n’ọgbaaghara.

    Ha nyere ndụmọdụ ka ụmụafọ ha saa anya mmiri, rube isi n’iwu ndị ọchịchị ma na-egekwa ntị n’ụlọmgbasaozi ndị e nwere na Naịjirịa.

    Ndụmọdụ ndị a na-abịa dịka a na-enwe mmetụta banyere ngagharịiwe a na-akwado ịhazi nakwa etu ọ ga-esi metụta nchekwa ndị bi na Naịjirịa.

  17. Otu onye nne agaala mkpọrọ maka ịmanye nwa ya nwaanyị lụọ di

    Nwaanyị a tụrụ nga maka ịmanye nwa ya nwaanyị lụọ di

    Ebe foto si, Australian Federal Police

    Otu onye nne abụrụla mmadụ mbụ a ga-atụ nga n’okpuru iwu megidere ịmanye mmadụ ka ọ lụọ di maọbụ nwunye na mba Australia maka ịmanye nwa ya nwaanyị gbara afọ iri abụọ na otu (21) ka ọ lụọ otu nwoke mechara gbuo ya.

    Nwaanyị ahụ gaferela afọ iri anọ (40) aha ya bụ Sakina Muhammad Jan bụ onye a chọpụtara na aka ya adịghị ọcha n’ebubo ịmanye nwa ya nwaanyị bụ Ruqia Haidari ka ọ lụọ nwoke gbara afọ iri abụọ na isii (26) aha ya bụ Mohammad Ali Halimi n’afọ 2019.

    Akụkọ kwuru na ya bụ nwaanyị jiiri agbamaakwụkwọ ahụ gbanwerịta obere ụgwọ o ji Ali Halimi ma dịka ọ gachara izuụka isii a gbachara akwụkwọ ahụ, Halimi egbuo nwunye ya.

    Ka osiladị, a tụrụ Jan mkpọrọ ruru otu afọ n’ụbọchị Mọnde 29 Julaị 2024 maka ihe onye Ọkaikpe kọwara dịka “ịkwanye nwa ya nwaanyị ọkụ n’ahụ ụzọ na-ekwesịghị ekwesị” ọ bụladị ka o kwuchara na aka ya dị ọcha n’ebubo ahụ.

    Australia mebere iwu megidere ịmanye mmadụ ka ọ lụọ di maọbụ nwunye n’afọ 2013 dịka onye ọbụla dara ya nwereike ịga mkpọrọ ruru afọ asaa.

  18. Kwụsịnụ iyi ndị chọrọ ime ngagharịiwe egwu – Amnesty International

    Ndị na-eme ngagharịwe na Naịjirịa

    Otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International adọọla gọọmentị Naịjirịa na ndị ọrụ nchekwa aka na ntị ka ha kwụsị iyija ndị chọrọ ime ngagharịiwe na Naịjirịa.

    Otu a gara n’ihu kwuo na nke a abụghị usoro e ji maara ọchịchị onye kwuo uche ya ma sị na ọ bụ ikike dịịrị ụmụafọ obodo ime ngagharịiwe.

    Ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ oku na soshal midia sị ka e mee ngagharịiwe na Naịjirịa maka ọchịchị ọjọo malite n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọst.

    Gọomentị Naịjirịa adọọla aka na ntị megide ime ngagharịiwe ahụ, ma kwuo na o nwereike itinye obodo n’ọgbaghara ma were ya tụnyere ihe na-eme na mba Kenya, Sudan na Libya site na nnupuisi.

    Na-agbanyeghi ịdọ aka na ntị a, gọọmentị kwuru na ndị Naịjirịa nwere ikike dịịrị ha ime ngagharịiwe n’ụzọ udo. Auwal Musa Rafsanjani bụ onyeisi otu CISLAC ma bụrụkwa otu n’ime ndịisi Amnesty International kwuru “Ọchịchị onye kwuo uche ya nyere ụmụafọ obodo ohere ime ngagharịiwe ma kwuo ihe na-akpagbun ha.

    “Ngagharịiwe so n’otu n’ime njirimaara ọchịchị onye kwuo uche ya bụ nke anyị na-eso, onyeisiala na-achị ugbua akatọbeghi etu ọchịchị si dị ugbua,”

    “Iyi ndị chọrọ ime ngagharịiwe egwu ga-emebi ọrụ ọma Onyeisiala Bola Tinubu rụrụ n’oge gara aga,” ka Rafsanjani kwuru.

    “Ọ dịghị ịma ịsị na gọomentị ekwusiela ike na ọ ga-egbo nsogbu cheere obodo n’ihu bụ nke kpagburula ụmụafọ Naịjirịa ọkachasị ọnụahịa obibi ndụ, nakwa mwepu mmanụ ụgbọala,” ka o kwuru.

  19. Igbo ndị ọma mma mma nụ ooo!

    A sị na "Ndụ mmiri, ndụ azụ". Ka ụbọchị a maara gị na mma.

    Obịọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị n'izu ọhụrụ a.

    Biko kwụrụ chịm ebe a maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa nakwa ụwa gbaa gburu gburu.

  20. E nyela ndị uweojii ntuziaka etu ha ga-esi rụọ ọrụ maka ngagharịiwe

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Nigeria Police HQ

    Nkọwa foto, Ndị uweojii

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Adeolu Egbetokun agwaala ndị uweojii ka ha dị njikere, soro usoro iwu kwadoro ma rụọ ọrụ etu o kwesiri dịka ụmụntorobịa na-akwado ime ngagharịiwe maka ihe isike na ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi wepụtara, Egbetokun nyere iwu ka e ziga ndị uweojii na mpaghara Naịjirịa gba gburugburu iji hụ na e mere ngagharịiwe n’ụzọ iwu kwadoro ma gbochie ọgbaghara ọbụla nwereike i si na ya pụta.

    Ọ dọrọ aka na nti ka ndị uweojii hụ maka ezi nchekwa ndị na-eme ngagharịiwe ahụ.