Etu e si gbaara ụmụafọ Naịjirịa 103 ụgbọ nwamkpị site na mba Turkey
Akụkọ kwuru na otu onye Fada so na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ikechukwu Kalu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Michael Ngene, Michael Ilediagu
Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa akpọọla oku ka gọọmeti gbatara ndị nwere nsogbu oke idemmiri ọsọ enyemaka n’Abia steeti

Ebe foto si, NIGERIA SENATE/FACEBOOK
Nkọwa foto, Ụlọomeiwu Naịjirịa Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa akpọọla oku ka gọọmenti gbatara obodo oke idemmiri mebiri n’Abia steeti ọsọ enyemaka.
Sinetọ Orji Uzor Kalu onye na-anọchiteanya Abia North n’ụlọomeiwu sịneti kpọrọ oku a na nzukọ ụlọomeiwu ahụ mere taa bụ Julaị 2, 2024.
N’okwu ya “Ịdemmiri a gburu ọtụtụ mmadụ, mebie ụtụtụ ulọ na ụzọ jikọrọ obodo na obodo.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ebe idemmiri ahụ kacha metụta bụ ụlọakwụkwọ praịmarị dị na mpaghara okoko-item, ụlọakwụkwọ praịmarị dị n’okposi, ụlọ mgbasa ozi radio, mahadụm na ọtụtụ ụlọ ndị ọzọ dị n’kpuruọchịchị Bende nke steetị ahụ.
Ndị ọrụ Customs ejichiela ngwaagha ruru N13.9bn na Rivers steeti

Ebe foto si, Nigeria Customs/X
Ụlọọrụ Customs ejichiela ngwaagha dị iche iche nke ọnụego ya ruru ijeri naịra iri na atọ na ụma itoli (N13.9bn) na Rivas steeti.
Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ọdọ ụgbọmmiri Onne Port dị na Rivas steeti, onyeisi ụlọọrụ Customs na Naịjirịa bụ Bashir Adeniyi kpuhere na igbe container ogologo ya ruru fiit iri anọ (40 feet) nke akara ndebanyeaha ya bụ MAEU165396 bụ nke e ji site mba Turkey na-atụbata ha bụ ngwaagha.
Ndị Customs jichiri igbe container ahụ oge onye na-atụbata ya gbara mbọ ịgbanarị usoro e si eme ihe, ma mgbe e nyochara ya, a chọpụtara na ihe juru n’ime ya bụ ụdị egbe dị iche iche nke ruru yunit narị asatọ na iri anọ na anọ (844 units) tinyekwara mgbọ dị otu narị puku na iri na abụọ na narị ise (112,500).
Dịka Bashir siri kwuo, ngwaahịa ndị e ji zochie ngwaagha ndị ahụ gụnyere ụzọ, oche, ihe ndị e ji etinye mmiri n’ụlọ na akpa akpụkpọanụ.
Ka o siladị, anwụchiela ma jichie mmadụ atọ ndị a na-enyo enyo aka ha dị n’ịtụbata ya bụ ngwaagha dịka a na-eme nnyocha iji chọpụta ihe bụ ebumnoobi ha.
Olu Jacobs dị ndụ - Kate Henshaw

Ebe foto si, Ajokesilva/Instagram
Ọnụ na-ekwuru otu jikọtara ndị na-eme ejije na Naịjirịa 'Actors Guild of Nigeria' bụ Kate Henshaw akọwaala ozi gbasara ọnwụ Maazị Oludotun Baiyewu a maara nke ọma dịka Olu Jacobs dịka nke na-abụghị eziokwu.
Kate Henshaw kwupụtara nke a n'ozi o depụtara n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị ụka Sọnde 30 Juun 2024 dịka ụfọdụ mmadụ nọ na-ebugharị akụkọ na nwaamadị ahụ anwụọla.
Ọ kọwara ya bụ akụkọ ụgha dịka nke na-ewute n'obi ma dọọ ndị na-efesa ya aka na ntị ka ha kwụsị ụdị omume dị etu ahụ.
“Etu ụnụ si edere onye dị ndụ ozi laa nke ọma kwa afọ ọbụla bụ ihe na-agbakasị ahụ. Gịnị mere ụnụ ji eme odogwu nwoke a na ezinaụlọ ya ụdị ihe a oge niile? Ọ bụ nke na-ezighị ezi n’ụdị ọbụla. Biko kwụsịnụ ya. Olu Jacobs dị ndụ,” ka Kate Henshaw dere.

Ebe foto si, Kate Amaka Henshaw/X
Ndị o gburu mmadụ gbuo onwe ha atụọla ogbuniigwe ma gbuo ihe karịrị mmadụ 18 na Borno

Ebe foto si, Nigerian Army/X
Opekatampe mmadụ iri na asatọ (18) anwụọla ebe iri atọ (30) ndị ọzọ merụrụ ahụ n’oge ụmụnwaanyị a na-enyo enyo na ha bụ ndị o gburu mmadụ gbuo onwe ha tiwara ogbuniigwe.
Otu n’ime ogbuniigwe ndị ahụ ka e kwuru gburu mmadụ isii ma merụọ ndị ọzọ ahụ n’ebe a na-agba akwụkwọ na Borno steeti n’ụbọchị Satọde 29 Juun 2024.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata na Borno steeti kwuru na e mere mwakpo ndị ahụ n’ebe a na-agba akwụkwọ, n’oge oliliozu onye ahụ na-agba akwụkwọ nakwa n’otu ụlọọgwụ dị na Gwoza.
Ka osiladị, enwebeghị otu kwuru na aka ha dị na mwakpo ahụ mana otu na-eyi ndụ egwu na Naịjirịa bụ Islamic State West Africa Province (ISWAP) a nọrọla ọtụtụ oge kwuo na aka ha dị n’ogbuniigwe ọjọọ ndị a na-atụ na Borno steeti.
Ndịagha anwụchiela mmadụ 47 a na-enyo enyo maka ohi okporoigwe na Kaduna

Ebe foto si, Nigerian Army/X
Ndịagha Naịjirịa anwụchiela mmadụ iri anọ na asaa (47) a na-ebo ebubo izu ohi okporoigwe ụgbọoloko na mpaghara Kakau Daji-Anguwan Ayaba dị n’okpuruọchịchị Chikun nke Kaduna steeti.
Ọ bụ onye na-arụgodu ọrụ dịka osote ọnụ na-ekwuru ndịagha na steeti ahụ bụ Lieutenant Musa Yahaya kwupụtara nke a n’otu ozi o wepụtara.
Dịka Musa Yahaya siri kwuo, ndịagha gbochiri ma nwụchie ndị ahụ a na-enyo enyo n’ụbọchị Wenezde 26 Juun 2024 oge ha ji ụgbọala akpagharị.
O kwukwara na ndị ahụ a na-enyo enyo kwajuru okporoigwe ndị ha zuru n’ohi n’ụgbọala trọọk abụọ tupu anwụchie ha.
N’oge a na-agba ha ajụjụ, ha kpuhere na ọ bụ otu nwoke gbara ọsọ aha ya bụ Alhaji Babawo dunyere ha ọrụ ahụ.
Ka osiladị, enyefeela ha n’aka ndịisi ụlọọrụ na-ahụ maka okporoigwe Naịjirịa bụ Nigeria Railway Corporation maka ime ezi nnyocha nakwa ịkpọpụ ha n’ụlọikpe.
Ụmụafọ Naịjirịa 103 e si mba Turkey gbaara ụgbọ nwamkpị erutela Abuja

Ebe foto si, NEMA/Facebook
Ụmụafọ Naịjirịa dị otu narị na atọ so na ndị a gbaara ụgbọ nwamkpị si na mba Turkey wụchiri n’ọdọụgbọelu dị n’Abuja n’ụbọchị Fraịde 28 Juun, 2024.
Ha batara na Naịjirịa mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asaa nke abalị Fraịde ahụ.
Dịka ha batara, ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbata gbata bụ National Emergency Management Agency (NEMA) na ogbo ha nke Civil Defence nabatara ha.
O doghi anya ma ndị a o mere mpụ na mba Turkey mere e ji chụlata ha.
Ndị a a chụlatara kọwara etu e si kpasị ha agwa ọjọọ nakwa ịkpa oke agbụrụ na mba ndị nọ na Europe.

Ebe foto si, NEMA/Facebook
Ha kwuru na ndị ọrụ nchekwa mba Turkey nwụchiri ma kpọchie ha karịrị ọnwa iri na otu (11months) tupu a gbaara ha ụgbọ nwamkpị.
Ha rịọrọ gọọmentị Naịjirịa ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ma napụtara ha ngwo ngwo ha ndị a kpachiri akpachi.
Onyeisi ụlọọrụ NEMA bụ Zubaida Umar gwara ndị a ka ha nabata ihe niile ha gabigara n’obi ọcha ma na-erube isi n’iwu.
Dịka e mechara ha nyocha ahụike na ihe ndị ọzọ, e nyere nri, tinyere ego ka ha were gbaa ụgbọala laghachị n’obodo ha dị iche iche.
Ụlọikpe Kenya ekwetala ka ezipụ ndịagha iji kwụsị ngagharịiwe

Ebe foto si, Reuters
Ụlọikpe ukwu dị na Kenya enyela nkwado ka e jiri ndịagha weghachi udo na ime ihe n’ezi usoro na mba ahụ.
Ọnọdụ a na-abịa dịka ndị uweojii na-apụghị ijikwata ndị ntorobịa nọọrọ kemgbe ọtụtụ ụbọchị na-eme ngagharịiwe megide ụtụisi ọhụrụ e webatara na mba ahụ.
Akụkọ kwuru na e gbuola ihe karịrị mmadụ iri abụọ na ngagharịiwe ahụ zuru Kenya ọnụ nke ndị nọ n’isi ya kachasị bụrụ ndị ntorobịa.
N’ụbọchị Tọzde 27 Juun 2024, a hụrụ ka ụgbọala ndịagha nọ na-agbagharị n’ogbe dị iche iche na Naịrobi ebe ndị uweojii gbapụrụ ikuku na-afụ ose n’anya iji kposaa ndị na-eme ngagharịiwe, bụ ndị yiri egwu iwuchi n’obi ọchịchị onyeisiala mba Kenya.
Otu onye ọkaiwu kwuru na izipụ ndịagha dị oke mkpa iji chekwaa akụrụngwa gọọmenti dị iche iche kama o nyere ndị ọchịchị mkpụrụ ụbọchị abụọ ikwupụta oge ọrụ ndịagha ahụ tinyekwara usoro ha ga-eji rụọ ọrụ ha.
Minimum wage: Ndị gọvanọ agaghị ekpebiri anyị ụgwọọnwa ha ga-akwụ - NLC

Ebe foto si, NLC/X
Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) akatọọla okwu ahụ a sị ndị gọvanọ kwuru na steeti ọbụla kwesịrị ikpebi ego ole ha ga-akwụ dịka ụgwọọnwa opekatampe na steeti ha dị iche iche.
Ndị otu ahụ kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024 n’ozi sitere n’aka onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi ha bụ Benson Upah.
Dịka Benson Upah siri kwuo, ụdị mkpebi dị etu ahụ bụ nke na-agba ụkwụ megide ebumnoobi e ji nabata ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa.
O kwukwara na ọ bụ ihe na-agba anyammiri na mgbe ụfọdụ gọọmenti na-ahụta ụgwọọnwa ndị ọrụ dịka ihe ọma a na-emere ha karịa ụgwọọrụ maka nrụsi ọrụ ike.
NLC gbara onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ume ka ọ hara ikwe ka ụfọdụ ndị gọvanọ na-ebughị ọdịmma Naịjirịa n’obi mee ya ka o chefuo ihe gbasara ụgwọọnwa obibi ndụ o kwere ndị ọrụ na nkwa.
Cheta na otu e hiwere maka iwepụta ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ kwupụtara puku naịra iri isii na abụọ (N62,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ebe ndị ọrụ gbara isi akwara sị na ha chọrọ narị puku naịra abụọ na iri ise (N250,000).
JAMB ewepụtala mpụtara ule mgbakwụnye e ji abanye Mahadum

Ebe foto si, JAMB/X
Ụlọọrụ na-ahazi ule e ji abanye mahadum bụ Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) ewepụtala mpụtara ule mgbakwụnye nke ụmụakwụkwọ lere n’ọnwa Juun 21 na 22 nke afọ 2024.
Ọnụ na-ekwuru ụlọorụ a bụ Fabian Benjamin kwuru nke a n’Abuja n’ụbọchị Fraịde.
Dịka o si kwuo, ụmụakwụkwọ dị 28,835 na-enwenwughi nyocha mgbe e lere ule a n’ọnwa ọle gara aga mechara lee nke mgbakwụnye a.
O kwuru na ụmụakwụkwọ so lee ule a bụ ndị a na-enyocha na ha mere nrụrụaka n’ule nke mbụ mana e nyere ha ohere nke abụọ.
O kwuru na ụlọọrụ a tinyere nchekwa tara ọchịchị n’oge a na-ele ule ahụ iji hụụ na nrụrụaka agaghị adị n’ule ahụ.
Benjamin gara n’ihu dọọ ụmụakwụkwọ lere ule a aka na ntị ka ha kwụsị ịchọ mgbakwụnye akara site n’aka ndị na-egwu chandum.
O kwuru na onye chọrọ hụụ mpụtara ule nke ya, ziga ozi a ‘UTMERESULT’ n’akara ekwentị ndị a 55019 maọbụ 66019. Ọ ga-eji akara ekwentị o jiri debanye aha n’ule ahụ.
Ọkụ agbaala ahịa Karu dị n’Abuja

Ndị na-azụ ahịa na Karu market dị n’Abuja ebeela akwa maka ngwaahịa ha lara n’iyi n’oge ọkụ tiwapụrụ n’otu ngalaba ya bụ ahịa.
Ọkụ ọgbụgba ahụ bụ nke a sịrị malitere mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Tọzde 27 Juun 2024 ruo mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere iri na abụọ nke etiti abalị.
Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ nwara ike ha ịhụ na agbanyụrụ ọkụ ahụ dịkwa ka ndị na-azụ ahịa n’ebe ahụ gbara mbọ ibupụta ngwaahịa ndị ha nwere ike n’ụlọahịa ha.
Ka osiladị, ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata n’isi obodo Naịjirịa bụ Abuja ekwuola na ọ bụ n’ọdọ ahịa nke iwu na-akwadoghị ka ọkụ ahụ tiwapụrụ.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Nkechi Isa kwupụtara nke a n’otu ozi o wepụtara n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, otu nwaanyị aha ya bụ Wenegieme kọwara na ọkụ ahụ malitere mgbe o jiiri ọkara gaa elekere isii nke mgbede mana ndị ọrụ mgbanyụọkụ e zitere enweghị ike banye n’ebe ahụ n’ihi na ọ dị n’azụ ọdọ ahịa ọhụrụ a ka na-arụ arụ.
“Ọ bụ ọdọ ahịa nke iwu na-akwadoghị arụnyere n’azụ ọdọ ahịa ọhụrụ a ka na-arụ arụ ka ọkụ ahụ gbara”.
“Anyị nwere ụgbọala na ndị ọrụ zuru oke mana anyị enweghị ike banye n’ime ahịa ahụ, nke a mere anyị jiri tiwaa mgbidi iji nwee ike banye ma gbanyụọ ya bụ ọkụ. Ọ bụ nke a mere anyị jiri gbuo oge ịgbanyụ ọkụ ahụ,” ka o kwuru.
Ọ sịrị na ọkụ ọgbụgba ahụ bibiri ngwaahịa ruru nde kwuru nde naịra mana enweghị mmadụ ọbụla tụfuru ndụ ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na amatabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ mana ndị ọrụ nchekwa na-eme nnyocha iji chọpụta nke ahụ.
Nguemo anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ

Ebe foto si, SNS
Onye na-agbaburu otu egwu bọọlụ Celtic n’etiti bụ Landry Nguemo anwụọla n’ihe mberede ụgbọala na mba Kameruun.
Ndị na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ na mba Kameruun kwupụtara n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024 na nwaamadị ahụ gbara afọ iri atọ na asatọ (38) nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ.
Ozi ahụ kwuru sị “otu Cameroonian Football Federation ka nụrụ akụkọ gbasara ọnwụ onye na-agbaburu otu egwu Indomitable Lion bụ Landry Nguemo, onye nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ.
“Nguemo, onye so na ndị ọkachasị akụ bọolụ n’otu egwu bọọlụ Kameruun malite n’afọ 2006 ruo 2014 ma bụrụkwa onye gbabuuru Girodins de Bordeaux. A ga-echeta ya maka ntụnyeoke ya niile n’egwuruegwu bọọlụ.
“FECAFOOT na-ezigara ezinaụlọ ya, ndị enyi ya na ndị niile egwuruegwu bọọlụ na-amasị ozi nkasiobi,” ka ozi ahụ kwuru.
Tinubu enyela iwu ka ewepụta N155bn maka ịzụta ihe oriri gburugburu Naịjirịa

Onyeisiala Naịjirịa bụ Ahmed Bola Tinubu enyela iwu ka azụta ma kesaa ihe oriri ruru otu narị ijeri naịra na iri ise na ise (N155bn) gburugburu Naịjirịa.
Tinubu nyere iwu ahụ n’Abuja oge otu na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa bụ National Economic Council (NEC) nwere nzukọ n’ụbọchị Tọzde 27 Juun 2024.
N’oge ha na-enwe nzukọ ahụ, onyeisiala gwara ndị gọvanọ ka ha gbakọta aka n’ọrụ iji mezuo ọchịchọ obi ndị ha na-achị.
N’ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Ajuri Ngelale tinyere aka na ya, Tinubu kwuru na ya dị nkwadobe ịrọpụta enyemaaka niile a chọrọ iji hụ na a napụtara ụmụafọ Naịjirịa n’ọnọdụ iheisiike.
Ọzọ dị ka ibe ya bụkwa na Onyeisiala enyela nkwado ka e kesaara ezinaụlọ otu narị puku (100,000) na steeti ọbụla puku naịra iri ise (N50,000) ruo ọnwa atọ.
Ndị uweojii e gbuola mmadụ 6 wakporo ụlọ ndị uweojii n’Ebonyi steeti

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị uweojii Ndị uweojii Ebonyi steeti e gbuola mmadụ 6 so na ndị oji egbe wakporo ụlọ ndị uweojii dị n’Ishieke nke steeti ahụ.
Ndị oji egbe ahụ wakporo ụlọ ndị uweojii ahụ n’abalị Wenezde 26 Juun 2024, bido gbawa mgbọ n’ikuku iji yi ndị mmadụ egwu.
Akụkọ kwuru na ndị uweojii na ndị oji egbe ahụ kwatara mgbọ tupu ndị ọrụ nchekwa ọzọ gbatara ha oso enyemaka.
Otu onye na-achọghị ka a kpọ aha ya, kwuru na ụgbọala abụọ gbara ọkụ site na nwakpo ahụ, ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ dị na Abakaliki, isi obodo Ebonyi steeti.
Ndị uweojii Ebonyi steeti ewepụtabeghị nkwupụta ọ bụla gbasara mwakpo ahụ.
Anyị amaghị ma ọ bụ kwado ịzụrụ onyeisiala ụgbọelu ọhụrụ - Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa

Ebe foto si, NASS/FACEBOOK
Nkọwa foto, Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa Ụlọomeiwu sineti Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha kwadoro ka a zụtara onyeisiala Bola Tinubu na osote ya Kashim Shettima ụgbọelu ọhụrụ.
Onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Godswill Akpabio kọwara nke a n'oge ọgbakọ ha mere ụbọchị Tọzde Juun 27, 2024..
Akpabio kwuru, sị, “Ọ dịghị mgbe anyị kwadoro ịzụụgbọelu ọbụla.”
"Enweghị oge onyeisiala nwetara anyị ozi akwụkwọkwuru na ya chọrọ ụgbọelu ọhụrụ, ọ bụ ndị na-achọghị agamnihu obodo na-efesa akụkọ ụgha ahụ."
Biden na Trump ga-enwe ndọrịtaụka n'abalị Tọzde

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na aka chịburu mba ahụ bụ Donald Trump ga-enwe ndọrịta ụka n'abalị taa dịka Amerịka na-akwa ntuliaka onyeisiala ọzọ.
Onyeisiala nọ n'ọkwa azọsabeghị onye nyefere ya ọkwa mbụ, a na-atụ anya na nd ọrịtaụka ahụ nke ụlọ ntaakụkọ CNN ga-ahazi ga-akpụ ọkụ n'ọnụ.
Trump ekwetaghị na Biden meriri ya na ntuliaka onyeisiala Amerịka mere n'afọ 2020 nkke mere ka ndị na-akwado ya wakpoo US Capitol. Trump jụkwara ịga mmemme idu iyi ọrụ e duru Biden.
Ndị Gọvanọ ekweela ndị ọrụ Bekee nkwa na ụgwọ ọnwa opekatampe dị mma na-abịa

Ebe foto si, Nigerian Governors Forum/Facebook
Otu jikọtara ndị Gọvanọ na Naịjirịa bụ Nigeria Governors Forum (NGF) ekwela ndị Naịjirịa nkwa na ezi ụgwọ ọnwa ga-apụta ihe site na mkparịtaụka dị n’etiti gọọmentị, ndị nwe ụlọọrụ na otu jikọtara ndị ọrụ Bekee.
Ndị gọvanọ kwuru nke a dịka ha mechara ọgbakọ n’Abuja n’ụbọchị Wenezde.
“Ndị gọvanọ ekwetela ka ha na ndị ọnụ na-eru n’okwu na-enwe mkparịtaụka iji hụụ na e nwere nkwekọrịta gbapụtara ihe, “ nke a dị n’akwụkwọ ozi ha wepụtara.
“Anyị ga na-etinye uchu na mkparịtaụka ahụ ma kwee nkwa na ezi ụgwọ ọnwa ga-esi na ya pụta.”
Onyeisi otu jikọtara ndị Gọvanọ a bụ Gọvanọ AbdulRahman AbdulRasaq nke Kwara Steeti tinyere aka n’akwụkwọ ozi ahụ.
Ndị gọvanọ a gara n’ihu tinye anya n’okwu ndị ọzọ metụtara Naịjirịa nke gụnyere nwogharị akụnaụba na ụtụisi.
Igbo ndị ọma e ji eje mba daalụ nụ ooo!
Obi dị anyị ụtọ na i hiri ụra ma teta ọfụma n'ụbọchị taa.
Ngwa buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.
ICC amaala onyeisi ndị uweojii ụka Alakụba Timbuktu ikpe maka mpụ agha

Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe mbaụwa bụ International Criminal Court (ICC) amaala Onyeisi ndị uweojii Alakụba Timbuktu ikpe maka mpụ agha.
al-Hassan ag Abdoul Aziz bụbụ onyeisi uweojii Islam na Timbuktu dịka ndị otu agha jihad Eal-Quarda na-akwado bụ Ansar Dine weghara mpaghara ahụ.
Hassan bụ onye ndị gọọmentị Mali nyefere n'aka ICC n'afọ 2018, dịka ndịagha Fransi nyechara Mali aka ịchụpụ ndịagha Jihad.
Dịka onyeisi ndị uweojii Ụka Alakụba, Abdoul Aziz hụrụ maka ntaraahụhụ ọjọọ a na-enye ndị mmadụ dịka igbubi mmadụ gụnyere ụmụaka aka maọbụ ịpịa ha ụtarị n'ọha
Ansar Dine so n'otu agha nnupuisi Jihad kpara ike n';Ugwu mba Mali.
E menyụọla 'obere ọkụ' ahụ gbara akụkụ ụlọọrụ Dangote Refinery

Ebe foto si, Screenshot
“Obere ọkụ” gbara akụkụ ụlọọrụ Dangote ebe a na-esi mmanụ agbidi dị na Legọs n’ụbọchị Wenezde.
Ndị ọrụ mgbanyụọkụ mere ngwa ngwa gbayụọ ọkụ ahụ.
N’ozu ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Anthony Chiejina wepụtara, o kwuru na ọkụ a gbara egbochighi ọrụ ịga n’ihu n’ụlọọrụ ahụ.
“onweghi ihe ịtụ egwu ọbụla dị, maka na ọrụ na-aga n’ihu, o nweghi onye ọrụ nwụrụ maọbụ merụrụ ahụ n’ụzọ ọbụla.” Ka o kwuru.
Ụlọọrụ a bụ nke ọnụego ya dị ijeri dọla iri abụọ nke onye nwe ya bụ ide ji ego Aliko Dangote malitere isipụta mmanụ n’ọnwa Disemba 2023.
Ọ malite isipụta nakwa ikesa mmanụ ụgbọala Diesel nakwa nke ụgbọelu nye ndị na-azụ ha ahịa dịka a na-atụ anya na nke ụgbọala n’etiti ọnwa Julaị.

Ebe foto si, Dangote Group
