You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkpalite ọgbaghara na Capitol

Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere

  1. Daalụ maka isonyere anyị

    Ndewonu ụmụ Igbo.

    N'ebe a ka anyị ga-apịachi ihu akwụkwọ akụkọ nke a maka ọnwa Ọgọst.

    Sonyere anyị maka akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Septemba 2023.

    Daalụ.

  2. A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ọgbaghara Capitol

    Otu ụlọikpe na mba Amerịka atụọla onyeisi otu kpọrọ onwe ha 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkaplite ọgbaghara n'obi gọọmentị mba Amerịka bụ Capitol.

    Joe Biggs bụbu onye agha mba Amerịka so na ndị kpara nkata ịwakpo isi ụlọọrụ ahụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

    Mgbe a na-ekpe ya ikpe, Biggs rịọrọ mgbaghara ma kwuo na ọ chegharịala n'ihe ndị o kpaliteburu mbụ.

    Nga a a tụrụ ya pere mpe karịa afọ 33 bụ nke ndị ọkaiwu gọọmentị na-achọ ka enye ya.

    A tụkwara onye otu Proud Boy ọzọ bụ Zachary Rehl nga afọ 15 maka ebubo ịkpa nkata dị egwu.

    Ihe onyonyo gosiri Rehl ebe ọ na-agba ndị uweojii na-echekwa Capitol ahụ kemịkalụ mgbe ọgbaghara ahụ na-aga n'ihu.

  3. Trump agwala ụlọikpe na aka ya dị ọcha n'ebubo nrụrụaka ntuliaka na Georgia

    Donald Trump bụbu onyeisiala mba Amerịka ekwuola na aka ya dị ocha n'ebubo nrụrụaka na ntuliaka e boro ya na steeti Georgia.

    A na-ebo Trump na mmadụ 18 ọzọ ebubo na ha nwara iji ụzọ aghụghọ megharịa mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke steeti Georgia n'afọ 2020.

    O kwuola ugboro ugboro na ebubo ahụ enweghị isi kama ha bụ ihe e ji chọọ imetọ aha ya dịka ntuliaka ọzọ na-abịa n'afọ 2024.

    Cheta na Trump kwuru na ya ga-azọkwa ọkwa onyeisiala Amerịka na 2024.

    N'akwụkwọ ụlọikpe nke e wepụtara n'ụbọchị Tọzde, nke Trump binyere aka na ya, o kwuru na ya achọghị ịbịa n'ụlọikpe n'ụbọchị ikpe, ma kwukwaa na ya ghọtara kpọmkwem mpụtara mkpebi ahụ.

    Na mbido izuụka a, mmadụ atọ ọzọ n'ime ndị e boro ha na Trump ebubo a gwakwara ụlọikpe na aka ha dị ọcha.

    Mmadụ atọ a bụ Ray Stallings Smith bụ ọkaiwu Trump, Sidney Powell, na otu onye ama ama bụ Trevian Kutti.

  4. Etu ndị uweojii si jichie ndị ohi anọ na-awakpo ụlọahịa ndị mmadụ n'Anambra?

    Ndị uweojii Anambra Steeti ejidela ụmụnwoke anọ ndị ha sị bụ ndị ohi na-awakpo ụlọahịa ndị mmadụ na-ezukọrọ ngwaahịa ha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Ọgọst ka ha wakporo ogige ebe ndị ohi ahụ na-ezo n'obodo Ogidi, Anambra Steeti, ma jide ha.

    "Anyị jidere ụmụnwoke anọ, ha anọ bụ ndị Ebonyi steeti, ma sakwaa asịsa etu ha si awakpo ụlọahịa dị icheiche ma na-ezu ohi," Ikenga kwuru.

    "Anyị hụrụ ọtụtụ ihe ha zuru n'ohi nke gụnyere: ọgbatumtum abụọ, nnukwu igwe na-enye ọkụ abụọ, otu 'wheelbarrow', otu nnukwu igwe njụoyi, akpa osikapa atọ, na ụfọdụ ihe e ji ebe igwe."

    Ikenga kwuru na ndi ohi ahụ sara asịsa na ọ bụ ha wakporo otu ụlọahịa dị na Nanka, n'okpuru ọchịchị Orumba South, bụ ebe ha zuru ihe niile ahụ.

    O kwuru na a ga-enyeghachi ihe niile ahụ n'aka ndị nwe ya ma e mechaa nnyocha.

  5. Nkịta atapụla nwaanyị di ime nwa n’afọ, tagbuo nwa ya ọzọ dị afọ ise

    Nkịta Oyibo abụọ atagbuola nwatakịrị nwaanyị gbara afọ ise, ma rie nwa nne nwata ahụ bu n’afọ.

    Ọdachi a dapụtara n’ụbọchị Tọzde n’Oshogbo dị n’Ọsụn Steeti.

    Ndị uweojii Osun steeti kwuru na ya bụ akụkọ bụ eziokwu ma kwụọ na ha na-achọ onye nwe nkịta abụọ ahụ.

    Akụkọ kwuru na nwaanyị ahụ dị ime a kpọrọ 'Nne Basira' kpọ nwa ya nwaanyị na-agara onwe ya, zute nkịta abụọ ahụ, egwu bịara ya, o were kwọrọ nwa ya nwaanyị ahụ dị afọ ise na-azụ iji chekwaa ya mana nkịta ndị ahụ napụrụ ya nwata ahụ n’azụ ya malite tawa ya.

    Dịka nwaanyị ahụ bidoro ịzọ nwa ya n’aka ụmụ nkịta ahụ.

    Otu onye nọ ebe ihe mere gwara ụlọntakụkọ Nation sị, Iya Basira mụkworo nwa o bu n’afọ dịka ọ na-alụso ụmụ nkịta ahụ ọgụ iji zọọ nwa ya nwaanyị.”

    O sịrị, “Ka ọ na-eme nke a, nkịta ahụ riri nwa ọ mukworo.”

    “Tupu ndị mmadụ agbatara ha ọsọ enyemaka, nkịta abụọ ahụ eriwela nwaa ya nwaanyị."

    Ka ọ dị ugbua, e bugala nwaanyị ahụ n'ụlọọgwụ akpọghị aha ya maka nleta.

  6. Ụlọ ebe ọkụ gbara na Johannesburg ekwesịghị ka mmadụ biri n'ime ya

    Ihe mberede ọkụ ọgbụgba nke mere n’otu ụlọ ogogo ise na mpaghara Johannesburg nke mba South Africa abụrụla otu n’ime ihe mberede ọkụ ọgbụgba kacha njọ na mba ahụ.

    Ndị ọchịchị mpaghara ahụ kwuru na tupu oge a, ha ekwupụtala na ụlọ ahụ adịghị mma maka mmadụ ibi na ya.

    Mana ụfọdụ ndị ekperima weghaara ụlọ ahụ ma na-etinye ndị mbịarambịara n’ime ya na-anapụ ha nnukwu ego maka otu ọnụụlọ.

    Ụlọ ndị dị etu ahụ anaghị enwe mmiri ọgbụgba n’ime ha, ma bụrụkwa nke ọkụ ọgbụgba nwereike ịmalite n’ime ha n’ihi etu e si etinye ọkụ latrik aghara aghara n’ime ha na-esoghị usoro kwesịrị ekwesị.

    ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ gbatagbata nke Johannesburg bụ Robert Mulaudzi gwara ndị ntaakụkọ na ahụtụbeghị ụdị ihe ya hụrụ n’ime ụlọ ahụ kamgbe afọ 22 ya malitere ọrụ dịka onye enyemaka.

    Ugbua mmadụ 74 ka a ma nwụrụla n’ọkụ ahụ dịka ndị ọrụ gbatagbata ka nọ ọrụ n’ebe ahụ.

  7. Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede ọkụ ọgbụgba na Johannesburg eruola 73

    Ndị ọrụ gbatagbata 'Johannesburg Emergency Management Services' ekwuola na ọnụọgụgụ ndị a hụrụla nwụrụ n'ihe mberede ọkụ ọgbụgba mere ebe ahụ n'ime abalị ụbọchị Wenezde.

    Mmadụ 52 ka a zọpụtarala n'ime ụlọ ahụ na ndụ, mana ha nwere mmerụahụ dị icheiche, ụfọdụ n'ime ha merụrụ ahụ dịka ha si na windo mapụ.

    Ndị ọrụ gbatagbata ka na-aga n'ihu ịchọ nakwa ịzọpụta ndị tọrọ atọ n'ụlọ ahụ.

  8. Etu mmadụ 64 si laa n'iyi n'ihe mberede ọkụ ọgbụgba na Johannesburg

    Ihe ruru mmadụ 64 alaala mmụọ n'ihe mberede ọkụ ọgbụgba n'ụlọelu ogogo ise na mpaghara Johannesburg nke mba Suth Afrịka n'ụbọchị Wenezde.

    Ihe karịrị mmadụ 40 merụkwara ahụ n'ọdachi a dịka ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ ịzọpụta ndị mmadụ.

    Ndị ọchịchị Johannesburg kwuru na ha amatabeghị ihe kpatara ọkụ a.

    Ọtụtụ ndị bi n'ụlọ ahụ bụ ndị mbịarambịara nọ na-enweghị akwụkwọ ikike ịnọ na mba ahụ nke a na-akpọ 'illegal immigrants' na bekee.

    Foto dị icheiche e tinyere na social media gosiri ọtụtụ ozu mmadụ a dọbara n'ala ma kpuchie ha.

    Ọtụtụ ndị South Afrịka na soshal midia akatọọla mwakpo ịkpa oke agbụrụ ụfọdụ ndị mmadụ na-awakpo ụfọdụ ndị ọkụ ọgbụgba ahụ metụtara.

    Otu onye ọrụ gbatagbata gwara ndị ntaakụkọ na ya ahụbeghị ụdị ọkụ ọgbụgba dị otu a kamgbe afọ 22 ọ rụrụla ọrụ.

    Ụlọ ebe ọkụ a gbara bụ ụlọ ochie dịka ebe a gbahapụrụ agbahapụ, mana ndị mmadụ bi n'ime ya.

  9. Ụtụtụ ọma

    Ụnụ asaala chi ụmụ Igbo.

    Daalụ dịka ị na-esonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Ka anyị malite.

  10. Ndị uweojii anọchiela isi ụlọọrụ otu NURTW n'Abuja

    Onyeisi ndị uweojii nke mpaghara FCT bụ Haruna Garba enyela ndị ọrụ ya iwu ka ha nọchie n'ogige isi ụlọọrụ nke otu 'National Union of Road Transport Workers' (NURTW), ngalaba nke Abuja, dịka ndị uweojii kwuru na enwere ọgbaaghara nke nwereike ibute nkwafu ọbara.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii FCT bụ Josephine Adeh kwuru na ọ bụ ndọrọndọrọ ọchịchị dị n'etiti ndị isi NURTW abụọ bụ Tajudeen Baruwa na Basiru Agbede butere ọgbaaghara ahụ.

    Adeh kwuru na ọ bụ Joe Ajaero, onyeisi otu jikọrọ ndịọrụ na NAịjirịa bụ 'Nigeria labour Congress', wetara mkpesa gbasara ọgbaaghara a, dịka o kwuru na e nwere ndị na-achọ ịchutu ndị isi otu NURTW bụ ndị a họpụtara n'usoro ntuliaka doro anya.

    "Ọ dị mkpa ikwupụta na ọrụ ndị uweojii n'ọgbaaghara dị otu a bụ ịgba mbọ hụ na e meziri esemokwu na nghọtahie niile n'ụzọ udo, ma gbochie ọgbaaghara na nkwafu ọbara n'ụdị ọbụla," Josephine Adeh kwuru.

    "Ndị uweojii agaghị agbachi nkịtị ka ndọrọndọrọ ọchịchị n'etiti otu abụọ bute nsogbu n'obodo, maka na ọ bụ ikike iwu nyere ndị uweojii ime ka udo na ọdịmma chịa n'obodo."

    Adeh kwuru na ndị uweojii ezigara n'isiụlọọrụ ndị NURTW nwere ọzụzụ nke ọma dịka enyela ha ndụmọdụ ka ha ghara imekpa onye ọbụla ahụ, maọbụ megide ikike dịịrị mmadụ n'ụzọ ọbụla.

    N'ụbọchị Tuzde, onyeisi ndị NLC bụ Joe Ajaero katọrọ etu ndị uweojii si wakpo isi ụlọọrụ ndị NURTW n'Abuja, ma kwuo na ọ bụ mmegide ka ha na-emegide otu ahụ.

    Ajaero boro ebubo na ọ bụ ndị uweojii na-achọ itinye onyeisi adịgboroja n'ọkwa ma chụtuo onye nke e mere ntuliaka wee họpụta.

  11. Ụnụ asaala chi

    Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ o.

    N'ebe a ka ị ga-ahụ akụkọ niile dị mkpa maka ụbọchị Wenezde a.

    Daalụ dịka ị na-esonyere anyị.

  12. Etu e si chọpụta ogologo okpo n'ime ụbụrụ otu nwaanyị

    Ndị dọkịta ahụla okpo dị ndụ n'ime ụbụrụ otu nwaanyị na mba Australia, ogologo okpo ahụ ruru 8cm (3in).

    Nke a bụ nke mbụ a na-ahụ ụdị ihe dị otu a na mmụta ahụike n'ụwa niile.

    Hari Priya Bandi bụ dọkịta chọpụtara ihe a kwuru na nwaanyị ahụ nwere ngosipụta ọrịa d icheiche nke gụnyere afọ mgbu, ụkwara, okpofufu abalị, nchefu ihe, na obi ịda mba.

    A nabatara nwaanyị ahụ n'ụlọọgwụ na ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ 2021, mana nnyocha gosiri na e nwere ihe metụtara ihu ụbụrụ ya.

    Amataghị kpọmkwem ihe kpatara nke a mana ọ bụ n'ọnwa June afọ 2022 dịka a wara nwaanyị ahụ ụbụrụ ka Dkt Bandi hụrụ ihe gbara ya gharịị.

    A chọpụtara na okpo ahụ na-acha mmeemmee anọọla n'ime ụbụrụ nwaanyị ahụ ihe ruru ọnwa abụọ.

    "Oge m hụrụ ya, ọ gbara m gharịị, m were 'tweezer' m kpapụta ya ma hụ na ọ dị ndụ na-akpagharị,"dkt Bandi kwuru.

    "Ọ tụrụ onye ọbụla n'anya dịka okpo ahụ na-akpagharịrị onwe ya oge anyị wepụtara ya n'ime ụbụrụ nwaanyị ahụ.

    Ndị ọkachamara n'ọrụ ahụike na-ekwu na nke a bụ a na-ahụ ihe yiri 'larvae' n'ime ụbụrụ mmadụ dị ndụ.

  13. E nwereike ịma otu nwoke ikpe ọnwụ n'ebubo idina nwoke ibe ya na Uganda

    Otu nwoke onye Uganda di afo 20 nwereike chere ntaramahuhụ ọnwụ maka ebubo idina nwoke ibe ya, nke iwu igbe ọnwụ dika iwu Uganda nke e wepụtara n’ọnwa Mee siri kwuo.

    Ọ bụ nke mbụ a na-anụ akụkọ maka nke a na-agbanyeghi na o doghị anya ma o nweela onye a mara ikpe maka nke a n’oge mbụ.

    Ụlọikpe dị n’Ọwụwa Anyanwụ Uganda boro nwoke ahụ ebubo n’ụbọchị 18 Ọgọọst, ma sị na ya na otu nwoke dị afọ 41 nwere mmekọ ahụ.

    Mana o dogghi anya ihe kpatara e ji wee si na nke a dabara n'ụdị mmekọ nwoke na nwoke ka njọ ka ozi ụlọọrụ mgbasaozi Reuters siri kwuo.

    Dika iwu si kwuo, ngalaba 'kawanyere njọ' gụnyere iwu mmekọahụ nwoke na nwoke bụ mgbe nwoke na onye erubeghi afọ 18 nwere mmekọ ahụ nakwa mgbe ya na onye nwere ọrịa ọjọọ nwere mmekọahụ dịka ọrịa HIV.

    Justine Balya, onye ọkaiwu nwoke e boro ebubo gwara Reuters na Uganda ebola mmadụ anọ ndị ọzọ ebubu a n'okpuru iwu megidere nwokeidina nwoke mana nwoke a bụ onye mbụ a ga-ekpe ikpe ma nye ụdịdị ntaramahụhụ a.

    N’ụbọchị 22 Ọgọọst, ụlọikpe dị n’Uganda boro otu nwoke nkwadọ ndị nwere mmasị idina ibe ha nakwa otu nwoke ọzọ ebubo inwe mmekọahụ.

    N’otu aka ahụ, n’izuụka garaga, ụlọikpe Uganda boro otu nwaanyị dị afọ 26 ebubo ịtụ mmadụ mgbere nakwa ya na ibe ya inwe mmekọahụ.

    Na mbido ọnwa a, Ụlọakụ Mbaụwa kwuru na ọ na-akwụsị ibinye Uganda ego maka na iwu ha megidere mmadụ idina ụdịrị okike ya, nke ha kwuru megidere ọkpụrụ ha.

  14. Aka akparala ndị ‘gay’ karịrị 100 na-akwado ịgba akwụkwọ na Naịjirịa

    Ndị uweojii Delta Steeti ekwuola na ha anwụchiela ụmụnwoke na-edina onwe ha a kpọro ‘gay’ karịrị mmadụ otu narị, dịka ha na-akwado ịgba akwụkwọ n’otu ụlọ ndina dị na steeti ahụ.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Bright Edafe wepụtara n’akara soshal midia ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha ga-agba ndị a n’anwụ n’oge na-adịghị anya.

    Cheta na mmadụ na onye dị n’ụdịdị ya inwe mmekọrịta bụ ịda iwu na Naịjirịa.

    Iwu Naịjirịa a nke malitere ọrụ n’afọ 2014 nke Onyeisiala Goodluck Jonathan tinyere aka na ya kwuru na a ga-atụ onye ọbụla e jidere na-akpa ụdịrị agwa nga afọ iri na anọ (14yrs).

  15. Ọnọdụ akụnụba anyị hụrụ jọrọ oke njọ, mana anyị agaghị agbazite ego - Gọọmentị etiti

    Mịnịsta na-ahụ maka ego na nchịkọta akụnụba Naịjirịa bụ Wale Edun ekwuola na ọnọdụ akụnụba ha zutere dịka ha batara n'ọchịchị jọrọ oke njọ, mana ha ebughị n'obu ịgbazite ego ọbụla iji kwalite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa.

    Edun kwuru nke a dịka e mechara ọgbakọ 'Federal Executive Council' (FEC) nke mbụ n'ọchịchị onyeisiala Bola Ahmed Tinubu n'ụbọchị Mọnde.

    Ọgbakọ FEC bụ ọgbakọ nke onyeisiala na ndị mịnịsta ya na-enwe kwa izuụka iji tulee etu gọọmentị si aga ma kpebie etu ha ga-esi gaa n'ihu.

    Wale Edun gwara ndị ntaakụkọ sị: "O doro anya na ugbua abụghị oge anyị ga-eji bido ịgbazite ego. Kama nke a, anyị ga-elekwasị anya n'etu anyị ga-esi mee ka ọnọdụ akụnụba siwanye ike, kwụsị etu ọnụahịa ihe si arị elu ngwangwa, nye ohere ka ndị ofesi bịa tinye ego na Naịjirịa iji wulite ọnọdụ akụnụba, kwalite nkepụta ọrụ, ma butuo ụbịam."

    "Anyị zutere ọnọdụ akụnụba dị oke njọ, mana onyeisiala ekwela nkwa ime ya ka ọ ka mma."

    N'ọgbakọ FEC ahụ, onyeisiala Tinubu dọrọ ndị mịnịsta aka na ntị na ọrụ chere ha n'ihu dị ukwu iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata na Naịjirịa.

    "Anyị nwere ọgụgụisi nke nwereike ịtụgharị obodo a. Anyị ga-eme ihe niile anyị nwereike iji chee obodo anyị ihu n'ụzọ ọganihu maka ndị Naịjirịa niile karịrị nde narị 200 bụ ndị tụkwasịrị anyị obi," Tinubu kwuru.

    "Ọ dịzi n'aka ụnụ ugbua. Adị m nkwadobe inye ụnụ nkwado niile ụnụ chọrọ. Ọrụ chere ụnụ n'ihu siri nnukwu ike, ọ dịka ikute mmiri n'ụmị kpọrọ nkụ, mana anyị ga-eme ya maka ụmụ Naịjirịa. Obi dị m ụtọ ịbụ onye na-akwọ ụgbọala a."

  16. Ụtụtụ ọma o

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.

  17. Onye nnọchi anya mba Fransị ajụla ịpụ na Niger

    Onye na-anọchị anya mba Fransị n'ala Niger ajụla ịpụ na mba Niger n'agbanyeghị ọgwụgwụ ohere ndị agha na-achị mba ahụ nyere ya pụọ.

    Ọ bụ onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron kwuru nke a n'ozi o nyere ebe o kelere Sylvain Itte bụ onye nnọchiteanya ahụ maka obi ọ kara ka nọrọ na Niger.

    Macron kwuru nke a n'ọgbakọ ndị na-anọchi anya mba Fransị n'ala ndị ọzọ nwere na Paris. Ọ sị "ndị na-anọchị anya mba Fransị nakwa ndị ọrụ gọọmentị ya agabigala ntaramahụhụ n'ụfọdụ ala site na Sudan rue na Niger n'ọnwa ndị gara aga".

    "E kelere m gị onye otu m, gị na ndị otu gị ndị ọzọ si na mba ha dị icheiche e ge ntị" ka Macron gwara Itte.

    Cheta na ọ bụ n'ọnwa Jụlai ka ndị agha weghaara ọchịchị n'ike nke mba Fransị nakwa ụfọdụ obodo nọ Niger nso gụnyere Naịjirịa katọrọ.

    Itte ekweghi ezute ndị agha ahụ weghaara ọchịchị n'ike mgbe ha mechara nke ahụ nke mere ka ndị agha ahụ gwa ya kwara pụọ n'ụbọchị Fraịde nke Itte jụrụ ime.

  18. Ụmụaka ise anwụọla n'ụlọ gbara ọkụ

    Ụmụaka ise anwụọla n'ọkụ gbara ụlọ ebe ha nọ n'obodo Pretoria bụ isi obodo na mba Saụt Afrịka.

    Dịka akụkọ si kwuo nne ụmụaka ahụ gụnyere ụmụ nwoke atọ nakwa ụmụ nwaanyị abụo hapụrụ ha n'ụlọ ha n'abalị.

    A nwụchiela ndị nne ahụ ma kpụpụ ha ụlọ ndị uweojii maka ajụjụ nakwa nyocha banyere ihe mere.

    Ọ bụ ndị ọrụ mmenyụ ọkụ chọtara ozu ụmụaka ahụ dịka ha gbanyụchara ọkụ malitere ịgba n'ụlọ ahụ dị na Pretoria.

    Onye na-ekwuchitere ndị ọrụ gbatagbata n'ime obodo Tshwane dọrọ ndị mmadụ aka na ntị na-ekwu "anyị na-arịọ ndị nne na nna nakwa ndị na-elekọta ụmụaka ha gba mbọ hụ na o nwere okenye na-anọ ụmụaka nso ma hapụkwa ha n'ọnọdụ dị mma".

  19. Mmeghe ọdọ mmiri Cameroon agaghị ebute ideimmiri dịka nke 2022 - Gọọmentị

    Mịnịsta na-ahụ maka gburugburu bụ Iziaq Salako ekwuola na gọọmentị ma na gọọmentị mba Cameroon na-achọ ịkpọpe ọdọ mmiri ha a kpọrọ 'Lagdo Dam' n'oge adịghị anya, mana nsogbu ideimmiri o nwereike ibute agaghị adị njọ dịka nke afọ 2022.

    Salako kwuru nke a na mkparịtaụka nke ya na ndị ntaakụkọ Channels TV n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde.

    "Iji tunyere ideimmiri nke afọ 2022, anyị na-atụ anya na ideimmiri nke ga-esi n'ọdọ mmiri 'Lagdo Dam' agaghị adị ka nke anyị hụrụ na 2022. Mana n'agbanyeghị nke a, anyị ezipụkwala ozi ịdọ aka na ntị nye ndi niile bi n'akụkụ osimiri Benue ka ha kwaga n'ebe ala dị elu," Salako kwuru.

    "Anyị ma na a ga-enwe ideimmiri n'ihi mkpọpe ọdọ mmiri ahụ, nke ahụ bụ ihe anyị ma ga-emerịrị, maka na ọ bụrụ na ọdọ mmiri ahụ eju n'ọnụ, ideimmiri ọ ga-ebute ga-aka njọ."

    "Ọ ka mma ka e jiri nwayọ kpọpee ọdọ mmiri ahụ ma jikwaa etu mmiri si apụta na ya iji hụ na o mebighi ihe nke ukwuu."

    Salako nyere nkọwa a dịka Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ dọrọ ngalaba 'National Emergency Management Agency' aka na ntị maka ideimmiri nke nwereike ịbịa.

  20. Ndị aghaelu awakpola ọdọ ndị mmanụ agbịdị adịgboroja

    Ndị aghaelu Naịjirịa ekwuola na ha awakpoola ụfọdụ ebe a na-arụpụta mmanụ agbịdị adịgboroja na mpaghara Niger Delta n'ụbọchị Sunde.

    Ha kwuru na ha tụrụ ebe ndị ahụ ogbunigwe ma wakpo kwa otu ụgbo mmiri ukwu bu mmanụ agbịdị na-achọ ịgbapụ.

    O teela aka Naịjirịa na-ekpochapụ ndị na-ezu mmanụ agbịdị na mpaghara Niger Delta, na-agba ụfọdụ ụgbọmmiri na-achọ izupu mmanụ agbịdị ọkụ.

    Ọtụtụ ebe ndị a a na-arụpụta mmanụ agbịdị dị n'ime ọhịa mmiri anọghị nso n'ebe ndị mmadụ bi mana ndị na-ahụ maka mbaraezi akatọọla ọkụ a na-agba ebe ndị ahụ.

    Mwakpo a nke ndị agha elu mere n'otu ụbọchị mgbe ndị isi ọrụ nchekwa nakwa ndị isi nwere mmanụ agbịdị mere njem na Rivas steeti ebe onye ndụmọdụ maka nchekwa bụ Nuhu Ribadu kwuru na ihe ruru udu mmanụ agbịdị puku narị anọ na-efunarị Naịjirịa site n'aka ndị ohi mmanụ agbịdị.