You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Onyeisi obodo Chicago abịanyela aka n’akwụkwọ iwu iji gbochie Trump ịchụpụ ndị mbịarambịa

    Onyeisi obodo Chicago bụ Brandon Johnson abịanyela aka n’akwụkwọ iwu iji gbochie nchụpụ gọọmenti Onyeisiala mba Amerịka bụTrump na-achụpụ ndị mbịarambịa n'obodo ya.

    N’iwu ahụ, Johnson kwuru ka Trump na ndị ọrụ gọọmenti etiti kwụsị ịzite ndịagha Amerịka n'obodo ya.

    Johnson gara n’ihu kwuo ka ndị ọrụ mmanye iwu yiri ihe oyonyo n’ahụ ha ma jiri ihe ga-egosi ndị ha bụ dịka ọ kagburu ha iyi ihe mkpuchi ihu.

    Onye na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Gọọmenti 'White House' kọwara iwu a dị ka "ime ngosi ọha".

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Trump zigara ndịagha ruru puku abụọ na Washington DC ma yie egwu ịgbatị ha ruo Chicago.

    Akụkọ na-ekwu na Trump chọrọ itinyekwu ndị ọrụ mbata na ọpụpụ gọọmenti etiti n'obodo Chicago.

  2. Solomon Arase bụbu Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa anwụọla

    Onye bubu Onyeisi ndị uweojii na Naịjiria bụ Solomon Arase anwụọla ka ọ gbachara afọ iri isii na itolu (69).

    Akụkọ kwuru na ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ Cedar Crest dị n'Abuja n’ụbọchị Sọnde 31 Ọgọst, 2025.Ozi ọnwu ya dịka onyeisi ndị uweojii IGP Kayode Egbetokun si kwụọ rụrụ ya site n'aka nwa Arase bụ Solomon Osabohien.

    Ka Egbetokun gara ime nleta n'ezinaụlọ Arase n'Abuja, o tinyere ha aka n'obi ma kuo n'ihe ọma niile o mere ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

    Arase, onye bụ onyeisi ndị uweojii nke iri na asatọ (18) bụ onye Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjiria họpụtara n'ọkwa IGP n'ọnwa Eprelụ, 2015.

    Arase bụ onyeisioche ndị Police Service Commission n'afọ 2023 nke onye bụbu Onyeisiala Naịjiria nwụrụ anwụ Muhammadu Buhari wepụtara tupu Onyeisiala Tinubu ewepụ ya n’ọkwa ahụ n'afọ 2024.

    Arase bụ onye ọchịchị obodo Owan West n'Edo steeti. Ọ lara ezumike nka n’ọnwa Juun 21, 2016.

    The news of the passing of IGP Arase was officially communicated to IGP Kayode Egbetokun, through his first son, Mr Solomon Osabohien Arase jnr on Sunday.

  3. Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

    Ndị isiala mba Chaịna na Indịa enweela nkwekọrtịta inwe mmekọ. Nke a na-abịa dịka mba abụọ na-enwe esemokwu maka okeala n’ọtụtụ afọ gara aga.

    Onyeisiala Chaịna bụ Xi Jinping na Praịm Mịnịsta Indịa bụ Narendre Modi zutere onwe ha n’ọgbakọ Shanghai Cooperation Organization (SCO) na Tianjin. Nke a bụ njem mbụ Narendra na-eme na mba Chaịna n’ime afọ asaa gara aga.

    Xi gwara Modi na Chaịna na Indịa kwesiri ịkwụsị ịnụ ọgụ ma malite inwe mmekọ. N’aka nke ọzọ Modi kwuru na ohere dị maka mmekọ n’etiti mba abụọ ahụ.

    Onyeisiala Roshịa bụ Vladimiri Putin bịakwara ọgbakọ ahụ ndị isiala ruru 20 na-esonye na ya nke isiokwu a kpụ n’ọnụ bụ tarifu ọhụrụ Onyeisiala Trump manyere na mbubata si mba dị iche iche.

  4. Putin na Modi nọ na Chaịna maka ọgbakọ iji kpaa maka tarifu ọhụrụ Trump manyere na mbubata si Indịa

    Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin na Praịm Mịnịsta mba Indịa bụ Narendra Modi na ndị isiala iri abụọ ndị ọzọ awuchiela Chaịna maka ọgbakọ Shanghai Cooperation Organization (SCO).

    Ọgbakọ ahụ nke a na-eme na Tianjin na-abịa dịka ndịagha mere ihe ngosi na Beijing iji cheta afọ iri asatọ agha mbaụwa ‘World War II’ bịara na njedebe.

    Nke a bụ njem mbụ Modi na-eme na Chaịna kemgbe afọ asaa gara aga mana ya na Onyeisiala Xi nwere mkparịtaụka tupu ọgbakọ ahụ amalite ebe ọ gwara ya na mba Indịa dị njikere iwulite mmekọ ya na mba Chaịna.

    Ọgbakọ SCO a bụ nke ga-elebanye anya na tarifu ọhụrụ Onyeisiala Trump mba Amerịka manyere na mbubata si mba Indịa maka na ha na-azụ mmanụ agbidi mba Rọshịa.

    Mba iri gụnyere Pakịstan, Ịran na Belaru so n’ọgbakọ SCO nke Beijing na-akwado nakwa mba iri na isii ndị ọzọ na-atụle ihe ha na-eme.

    Ọgbakọ ga-enye ndị isiala ndị a ohere iji kwuputa uche ha banyere ihe ụfọdụ na-emetụta mba ha dị iche iche mana akụkọ kwuru na otu ihe nọ n’isi okwu ọgbakọ a bụ tarifu ọhụrụ Trump manyere na mba dị iche iche.

  5. Ọtụtụ ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News taa bụ Sọnde 31 Ọgọst, 2025 ma bụrụ ahị Afọ.

    Ọfọ anyị bụ ka ihe ọma zute gị taa nakwa n'izuụka ọhụrụ a anyị banyere.

    Sonyere akara soshal midia niile maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Ndewo.

  6. Ebonyi steeti: Ike ji bụ emume anyị ji echeta udo na mkpochapụ oke agụụ - Ndị Edda

    Ndị obodo a na-akpọ Edda n’Ebonyi steeti ekwuola na emume ike ji ha bụ mmemme ha ji echeta udo nakwa mkpochapụ oke agụụ n’obodo ha.

    Ha sịkwa na ọ bụ emume ahụ ka ha ji echeta mbido afọ ọhụrụ n’Edda dịka eze ọdịnaala Ekoli-Edda bụ John Igwe si kọwaa.

    N’okwu ya “mmemme a abụrụla ihe anyị ji echeta ị dị n’otu, nakwa udo n’obodo anyị”.

    N’ozi okene Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Ogbonna Nwifuru zigara ndị Edda ka ọ gwara ha jisie ike n’omume ha dịka ndị e jiri ịdị n’otu mara.

    Ndị Edda jiri ohere mmemme ahụ gọsi ihe ha kọrọ n’ubi dịka ji ma gosikwa udiri egwu e jiri mara obodo ha.

  7. Ụmụaka atọ na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ na mwakpo Rọshịa na Zaporizhzhia

    Otu onye anwụọla dịka ihe ruru mmadụ iri abụọ na asatọ merụrụ ahụ mgbe Rọshịa wakporo mpaghara Zaporizhzhia dị na ndịda Yukren.

    Aka na-achi ebe ahụ ihe a mere bụ Ivan Fedorov sị na ụmụntakịrị nwoke abụọ na otu nwaanyị sọ na ndị merụrụ ahụ na ogbunigwe Rọshịa tụrụ na ụlọ elụ nwere ogogo ise.

    Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky na-ebo Rọshịa ebubo iji “oge e nyere ka e jiri kwado nzukọ nwereike iweta udo ma kwụsị agha na-awakpo Yukren.”

    N'abalị, e zubere ịwakpo mpaghara Dnipropetrovsk dị n'etiti Yukren, ebe ndị ọrụ nchekwa Rọshịa na-ekwu na o gbochiri duronu iri asatọ na isii nke si Yukren.

  8. Mba Amerịka egbochiela onye ndu Palestine ịga nzukọ otu mba ụwa na New York

    Ngalaba Steeti nke mba Amerịka kwuru na e gbochiela Onyeisiala mba Palestine bụ Mahmoud Abbas ịga ogbakọ nke ngalaba otu mba ụwa bụ United Nations General Assembly a ga-eme na New York n'ọnwa Septemba dịka a kagburu akwụkwọ njem visa ya na ndị ọrụ gọọmenti ruru iri asatọ.

    Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio tara Palestine ụta maka imebi atụmatụ inweta udo nakwa ịchọ ka ndị mba ụwa nabata ha dịka mba kwụrụ onwe ya.

    Mkpebi a, nke Izrel nabatara, bụ ihe a na-adịghị ahụkebe n'ihi na a na-atụ anya na Amerịka ga-enyeaka ịhụ na njem ndị isi mba niile na-achọ ịga n'isi ụlọọrụ UN bịara na mmezu.

    Ọzọ, mmachibido a na-abịa dịka mba Fransị na-agba mbọ ịhụ na mba ụwa nabatara mba Palestine dịka mba kwụrụ onwe ya na ogbakọ ahụ a ga-enwe - atụmatụ nke ọchịchị Donald Trump megidere.

  9. Ụlọikpe Amerịka ekwuola na iwu akwadoghị ọtụtụ tarifu Trump

    Ụlọikpe mkpegharị na mba Amerịka ekwuola na iwu akwadoghị ọtụtụ tarifu Onyeisiala Donald Trump tinyere na mbubata si mba ofesi dị iche iche abata Amerịka.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ikike itinye tarifu maọbụ ego ole a ga-akwụ anọghị n'aka Onyeisiala kama ọ bụ ikike dịrị ụlọomeiwu Amerịka.

    Mkpebi ụlọikpe a ga-emetụta ụtụisi nkwụghachi ụgwọ nke Onyeisiala Trump tinyere na ngwaahịa si ọtụtụ mba gburugburu ụwa, yana tarifu ndị ọzọ ọ manyere na mba Chaịna, Meziko na Kanada.

    Ka ọ dị ugbua, mkpebi a agaghị ebido ruo n'abalị iri na anọ nke ọnwa Ọktoba 2025 iji nye gọọmenti Trump oghere ịgwa ụlọikpe kachasị elu ka ha bido ikpe ahụ.

    Mana Trump katọrọ ụlọikpe mkpegharị na mkpebi ya n'akara Truth Social, na-ekwu: "Ọ bụrụ na ekwe, na mkpebi a ga-ebibi mba Amerịka n'ezie."

  10. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 30 Ọgọst, 2025.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ maka akụkọ ndị ọzọ na ihe onyonyo vidiyo.

    Biko, nọnyere anyị!

  11. Zelensky ajụla atụmatụ ikepụta mpaghara nchekwa iji kwụsị agha Yukren

    Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky ajụla atụmatụ ikepụta mpaghara nchekwa n’etiti ndịagha Yukren na Rọshịa iji nwee nkwekọrịta udo.

    O kwuru na ikepụta mpaghara nchekwa egosipụtaghị eziokwu dị n’ọnọdụ agha ọgbara ọhụrụ.

    "Ọ bụ naanị ndị na-aghọtaghị ọnọdụ teknụzụ nke agha taa na-atụ aro mpaghara nchekwa," ọ gwara ndị ntaakụkọ na Fraịde 29 Ọgọst 2025.

    Nkwupụta ya na-abịa dịka akụkọ na-egosi na ndị isi Yurop na-atụle mpaghara nchekwa 40km (25-maịl) iji kwụsị ọgụ ma ọ bụ nwee nkwekọrịta ogologo oge.

    Ka ọ dị ugbua, agha Yukren abanyela n'agha nke teknụzụ eji duronu na-alụ.

    Mana Onyeisiala Zelensky kwuru na enweela mpaghara n'akụkụ abụọ ebe nnukwu ogbunigwe na-enweghị ike ịrụ ọrụ n'ihi ihe egwu nke ọkụ duronu.

  12. A chọtala ozu ndị Izrel eji eji na Gaza – Ndịagha Izrel

    Ndịagha Izrel kwuru na ha achọtala ozu onye Izrel eji eji Ilan Weiss mgbe ha na-arụ ọrụ n’okeala Gaza.

    E gburu Weiss dị afọ iri ise na isii mgbe Hamas wakporo ndịda Izrel n’ọnwa Ọktoba 2023.

    Ndịagha nchekwa Izrel (IDF) kwuru na ha chọtakwara ozu onye nke abụọ eji eji, onye a na-ewepụtabeghị njirimara ya.

    Cheta na mba Izrel mere nnukwu mwakpo na Gaza dịka e gburu mmadụ otu puku na narị abụọ ma kpọrọ mmadụ narị abụọ na iri ise na otu laghachi na mpaghara ahụ dịka ndị eji eji.

  13. E nwetala ụgbọala e zuru n’ohi ma jide ndị a na-enyo enyo zuru ya n’Abia steeti

    Ndị uweojii n’Abia steeti enwetela ụgbọala Toyota Highlander ha sị na e zuru n’ohi n’Akwa Ibom steeti kamgbe afọ 2022.

    Ụgbọala Toyota Highlander SUV ahụ nwere akara BBR667RM.

    Ndị uweojii kwuru na e zuru ya n’ Uyo, Akwa Ibom steeti ma bubata ya n’Abia steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abia steeti bụ Maureen Chinaka kwuru na ọ bụ eziokwu na ha wetere ụgbọala ahụ ma jidekwa ndị a na-enyoenyo na aka ha dị n’oshi ahụ.

    Ọ sị na ndị e jidere bụ nwoke onye na-eme ọgwụ ọdịnaala n’Umuchu, n’ime okpuruọchịchị Aguata dị n’Anambra steeti a na-akpọ Emeka Edwin Chukwuma.

    Ọ sị na ndị uweojii akpọọla onye nwe ụgbọala ahụ ka ọ bịa nwete akwụkwọ ọ jiri zụta ya ma gosipụta na ọ bụ nke ya n’eziokwu.

  14. Ndị njem 49 anwụọla dịka ugbọmmiri na-aga Canary Islands kpuru

    Opekatampe mmadụ iri anọ na itoolu nwụrụ ebe otu narị ndị ọzọ na-efu efu dịka ụgbọmmiri kpuru n'akụkụ ụsọ oke osimiri Mauritania, ndị na-eche nche n'osimiri dị n’ugwu ọdịda anyanwụ mba Afrịka kwuru.

    Ka ọ dị ugbua, a napụtala mmadụ iri na asaa ma na-aga n'ihu na-achọ ndị njem ndị ọzọ nọ n'ụgbọ epeepe na-aga Canary Island nke Spen.

    Dịka ndị lanarịrịnụ si kwuo, ụgbọmmiri ahụ hapụrụ Gambia abalị isii tupu ihe mberede ahụ mere n’ụbọchị Tuzde, bu ihe ruru mmadụ otu narị na iri isii n'ụgbọ ahụ, ọkachasị ndị Gambia na Senegal.

    Cheta na osimiri Atlantic aghọwo ụzọ na-esiwanye ike nke ndị Afrịka na-akwaga mba ọzọ ọkacha ndị na-agbalị iru Yurop na-esi agafe.

  15. Ndekọ 6 mmadụ kwesiri ịmara maka Jose Mourinho

    Kamgbe otu egwu bọọlụ Fenerbache nke mba Tọkị kwuru na ha achụọla Jose Mourinho n’ọrụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu okwu banyere ihe mere e ji anapụ ya ọrụ ugboro ugboro.

    Mana ọsịsa ajụjụ ahụ bụ naanị ndị napụrụ Mourinho ọrụ nakwa Mourinho ga-aza ya.

    N’ebe niile ọ gara, ndekọ ndị a so na nke a kpụ n’ọnụ:

    • A napụrụ Mourinho ọrụ ya na Fenerbache mgbe ndị Benfica meriri ha ma kwụsị ha iso gbaa asọmpị Champions League nke afọ a.
    • Mourinho arụọla ọrụ n’otu egwu bọọlụ iri.
    • Ọ rụrụ ọrụ na Roma afọ atọ ebe o si gaa Fenerbache mana o butere ndị Roma iko Conference League n’afọ 2022 bụ iko Yurop nke mbụ otu egwu bọọlụ ahụ na-ebute.
    • Ugboro abụọ Mourinho rụrụ ọrụ na Chelsea ka ọ butere iko Premier League atọ.
    • O jirila otu egwu bọọlụ Inter Milan na Porto buru iko Champions league.
    • N’afọ 2017 ka Mourinho jiri Manchester United bute iko Europa nke mbụ ha na-ebute ya.
  16. Ụlọikpe ewepụla Praịm Minista Thailand n'ọkwa n’ihi oku ekwentị ya na onyendu Kambodịa

    Ụlọikpe na-ahụ maka iwu na Thailand achụọla Paetongtarn Shinawatra n'ọrụ n’ihi oku ekwentị ya na onye bụbu onye ndu Kambodia Hun Sen, nke ọ kpọrọ ya "nwanne nna m" ma katọọ ọchịagha ndịagha Thai.

    N’aka nke ọzọ, Shinawatra kwuru na ya nabatara mkpebi ụlọikpe ahụ ma kwuo na ya ga-enwe ezi obi na-ịrụ ọrụ maka ndị Thai.

    Ka ọ dị ugbua, Osote Praịm Minista ga-anọchianya Paetongtarn tupu mba ahụ enwee ntuliaka iji hụpụta onye ga-abụ Praịm Minista.

    Paetongtarn bụ onye ndu nke ise nke ụlọikpe chụpụrụ n’ọkwa kemgbe 2008, na-etinye mba ahụ n'ọnọdụ amaghị ama.

  17. Ndị mbụ a chụpụrụ n’Amerịka erutela Rwanda

    Mmadụ asaa n’ime mmadụ narị abụọ na iri ise a gbaara ụgbọ nwamkpi n’Amerịka erutela mba Rụwanda.

    A tụrụ anya na mba Afrịka ga-anabata mmadụ narị abụọ na iri ise ahụ mba Amerịka chụpụrụ site na nkwekọrịta dị n’etiti ha na ọchịchị Donald Trump.

    “Mmadụ asaa ndị so n’agba nke mbụ n’ime ndị mbịarambịa e mere nnyocha bịaruru Rụwanda n’etiti ọnwa Ọgọst,” ka ọnụ na-ekwuru gọọmenti Rụwanda bụ Yolande Makolo kwuru.

    O nyeghị nkọwa gbasara mba ha si, kama ọ sịrị na anọ n’ime ha ga-aga n’ihu nọrọ na Rụwanda ebe atọ ndị nke ọzọ kwuru na ha ga-alaghachi mba ha.

    Otu ndị na-ahụ maka ikike mmadụ adọọla aka na ntị na ụdị ọchụchụ ahụ nwereike imegide iwu mbaụwa ma ọ bụrụ na a chụgaa ụmụ mmadụ na mba ndị nwereike ịta ha ahụhụ maọbụ metọọ ha.

    Trump elekwasala anya n’atụmatụ ga-achụpụ ndị mmadụ n’igwe, iji kpochapụ ndị mbịarambịa a na-edebanyeghị aha ha n’Amerịka.

    Ka ọ dị ugbua, mba iri na abụọ ekwetela ịnabata ndị mbịarambịa si mba ndị ọzọ a chụpụrụ n’Amerịka.

  18. A gbaala anwụrụ anyammiri dịka ọtụtụ ndị Indonesia na-eme ngagharịiwe na Jakarta

    Ndị uweojii agbaala igwe mmadụ na-eme ngagharịiwe anwụrụ anyammiri oge ha gbara ogige n’isi ụlọọrụ ngalaba ndị uweojii pụrụiche bụ Brimob dị na Jakarta.

    N’ebe ọzọ dị n’isi obodo mba Indonesia, ọgbaaghara dara n’ihu isi ụlọọrụ ndị uweojii Polda Metro Jaya, dịka ndị na-eme ngagharịiwe na-amụbawanye.

    Onye niile chị obi n’aka n’ihi nwaokroọbịa na-akwọ ụgbọala nwụrụ oge ụgbọala ndị uweojii Brimob rịrị ya elu n’ebe a na-eme ngagharịiwe n’abalị Tọzde.

    Ngagharịiwe ezuola Jakarta ahụ n’ime izuụka a n’ihi ndị omeiwu a na-ebo ebubo ịnara akatamkpo ego dịka ụgwọọnwa.

    Ọtụtụ n’ime ngagharịiwe ahụ jupụtara na tigbuo zọgbuo, dịka ndị uweojii ji osisi na ihe mkpuchi tụrụ anwụrụ anyammiri iji kwụsị ndị na-eme ngagharịiwe ịtụ ha okwute na ihe ndị na-agba agba.

    Ngagharịiwe ahụ bụ nnwale gbara ọkpụrụkpụ maka Onyeisiala Prabowo Subianto, onye ndị na-eme ngagharịiwe kwuru na ọ ga-elebarịrị anya n’ihe gbasara anamachọọrụ, obere ụgwọọnwa, ụtụisi dị elu na ajọ ọnọdụ obibi ndụ.

  19. Onye uweojii anwụọla oge ya na onye Civil Defence na-ese okwu n'Ebonyi steeti

    Otu onye uweojii anwụọla dịka ndị ọzọ merụrụ ahụ oge ọgbaghara dara n'etiti ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa obodo bụ Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) n'obodo Amaeze dị n'okpuru ọchịchị Ivo nke Ebonyi steeti.

    E kwuru na onye uweojii ahụ nwụrụ anwụ a matara aha ya dịka Shedrack nwereike ịbụ onye a gbagburu na-amaghị ama.

    Onyeisioche okpuru ọchịchị Ivo bụ Emmanuel Ajah si na onye ndu ndị uweojii n'Ivo gwara ya na ọgụ ahụ dapụtara n’etiti ndị orụ nchekwa abụọ ahụ.

    Akụkọ kwuru na esemokwu dapụtara mgbe ụgbọala bu ndị uweojii ruru iri atọ gbabichiri ndị ọrụ NSCDC ihu ma bido gbawa ha egbe, nke mere otu onye uweojii ji nwụọ.

    Ọnu na-ekwuchitere ndi uweojii n'Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu kwuru na nsogbu a mere n'ụbọchị Wenezde 27 Ọgọst, 2025 mgbe ndị uweojii gara ijide ndị a na-enyo enyo, mana mgbe ha rutere ebe ahụ onye ndu ndị NSCDC ndị uweojii bịara ịjide ndị otu ya jụrụ ka a nwuchie ha.

    "N’agbanyeghị na ndị ọrụ NSCDC ndi uweojii bịara ijide gwara onye ndu ha ka ọ hapụ ka ha soro ndị uweojii gawa, ọ jụrụ ma gbaa mbọ ịnapụ otu onye uweojii egbe ya n'ike".

    "Dịka ha na-adọ onwe ha, mgbọ ebe gbapụrụ ma tụọ otu onye uweojii mere ọ ji merụọ nnukwu ahụ ma mechaa nwụọ," ka ozi ahụ kwuru.

  20. Onye wakporo ụlọakwụkwọ na Minneapolis hụrụ igbu ụmụaka n’anya – Ndị ọchịchị

    Ndị na-eme nnyocha achọpụtala na onye wakporo ụlọakwụkwọ ma kwaa ụmụaka mgbọ oge ha na-ekpe ekpere n’ụlọụka dị na Minneapolis “nwere nnukwu ihụnanya n’igbu ụmụaka”.

    Robin Westman, onye gburu ụmụaka abụọ ma merụọ iri na asatọ ndị ọzọ ahụ gosiri na o nweghị ebumnobi ọbụla.

    Nke a bụ dịka Onyeisi ndị uweojii na Minneapolis bụ Brian O’Hara si kwupụta.

    Onye ahụ mere mwakpo “gosiri na ọ dịka ọ kpọrọ anyị niile asị,” ka Onyeisi ndị uweojii ahụ kwuru n’ụbọchị Tọzde.

    Ọ gbakwunyere sị: “Karịsịa ihe niile, nwoke ahụ chọrọ igbu ụmụaka”.

    Ezinaụlọ ụmụaka ndị ahụ achọpụtala ma kọwaa ha dịka Fletcher Merkel dị afọ asatọ na Harper Moyski dị afọ iri.