Atiku Abubakar adọọla Gọọmenti aka na ntị maka oke agụụụ na mpaghara ugwu

Ebe foto si, Atiku Abubakar / X
Onye bubu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubabar adọọla Gọọmenti etiti na steeti aka na ntị maka oke agụụ na ihe ụkọ dị na Naịjirịa, ọkachasị na mgbago ugwu.
Atiku mere ka amata nke a n’akara X ya ma kwa arịrị maka akụkọ BBC mere gbasara ọnọdụ ụmụaka bụ ndị agụụ ji aka na Katsina steeti.
N’okwu Atiku “ndeko ndị World Food Programme (WFP) kwuru na ụmụaka ruru nde anọ na puku nari anọ (4.4million) nọ n’oke agụụ”.
“Gọọmenti etiti na nke steeti kwesiri ịgba mbọ, mee ngwangwa kwụsị oke agụụ ugbua”.
Atiku kọwara na ikesa ihe a ga akọ n’ụbị abụghị naanị ihe ga-akwụsị agụụ ngwangwa ma kọwaa na “Gọọmentị kwesiri ịkwụsị ihe niile na-akpata oke agụụ ma mee ka ọnụ ahịa nri belata maọbụ datuo.
“Ha kwesiri ime ga ezigbo nchekwa dị, nweta usoro ga-akwụsị ọnụ ahịa ịrị elu ma mee ka ego Naịra ghara ịdamba ebe dollar dị na ihe ndị ọzọ”.
Atiku gara n’ihu dụọ gọọmentị Kastina ndụmọdụ ka ha bido itinye uche na ịkọpụta nrị, ịkwado ndị ọrụ ugbo nakwa ime ka ezi nchekwa dị n’ime obodo bụ nke ga-akwụsị ime ka ọtụtụ mmadụ sị n’obodo ha na-agbapụ maka ọgbaaghara”.

















