Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ndị ọchịchị Izrel akwadola ịgbatị oge nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza

    Mgbe ndịagha Izrel guzoro n'elu ụgbọ e ji akwa mgbọ n'okeala Izrel na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mgbe ndịagha Izrel guzoro n'elu ụgbọ e ji akwa mgbọ n'okeala Izrel na Gaza

    Ndị ọchịchị mba Izrel akwadola ịgbatị oge nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza nke ga-abụ naanị izu ụka isii, bụkwa oge Muslim Ramadan na oge ndị Juu ji ebu ọnụ.

    Ụlọọrụ Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwupụtara nke a, dịka agba nke mbụ nke nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ gwụchara n'ime abalị Satọde1 Maachị 2025.

    Ụlọọrụ Netanyahu kwuru na dịka atụmatụ nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke onye na-anọchite Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, aha ya bụ Steve Witkoff depụtara, a ga-atọhapụ ọtụtụ n'ime ndị Hamas ji eji na Gaza bụ ma ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ n'ụbọchị nke mbụ.

    O kwuru na a ga-atọhapụ ndị ọzọ e ji eji fọrọ nụ mgbe e nwere nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ na-adịgide adịgide.

    Mana ndị Hamas ekwubeghị ihe ọbụla banyere ihe ọhurụ a mba Izrel kwuru.

    Ụlọọrụ Praịm Minista kwuru na Hamas "ajụla" ịkwado atụmatụ onye nnọchite Onyeisiala Trump bụ Witkoff, nke kwadoro na Izrel ga-amalite mkparịtaụka ozugbo ma ọ bụrụ na otu Hamas gbanwee ọnọdụ ha.

    Atụmatụ a na-atụ anya na mba Izrel nwere ike ịlaghachi n'ọgụ ka ụbọchị iri anọ na abụọ gachara ma ọ bụrụ na ha kwenyere na mkparitauka ha na ndị Hamas banyere agba nke abụọ nke nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ dara.

  2. Ndị be anyị daalụ nụ ooo

    Anyị na-asị unụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa nwetere anyị niile ihe ọma.

    Ndewo.

  3. EFCC akpụpụla Theodore Orji chịburu Abia steeti na nwa Chinedu n’ụlọikpe

    Theodore Orji, nwa ya na mmadụ atọ ahụ kwuru na aka ha adịghị n’ebubo ndị ahụ EFCC boro ha

    Ebe foto si, Economic and Financial Crimes Commission

    Nkọwa foto, Theodore Orji, nwa ya na mmadụ atọ ahụ kwuru na aka ha adịghị n’ebubo ndị ahụ EFCC boro ha

    Ụlọọrụ na-ebuagha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) akpụpụla aka chịburu Abia Steeti bụ Theodore Orji, nwa ya bụ Chinedum Orji na mmadụ atọ ọzọ ụlọikpe maka nrụrụaaka ego ruru ijeri naịra iri isii na ụma nakwa mpụ ndị ọzọ dị iche iche.

    Aha mmadụ atọ ahụ bụ Philip Nto, Onwumene King Obioma na Romanus K. Madu.

    Ka Ọkaikpe Lilian Abai nke ụlọikpe Federal High Court dị n’Umuahia, isi obodo Abia steeti gọpụtara ebubo ndị ahụ e boro ha, Theodore Orji, nwa ya na mmadụ atọ ahụ kwuru na aka ha adịghị n’ebubo ndị ahụ.

    N’ịga n’ihu ọkaiwu ha gara n’ihu rịọ ụlọikpe ahụ ka e nye ha ntọhapụ beelu.

    Ọkaikpe Lilian Abai nabatara arịrịọ ahụ ma nye ha beelu ma kwuo ka ha kwụọ ụgwọ dị nde naịra iri ise n’otu n’otu maka beelu ahụ.

    Ọkaikpe Abai gara n’ihu nyigharịa ikpe ha n’ọnwa Juun 18 na 19 afọ 2025.

  4. Ụlọikpe enweghachitala Martins Amaewhule dịka onyeisi ụlọomeiwu Rivas Steet

    Cheta na enweela ọtụtụ ikpe banyere nchụpụ a chụpụrụ Martins Amaewhule na ndị omeiwu ọzọ steeti ahụ oge ha hapụrụ pati PDP ma banye pati All Progressives Congress (APC).

    Ebe foto si, Rivers State Government

    Nkọwa foto, Cheta na enweela ọtụtụ ikpe banyere nchụpụ a chụpụrụ Martins Amaewhule na ndị omeiwu ọzọ steeti ahụ oge ha hapụrụ pati PDP ma banye pati All Progressives Congress (APC).

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa nke Ọkaikpe Emmanuel Agim nọ n’isi ya, ekpebiela na Martins Amaewhule bụ onyeisi ụlọomeiwu Rivas steeti ma nye iwu ka a kwụsị ego niile gọọmenti etiti na-akwụ Rivas steeti ruo mgbe Gọvanọ Siminalayi Fubara bịara gosi ụlọomeiwu ahụ atụmatụ ego mmefu steeti ahụ.

    Cheta na enweela ọtụtụ ikpe banyere nchụpụ a chụpụrụ Martins Amaewhule na ndị omeiwu ọzọ steeti ahụ oge ha hapụrụ pati PDP ma banye pati All Progressives Congress (APC).

    N’okwu ya oge ọ gụpụtara mkpebi ụlọikpe ahụ ụbọchị Fraịde 28 Jenụwarị, Ọkaikpe Agim mere ka o doo anya na ọ bụ Martins Amaewhule bụ onye iwu kwadoro dịka onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ.

    O kwuru na usoro e ji wepụ ndị omeiwu ahụ na Amaewhule dịka onyeisi ụlọomeiwu Rivas steeti megidere iwu.

    N’aka nke ọzọ, ụlọikpe ahụ kagburu ntuliaka ọkwa onyeisioche okpuru ọchịchị e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde 5 Ọktoba, 2025.

    N’ikpe ya, Ọkaikpe Jamilu Tukur kwuru na ntuliaka ahụ ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Rivas steeti bụ Independent Rivers State Electoral Commission chịkọbara bụnke megidere iwu na-echekwa ntuliaka na Naịjirịa.

  5. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ na-atụ mgbere ụmụaka n’Imo Steeti

    Henry Okoye mere ka o doo anya na ndị uweojii steeti ahụ kwụrụ chịm iji gbochie ma nweta ezi nchekwa nye nwatakịrị ọbụla nọ na steeti ahụ.

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Henry Okoye mere ka o doo anya na ndị uweojii steeti ahụ kwụrụ chịm iji gbochie ma nweta ezi nchekwa nye nwatakịrị ọbụla nọ na steeti ahụ.

    Aka ndị uweojii Imo steeti akparala mmadụ abụọ e kwuru na ha na-atụ mgbere ụmụaka ma napụta ụmụaka abụọ ha zuru ezu.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ Henry Okoye kwuru na mmadụ abụọ ahụ chọrọ inye ndị uweojii aka azụ iji gbochie nwụchi ha mana ndị uweojii gbara isi akwara ma nwụchie ha.

    Mmadụ abụọ ahụ bụ Confidence Odoh si Umuanyo Eziobodo dị n’okpuru ọchịchị ọdịda anyanwụ Owerri ebe onye nke ọzọ bụ Eze Chika si Obiokwara Umualoma dị n’okpuru ọchịchị Ideato Nọt nke steeti.

    Confidence Odoh ka akụkọ kwuru na o zuru nwa onye ya na ya bi n’otu n’ụlọ dịka nwata ahụ na-egwu egwu. Ndị uweojii agaala n’ihu kpọghachi nwa ahụ n’aka nne na nna ya.

    Akukọ kwuru na ndị uweojii nwetara nwatakịrị gbara afọ anọ n’aka Eze Chika. Chika kwuru na ọ kwụrụ otu nde naịra na puku narị asatọ iji zụọ nwatakịrị ahụ n’aka ndị otu na-atụ mgbere mmadụ. E kwuru na a malitela ime nnyocha iji chọpụta ndị ọzọ ha na ya na-akpa ajọ agwa ahụ ma nwụchie ha.

    Henry Okoye mere ka o doo anya na ndị uweojii steeti ahụ kwụrụ chịm iji gbochie ma nweta ezi nchekwa nye nwatakịrị ọbụla nọ na steeti ahụ.

  6. Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

    Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

    Onyeysiala Yukren awụchiela Washington DC isi obodo Amerịka maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka.

    A na-atụ anya na mkparịtaụka a ga-enweta nkwekọrịta n’etiti mba abụọ a nke ga-enye Amerịka ikike igwuputa ihe ọnatarachi dị na Yukren.

    Akụkọ kwuru na-enweela nkwekọrịta banyere nke a mana Zelensky chọrọ ka ndịagha mba Yukren sonye na nkwekọrịta ahụ. Mana Onyeisiala Trump kwuru na ọ bụ mba Yurop bụ ihe nke ahụ dị n’aka.

    Ọgbakọ a na-abịa ka otu abalị gachara Praịm Mịnịsta mba UK Keir Starmer bịara obi ọchịchị White House ebe ya na Onyeisiala Trump nwere mkparịtaụka

  7. Ndị be anyị nnọọ nụ

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 28 ụbọchị ikpeazụ n'ọnwa Febụwarị 2025.

    Anyị na-asị ka ihe ọma meere gị na ndị agbataobi gị taa.

    Ndewo dịka ị na-esonyere anyị.

  8. O meela abalị atọ ndị ụka Katọlik bidoro ikpere Pope Francis nọ n’akwa ọrịa ekpere

    Pope Francis

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Pope Francis

    O meela abalị atọ ndị ụka katọlik bidoro ịgbakọ ọnụ na St Peter’s Basilica ebe ha na-anọ na-ekpere Pope Francis ekpere dịka dọkịnta na-elekọta ya sị na ọ na-enweta onwe ya nwa nkenke nwa nkenke.

    Ma ndị ụkọchukwu nwoke ma nwaanyị, ndị mbịarambịa, ụmụakwụkwọ juru na vatican na-ekpe ekpere rosary n’isi Pope.

    Ha na-arịọ ka Chukwu mee ka Pope gbakee n’ọrịa ma bido ọrụ ya ọzọ.

    Pope Francis dị afọ 88 ugbua mana nsogbu ahụike ya bidoro kanwanye njọ ihe dịka abalị ise garaaga.

    Ozi si na Vatican na nke ikpeazụ a na-ekwu na Pope Francis amalitela iri nri, nweeike ị dọnaala n’oche ya ma na-eme ihe ha kpọrọ ‘obele ọrụ’.

  9. Ụmụ Igbo, unu asaala chi?

    Ka chi foro taa nwetere anyị udo na ọganiru.

    N’ụtụtụ a ọ bụ Michael Ilediagu na ga-enwetere unu akụkọ ndị dị mkpa na Naịjirịa nakwa mba ụwa niile, mana Ikechukwu Kalu ga-enwere oche n’ehihe.

    Ndewo!

  10. Amerịka ga-ewepụta akwụkwọ 'gold card' ga-enye ndị mbịarambia ikike ịbụ nwafọ ha

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị mba Amerịka ekwupụtala atụmatụ ọhụrụ ga-enyere ndị mmadụ aka ịbụ ụmụafọ mba Amerịka.

    Onyeisiala Donald Trump kwuru na ha ga-ere akwụkwọ ikike ọhụrụ a kpọrọ “Gold Card” nye ndị mbịarambịa n’ọnụego nde dọla ise ($5m).

    O kwuru na akwụkwọ ikike a dị ka akwụkwọ ikike ‘Green Card’ pụrụiche ga-enye ndị mbịarambịa ‘ohere ịbụ ụmụafọ mba Amerịka.”

    Akwụkwọ ikike ọhụrụ a, e mere maka ndị mbịarambịa bara ụba ga-enye ha ohere ịbata, biri ma na-arụ ọrụ n’Amerịka. Ọ ga-anọchi anya akwụkwọ ikike a US EB-5 nke ndị achụmntaego dị kamgbe afọ 35 gara aga.

    “Anyị ga-ere akwụkwọ ikike ‘gold card’. Anyị ga-edosa ya n’ọnụego ruru nde dọla ise.

    O ga-enye gị ohere inwete akwụkwọ ‘green card, ọ ga-abụkwa ụzọ ị ga-esi bụrụ nwafọ Amerịka. Ndị nwere ego ga-abịa n’obodo anyị, ha zụọ akwụkwọ a, ha ga-enwe ọganihu, mefuo ọtụtụ ego ma kwụọ ọtụtụ ụtụisi, nyekwa ọtụtụ mmadụ ọrụ.”

    Trump kwupụtara nke a na Tuzde 25 Febụwarị 2025, n’ụlọọrụ ya mgbe ọ na-etinye aka n’akwụkwọ iwu ahụ.

    O kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ ikike ‘gold card’ a n’izuụka abụọ na-abịa abịa, ma kwuo na o cheghi na ọchịchị ga-achọ ịnata ikike n’aka ndị omeiwu.

    Mana akụkọ banyere atụmatụ a edochabeghi anya n’uju.

  11. Mmadụ 46 anwụọla dịka ụgbọelu ndịagha Sudan kpọkara n'ebe obibi

    Ọdụ ụgbọelu dị na Wadi Seidna bụ ebe dị ndịagha Sudan oke mkpa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọdụ ụgbọelu dị na Wadi Seidna bụ ebe dị ndịagha Sudan oke mkpa

    Ihe ruru mmadụ iri na isii anwụọla ebe mmadụ iri ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka ụgbọelụ ndịagha Sudan kpọkara n’ebe obibi nke Omdurman, obodo dịka isi obodo Khartoum.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi steeti nke Sudan kwuru na ụgbọelu Antonov ahụ mba Rọshịa rụrụ dara mgbe o sitere n’ọdụ ụgbọelu Wadi Seidna nke ndịagha were felie na mgbede nke ụbọchị Tụzde 25 Febụwarị 2025.

    O kwuru na a mabeghi ihe kpatara ụgbọelu ahụ jiri kpọkaa nwere gbuo ndịagha na ndị nkịtị, mana ozi kwuru na ndịagha Sudan na-ekwu na o nwere ike ịbụ na ịnjin ụgbọelụ ahụ anaghị arụ ọrụ ọfụma.

    Ihe mberede a mere ụbọchị na-esote ụbọchị ndị nnupụisi Rapid Support Forces (RSF) - nke na-ebuso ndịagha Sudan agha kwuru na ha gbaturu ụgbọelu agha na Saụt Darfur.

    Cheta na nsogbu a emebiela ọtụtụ ebe na mba Sudan nke gụnyere Khartoum na Omdurma, ebe e gburu ọtutụ puku mmadụ ma chọpụ nde mmadụ iri na otu n’ụlọ ha.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba Sudan kwuru na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe mberede buru ndị merụrụ ahụ nke gụnyere ụmụaka gawa ụlọọgwụ.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi AFP kwuru na akụkọ ndị akaebe kwuru na enwere oke mgbawa nke mere ka ọtụtụ ụlọ mebie mgbe ụgbọelu ahụ dara.

  12. E doziela nsogbu ji imezu nkwekọrịta nkwụsị ọgụ na Gaza - Ndị ọchịchị

    Mgbe ndị Izrel mere olili ozu Shiri, Ariel na Kfir Bibas bụ ndị Hamas bulatara ozu ha n’izu garaaga

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mgbe ndị Izrel mere olili ozu Shiri, Ariel na Kfir Bibas bụ ndị Hamas bulatara ozu ha n’izu garaaga

    Ndị ọchịchị Izrel na Hamas kwuru na ndị ogbugbo edoziela nsogbu ha nwere banyere nkwekọrịta nkwụsị ọgụ Gaza.

    Cheta na mba Izrel gburu oge ịtọhapụ ndị mkpọrọ Palestine n’ụbọchị Satọde 22 Febụwarị 2025, iji gosi iwe ha banyere ahụhụ ndị Izrel e ji eji tara n’aka ndị Hamas tupu a tọhapụ ha.

    Ndị ọchịchị Izrel kwuru na nke a bụ nnukwu mmebi ihe ndị dị na nkwekọrịta ahụ.

    Ha kwuru na a na-atụ anya na a ga-atọhapụ ndị mkpọrọ ndị ọzọ n’ụbọchị taa bụ Wenezde 26 maọbụ Tọzde 27 Febụwarị 2025, iji agbanwe ozu mmadụ anọ ndị ahụ e butere na mba Izrel.

    Nke a ga-emehe ụzọ ka onye ọchịchị na-anọchite anya mba Amerịka na mpaghara Middle East nwere bịa nleta dịka o kwuru na ya chọrọ ka mba Izrel na Hamas malite mkparịtaụka banyere imezu ihe dị n’agba nke abụọ nke nkwekọrịta ịkwụsị ọgụ ahụ.

  13. Jamb ekwuola mgbe ha ga-akwụsị ịdeba aha n’ule UTME 2025

    Jamb

    Ebe foto si, Jamb

    Nkọwa foto, Jamb

    Ụlọọrụ Joint Admissions and Matriculation Board (Jamb) ekwuola mgbe ha ga-akwụsị ịdeba aha n’ule UTME nke afọ 2025.

    Jamb mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ọzị ha zipuru na Febuwarị 24, 2025.

    Ha sị na ‘ ị deba aha n’ule UTME bidoro na Febuwarị 3, 2025 ga-akwụsị na Satọde 8, 2025'.

    Jamb kwuru na mmadụ ruru 1,290,715 edebenyela aha n’ule UTME n’ime abalị iri na atọ kemgbe a manitere idebanye aha n’ule nke afọ 2025.

  14. Yukren ekwetala ịnye mba Amerịka ikike inwere ihe ha sitere n'okike dị n’ime ala

    Onyeisiala Trump na Onyeisiala Zelensky

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump na Onyeisiala Zelensky

    Ndị ọchịchị mba Yukren kwuru na Yukren ekwetala ịnye mba Amerịka ikike inwere ihe sitere n’okike dị n’ime ala.

    Ha gwara BBC na mba Yukren kwetara nkwekọrịta nke mba Amerịka nyere ha mana ha mere ọtụtụ mgbanwe n’ime ya ka o nwere wetara ha ihe ọma n’ọdịnaihu.

    Akụkọ mgbasa ozi kwuru na mba Amerịka ewepụla arịrịọ mbụ nke chọrọ ka Amerịka nweta ikike nke ruru narị ijeri ise dọla ($500bn) na ego ha ga-enweta site na iji akụ sitere n'okike mana ha enyeghị mba Yukren nọ n’agha ikike nchekwa siri ike.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na ya na-atụ anya na Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-abịa Amerịka ka ha abụọ binye aka n’akwụkwọ nke nkwekọrịta ahụ.

    Na-ekwughị ma nkwekọrịta a bụ eziokwu, Onyeisiala Trump kwuru n’ụbọchị Tuzde 25 Febụwarị 2025, na ihe mba Yukren ga-enweta na nkwekọrịta a bụ ikike ịlụ ọgụ na-aga.

    Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ndị Yukren nwere obi ike nnukwu mana ọ bụrụ na ọgbụghị maka mba Amerịka, ego ya na ngwa agha ya, agha a gaara agwụ n'oge dị mkpirikpi.

    Mgbe a jụrụ ya ma mba Amerịka ọ ka ga na-ezigara Yukren ngwa agha na mgbọ, o kwuru na o nwere ike nwee ruo mgbe Amerịka na Rọshịa ga-enwe nkwekọrịta. “Anyị kwesịrị inwe nkwekọrịta, ma ọ bụghị ya, ọgụ ga-aga n'ihu,”.

  15. Igbo ndị ọma, anyị ekele ụnụ

    Dịka ụnụ na-anọnyere anyị n’ọgbakọ BBC Igbo, ụbọchị taa ga-amịtara gị mkpurụ ọma.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-enwetere nụ akụkọ ndị dị mkpa na Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Nwanne anyị bụ Michael Ngene ga-esonyere anyị n’oge ehihe.

    Ndewo!

  16. Keir Starmer ekwuola na ọ ga-ebuli ọnụego mmefu nchekwa UK malite n’afọ 2027

    Praịm Mịnịsta UK Keir Starmer
    Nkọwa foto, Praịm Mịnịsta UK Keir Starmer

    Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer agwala ndị ụlọomeiwu na malite n’afọ 2027, ọ ga-ebuli ọnụego mmefu nchekwa UK ruo pasenti 2.5 ma belata ego enyemaka ha na-eziga mba ofesi.

    Nkwuputa a na-abịa dịka Keir Starmer na Onyeisiala Trump mba Amerịka nwere nzukọ.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ mmadụ etoola nkwuputa a ma kwuo ọ dị mkpa maka na ndịagha mba UK enweghị ụfọdụ akụrụngwa ha kwesiri inwe iji nweta ezi nchekwa.

  17. A malitela ime nnyocha banyere ọnwụ onye bọọlụ Naịjirịa nwụrụ na Yuganda.

    Otu egwu bọọlụ Lawal bụ Vipers Sports Club, ekwuputala mwute ha n’ọnwụ nwaamadị ahụ.

    Ebe foto si, Vipers Sports Club/X

    Nkọwa foto, Otu egwu bọọlụ Lawal bụ Vipers Sports Club, ekwuputala mwute ha n’ọnwụ nwaamadị ahụ.

    Ndị uweojii mba Yuganda amalitela ime nnyocha maka ọnwụ nwafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ e kwuru na ọ nwụrụ na Kampala bụ isi obodo mba ahụ.

    Akụkọ kwuru na Abubakar Lawal gbara afọ 29 si n’elu ụlọ dị n’ogige Voicemall Shopping Arcade daa, mana oge e bugara ya ụlọọgwụ, ndị Dọkịnta kwuru na ọ nwụọla.

    E kwuru na ọ gara ebe ahụ ịhụ enyi e kwuru si mba Tanzania.

    Dịka akụkọ siri kwu, enyi ya ahụ aha ya bụ Ọmary Naima hapụrụ Lawal n’ime ụlọ ya gawa inwetara ya ihe oriri tupu njijiji ahụ ejie.

    Otu egwu bọọlụ Lawal bụ Vipers Sports Club, ekwuputala mwute ha n’ọnwụ nwaamadị ahụ.

    Ọtụtụ mmadụ amalitela izite ozi nkasiobi nye ezinaụlọ Lawal onye batara otu egwu bọọlụ Vipers Sports Club n’ọnwa Julaị 2022 ka ọ nọchara afọ abụọ n’otu egwu bọọlụ AS Kigali dị na mba Rwanda.

    Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ mmadụ amalitela iju ajụjụ banyere ihe kpatara ọnwụ Lawal ebe ndị uweojii kwuru na ha amalitela ime nnyocha.

    E kwuru na ndị uweojii enwetela ekwenti Lawal na ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka na nnyocha ha na-eme.

  18. Onyeisiala Macron kwuru na Rọshịa na Yukren nwere ike ikwekọrịta ịkwụsị agha

    Onyeisiala Macron na Onyeisiala Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onyeisiala Macron na Onyeisiala Trump

    Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na Rọshịa na Yukren nwere ike inwe nkwekọrita ịkwusị agha n’izu na-abịa.

    O kwuru nke a mgbe ọ gara mba Amerịka ileta Onyeisiala Donald Trump na ụlọ ọchịchị ‘White House’ ma ọ dọrọ aka na ntị na nke ahụ apụtaghị na a ga-enyefee Yukren.

    Onyeisiala Macron na-agba mbọ imezu nkwa okwere na ya ga-enweta nkwekọrịta nkwụsị agha n’etiti mba Yukren na Rọshịa nke ga-enwta nchekwa doro anya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha chọrọ udo, nke na-abụghị na Yukren agaghị azọ onwe ya maọbụ inwe nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ na-edoghị anya.

    “Anyị chọrọ udo ga-egosipụta otu mba Yukren ga-esi enweta nwere onwe. Mba ndị dị na Yorup kwesịrị ịmalite ime ihe ha kwesịrị iji nweta ezigbo nchekwa.

  19. Ihe anyị ma maka akụkọ banyere ịkpụpụ ndị dịbịa a nwụchiri n'Anambra ụlọikpe

    Aka na-achị Anambra steeti bụ gọvọnọ Chukwuma Soludo

    Ebe foto si, Chụkwuma Charles Soludo/X

    Nkọwa foto, Aka na-achị Anambra steeti bụ gọvọnọ Chukwuma Soludo

    Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambra steeti bụ Law Mefor akatọọla akụkụ na-efegharị na soshịa midia nke kwuru na Gọọmentị Anambra steeti ga-akpụpụ ndị dibịa awụchiri na steeti ahụ ụlọikpe n’oge na-anadịghị anya.

    Mefor gwara BBC na gọọmentị emechabeghị nnyocha banyere ndị dibịa ha ji eji.

    O kwuru na ọ bụ mgbe ha mechara nnyocha ahụ ka ha ga-akpụpụ ndị a chọpụtara na e nwere ihe akaebe zuru oke iji kpụpụ ha ụlọikpe.

    Mefor kwuru na a ga-atọhapụ ndị a chọpụtara n’aka ha dị ọcha.

    “Ọ bụghị akpụpụchaa ndị dibịa ahụ anyị ji eji ụlọikpe tupu e mebe nnyocha, nke a mere anyị ji eme nnyocha tupuu a kpụpu ha ụlọikpe,” Mefor kwuru.

    Cheta na akụkọ anyị amaghị maọbụ eziokwu kwuru na gọọmentị Anambra steeti ga-akpụpụ ndị dibịa ahụ a wụchiri maka ịgwọ ọgwọ okeite na ihe ndị ọzọ iwu na-akwadoghị n’ụlọikpe n’oge na adịghị anya.

    Ọzọ bụ n'Agụnaechemba bụ otu nchekwa pụrụiche nke gọọmentị Anambra Steetị hiwere iji kpochapụ ndị omekome nke mere ọrụ nchekwa jiri si ike na steeti ahụ. Ha awụchịla ọtụtụ ndị dibịa aka ha dị n'ịgwọrọ ndị omekome na ndị chọrọ inwe ego ọsọ ọsọ ọgwụ.

  20. Ụmụ Igbo, anyị sị nke onye chiri ya zere.

    Dịka anyị na-asị unu nnọ, echefukwala ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo maka akụkọ ndị dị mkpa na Naịjirịa nakwa n'ụwa.

    Ndewo nụ!