Ndị ọchịchị Izrel akwadola ịgbatị oge nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza

Ebe foto si, Reuters
Ndị ọchịchị mba Izrel akwadola ịgbatị oge nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza nke ga-abụ naanị izu ụka isii, bụkwa oge Muslim Ramadan na oge ndị Juu ji ebu ọnụ.
Ụlọọrụ Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwupụtara nke a, dịka agba nke mbụ nke nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ gwụchara n'ime abalị Satọde1 Maachị 2025.
Ụlọọrụ Netanyahu kwuru na dịka atụmatụ nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke onye na-anọchite Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, aha ya bụ Steve Witkoff depụtara, a ga-atọhapụ ọtụtụ n'ime ndị Hamas ji eji na Gaza bụ ma ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ n'ụbọchị nke mbụ.
O kwuru na a ga-atọhapụ ndị ọzọ e ji eji fọrọ nụ mgbe e nwere nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ na-adịgide adịgide.
Mana ndị Hamas ekwubeghị ihe ọbụla banyere ihe ọhurụ a mba Izrel kwuru.
Ụlọọrụ Praịm Minista kwuru na Hamas "ajụla" ịkwado atụmatụ onye nnọchite Onyeisiala Trump bụ Witkoff, nke kwadoro na Izrel ga-amalite mkparịtaụka ozugbo ma ọ bụrụ na otu Hamas gbanwee ọnọdụ ha.
Atụmatụ a na-atụ anya na mba Izrel nwere ike ịlaghachi n'ọgụ ka ụbọchị iri anọ na abụọ gachara ma ọ bụrụ na ha kwenyere na mkparitauka ha na ndị Hamas banyere agba nke abụọ nke nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ dara.














