Ezemmụọ gbara afọ 63 alụọla nwatanwaanyị gbara afọ 12 na Ghana

Otu Ezemmụọ gbara afọ 63 akpaliela nnukwu iwe na ọnụma na mba Ghana dịka ọ lụrụ nwatanwaanyị gbara afọ 12.
Ezemmụọ ahụ bụ Nuumo Borketey Laweh Tsuru XXXIII haziri mmemme ịgba nkwụ nwatanwaanyị ahụ n’ụbọchị Satọde 30 Maachị 2024.
Dịka ndị mmadụ na-akatọ omume ahụ, ndị ndu obodo ekwuola na ndị mmadụ aghọtaghị ọdịnaala na ọdịbendị ha.
N’iwu mba Ghana, nwoke na nwaanyị kwesịrị ị dị opekata mpe afọ 18 tupu ha abanye na alụmdinanwunye ebe omume ịlụnye nwantakịrị di belatara mana ọ na-agakwa n’ihu.
Ihe onyonyoo nnukwu mmemme ahụ ahaziri n’ụbọchị Satọde nke ọtụtụ ndị obodo ahụ fesara n’ọbaozi ‘social media’ akpaliela nkatọ site n’aka ọtụtụ ụmụafọ Ghana.
N’oge mmemme ịgba nkwụ ahụ, a nụrụ ka ụmụnwaanyị ji olu obodo ha gwa nwatanwaanyị ahụ ka ọ jikwaa onwe ya n’ụzọ ọ ga-esi dọọ di ya ụsa.
A nụkwara ka ha na-enye ya ndụmọdụ ka ọ dị njikere ịrụ ọrụ ya dịka nwunye. Ha sịkwara ya were isiọma ha zụtaara ya kpalite mmụọ di ya inwe mmekọ nwoke na nwaanyị.
Ndị nkatọ akpọọla oku ka ndị nọ n’isi ọchịchị kposaa agbamaakwụkwọ ahụ ma nyochaa Maazị Tsuru.
Ndị ndu obodo Ezemmụọ ahụ na ya bụ nwatanwaanyị bụ Nungua akatọọla ndị na-agba ụkwụ megide agbamaakwụkwọ ahụ ma kwuo na nkatọ ndị ahụ “bụ n’ihi amaghị ihe.”
Otu onye ndu obodo bụ Nii Bortey Kofi Frankwa II kwuru n’ụbọchị Sọnde 31 Maachị 2024 na okenaọrụ nwatanwaanyị ahụ dịka nwunye Ezemmụọ “bụ naanị maka ọdịnaala na ọdịbendị.”
Ọ gbakwunyere na nwatanwaanyị ahụ malitere njem ya ị bụ nwunye Ezemmụọ kemgbe afọ isii gara aga mana usoro njem ahụ akụnyeghị ụkwụ n’agụmaakwụkwọ ya.
Ozi sitere n’aka ụlọọrụ mgbasaozi e nwere na mba ahụ sịrị na atụrụ anya na nwatanwaanyị ahụ ga-agabiga mmemme nsacha ọdịnaala nke ugbo abụọ ya iji kwadoo onwe ya maka okenaọrụ ọhụrụ ya dịka nwunye Ezemmụọ. Mmemme ahụ ga-akwadokwa ya maka okenaọrụ ya n’ezinaụlọ, dịka ịmụ nwa.
