Etu ihe mberede okporoụzọ si taa isi mmadụ 49 na Kenya

Ebe foto si, Google Map
Ihe ruru mmadụ iri anọ na itoolu anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ mere n’ebe ụzọ abụọ gafere onwe ha na mba Kenya ka ndị uweojii na anya hụrụ ka o si mee kwuru.
Nke mere mgbe ụgbọala ukwuu bụ ibu n’elu ya gbafere ọsọ oke na-enweghi nchịkwa n’ebe a kpọrọ ‘Londiani Junction’ dị n’obodo Kericho.
Onye ndu ndị uweojii bụ Geoffrey Mayek kwuru na mmadụ iri atọ ndị ọzọ merụrụ ahụ ma sị na o nwereike ịkarị.
O kwuru na mmadụ abụọ maọbụ atọ ka nwere ike ịtọ n’okpuru ụgbọala ahụ.
Onye ndu ndị uweojii ọzọ bụ Tom Mboya Odero kwuru na ụgbọala ukwu ahụ kpọkaara ụgbọala asatọ ndị ọzọ, ọtụtụ ọgbatumtum nakwa ndị mmadụ kwụụ n’akụkụ okporoụzọ na-ere ahịa ha.
Anya hụrụ ka o si mee kwuru na onye ọkwọ ụgbọala na-achọ izere otu ụgbọala mebiri emebi nọchiri ụzọ.
Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto kwuru na obi agbaala ya n’ihi oke ihe ọdachi tara “ndụ ndị ntoroọbịa nwere ọdịnihu dị mma nakwa ndị mmadụ na-azụ ahịa ha kwa ụbọchị.
Anyị na-akpọku ndị ọkwọ ụgbọala ka ha kpachara anya n’okporoụzọ, ọkachasị ugbua a na-atụ anya oke mmiri ozuzo.”
Otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) kwuru na mba Afrịka kachasị nwee ndị mmadụ nwụrụ n’ihe mberede nke okporoụzọ n’afọ 2022.
N’afọ gara aga mmadụ 34 nwụrụ mgbe ụgbọala gbapụrụ n’okporoụzọ dị n’elu akwammiri ma sọnye isi n’ime mmiri.























