Ụtụtụọma ndị ọma
O nweghị ngọzi gị ọbụla ga-ala niyi taa ma mgbe niile.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.
Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi
O nweghị ngọzi gị ọbụla ga-ala niyi taa ma mgbe niile.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Anambra State Govt
Gọvanọ Chukwuma Soludo ezipụtala ozi nye ndị ọrụ na steeti ahụ dịka a mere emume ụbọchị ncheta ndị ọrụ na Naijirịa gburu gburu ma dọọ aka na ntị na onye ọrụ oyibo ọbụla na-anaghị abịa ọrụ kwa ụbọchị Mọnde nwereike ịnata mbetulata ego ụgwọ ọnwa ya.
N’okwu ya n’emume a e mere n’ama Alex Ekwueme Square, Awka n’ụbọchị Mọnde a, o kwuru:
Iwu onye nọrọ n’ụlọ (sit-at-home) abụrụla ohere nye ndị ọrụ ịjụ ịbịa ọrụ kwa ụbọchị Mọnde. Nke a agaghịzị na-aga n’ihu. Ị gaghị na-arụ ọrụ naanị abalị anọ ma na-achọ ka a kwụzuo gị ụgwọ.”
O gara n’ihu kwuo na ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị ọrụ na steeti ahụ dịka o kwuru:
“Anyị ga-agaghachiriri n’ime ụbọchị Mọnde ụbọchị ọrụ, ọ bụrụ na anyị agaghị ọrụ, anyị agaghị anata ụgwọ ọnwa zuruoke. A ga-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ruru ha site na ngazu ọrụ ụbọchị zuru oke.”
“Ọ bụrụ na anyị gaa n’ihu na-anọ n’ụlọ na Mọnde, mara na ụbọchị Satọde ga-abụzị ụbọchị ọrụ.”
O gara n’ihu kwuo na steeti ahụ mefuru ego ruru ijere naịra 88 n’afọ gara aga dịka ama bọọjeetị 2023 gbara gosiri na steeti ahụ kwesịrị ị na-enweta ijere naịra anọ kwa ọnwa mana ọ bụ naaanị ijeri abụọ ka ha na-enweta.
Cheta na n’afọ 2021 mgbe e duchara gọvanọ Soludo iyi ọrụ, ọ kpọkuru ndị niile nwere iwe nye gọọmentị Naijirịa maọbụ nke steeti ka ha bịa ka enwee mkparịtaụka ma chọo ụzọ udo iji dajụọ tigbuo zọgbuo nọ na-ada na steeti ahụ nakwa n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile.
Akụkọ ọgbaghara nakwa mwakpo ndị mmadụ jputakwara n'ihi iwu onye nọrọ n’ụlọ ndị otu Ipob tinyere n’akụkụ ọwụwa anyanwụ niile kwa ụbọchị Mọnde.
Iwu onye nọrọ n’ụlọ a nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tiburu ma mechaa kagbuo bụ maka iji gosi gọọmentị Naịjirịa iwe ha maka etu e si nwụchie ma kpọlata onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu Naijirịa.
Kanu nọ n’aka ndị uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ Department of State Services dịka ikpe ya ka na-aga n’ihu agbanyeghi na ụlọikpe mkpegharị kwuru ka a tọhapụ ya n’afọ 2022 ma kụchapụ ebubo niile gọọmenti Naijirịa nwere n’isi ya.
Mana na nso nso a, Ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa nyere gọọmentị etiti iwu ka ha weta ebubo itoolu ọzọ ha sị na ha chọrọ itinyekwu n'ebubo ha na-ebo Mazi Nnamdi Kanu.

Ebe foto si, Gọọmentị Anambra

Ebe foto si, Gọọmentị Anambra

Ebe foto si, SERHIY LYSAK
Russia tụrụ ogbunigwe ogologo abalị niile na mpaghara dị icheiche nke mba Ukraine nke ugboro abụọ n'ime abalị atọ gara aga.
Mpaghara Pavlohrad nke dị nso n'obodo Dnipro bụ ebe ogbunigwe ndị a kacha metụta dịka a na-atụ anya na mba Ukraine ga-ejikwa ogbunigwe nke ha zaghachi.
Ogbunigwe ndị a butere nnukwu ọkụ ọgbụgba na mpaghara ahụ nke lara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ n'iyi ma merụkwaa ihe ruru mmadụ 34 ahụ.
Ndị agha Ukrain sị na ha gbaturu ogbunigwe 15 n'ime 18 nke ndị agha Russia tụrụ na mpaghara dị icheiche na mba ahụ.
Otu onye bi n'obodo Pavlohrad aha ya bụ Olha Lytvynenko kwuru na ya na-ejikere ịpụ apụ oge ogbunigwe dara n'ụlọ ya ma kurie ọnụụzọ ya.
"Agbapụrụ ọsọ ngwangwa wee hụ na ebe a na-adọwa ụgbọala agbariela, ọkụ na-agba ebe niile. Ọ bụrụ na anyị nọ n'iro, anyị gaara anwụ," ka Lytvynenko kwuru.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọakụ etiti Naijirịa akụchapụla akụkọ na-ekwu na ha na-akpa nkata ịkụsị nkesa oge ọhụrụ Naijirịa ha malitere ikesa n’ọnwa Disemba, 2022.
N’ozi ụlọakụ Central Bank of Nigeria (CBN) wepụtara na mgbede Sọnde a ha, ha kwuru na ka o dokwa ọha anya na ha ka na-aga n’ihu na nkesa ego ọhụrụ Naịra nke ngalaba N200, N500 na N1000.
N’ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Isa AbdulMumim zipụtara, ha kwuru:
“Anyị ka nọ n’isi ọrụ ikesa ego ọhụrụ ndị a iji kwalite akụnụba mba anyị. Anyị na-agwa ọha ka ha ghara ịge ozi ọbụla na-ekwu na anyị chọrọ ịkwụsị nkesa ego ọhụrụ Naịra”.
Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọakụ CBN ka kwụ ebe ntuziaka ụlọikpe kachasị nyere n’ọnwa Febrụwarị nke nyere ha ohere ka ha na-emepụta ma na-ekesa ego ọhụrụ naịra nakwa nke ochie ruo abalị 31 nke ọnwa Disemba 2023.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Babajide Sanwo-olu/Twitter
Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ha na-anabata ụgbọala latrịk nke mbụ ga na-ebugharị ndị njem na steeti ahụ nke sonyere atụmatụ steeti ahụ ịbụ ebe echiche ọhụrụ na-ari elu.
N’ozi Gọvanọ Babajide Sanwo-olu zipụtara n’ehihe Sọnde a, o kwuru na ya bụ ụgbọala ga-aka ụgbọala ukwuu nke na-agba n’ime steeti ahụ a na-akpọ BRT agbasiike.
O kwuru ‘Dịka ikike ụgbọala ịpịa ọkụ ruru Kilomịta 280 n’otu awa, ebe nke BRT na-agba 200 Kilomịta n’otu awa, enweghi ihe egwu dị na ọ ga-akwụsị n’etiti ụzọ.’
Ọ gara n’ihu kwuo n’atụmatụ a bụ iji hụ na mmetọ ihu eligwe site n’anụwụrụ ụgbọala ndị na-eji mmanụ agidi arụ ọrụ ga-akwụsịnatu na steeti ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
O kwuru:
“Anyị ga-eji ọnwa olemole nwale ụgbọala a n’ime steeti a ma nata ozi ga-enyereaka na ihazị ya maka ọha imalitezi iji ya na-eme njem na steeti anyị n’ọdịn’ihu.”
Gọvanọ Sanwo-olu kwuru na ọ bụ ọrụ steeti ahụ nakwa ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi nakwa ọkụ latrịk bụ Oando Clean Energy Limited jịkọrọ rụọ.
O kwuru na njịkọ ha na Oando Clean Energy Limited ga-ahụ na e nwere ọdọ ebe a na-akwụnye ụgbọala ndị a n’ọkụ latrịk ka nwee ike nata ikike ịme njem.
Naịjirịa so na mba ndị binyereaka na nkwekọrịta ibelata mmepụta anwụrụ nakwa ihe ndị ọzọ na-emebi ihu eligwe n’ọgbakọ UN a kpọrọ COP26 e mere na Glasgow n’afọ 2022. Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na Naijirịa ga-agba mbọ beleta mmepụta anwụrụ ndị a ruo pasentị 20 n’ebe afọ 2030.

Ebe foto si, Babajide Sanwo-olu/Twitter

Ndi uweojii Naịjirịa na Delta steeti agbaala ama na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ ndị ụkọchukwu ụka Katọlịk abụọ a steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Bright Edafe gbara BBC Igbo ama nke a n'ehihe Sọnde ma kwuo:
"Ọ bụ eziokwu na a tọọrọ ndị ụkọchukwu abụọ mana anyị na-ama imi n'ala inyopụ ndị mere ihe a ma gbapụta ha abụọ."
Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Sọnde a na ụkọchukwu ụka Katọlik abụọ aha ha bụ Chocho Kunav na Raphael Ogigbah dabara n'aka ndị ntọ na Warri Delta Steeti, dịka ndị otu ụka Katọlik a kpọrọ Schoensttat Fathers si kwupụta.
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị otu ahụ bụ Fr Okereke Kingsley Kizito, o kwuru na Fr Kunav bi n'Ibadan, Oyo Steeti, bụkwa ebe ọ na-arụ ọrụ, mana o gara Warri ileta enyi ya nwoke bụ Fr Gbibah onye bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọka St Francis Agbara Otor, nokpuru ọchịchị Ugheli North..
"N'ụbọchị Satọdee, Fr Kunav na Fr Gbiba gara ileta ụkọchukwu ọzọ ụlọụka ya dị nso n'akụkụ ahụ, mana dịka ha na-alọta, ndị ntọ wakporo ha ma tọrọ ha," Fr Okereke kwuru.
"Ihe a mere n'ihu ụlọakwụkwọ Ibro University dị n'Agbara Otor. Anyị na-arịọ ka onye ọbụla cheta ụkọchukwu abụọ a na-ekpere."

Ebe foto si, Schoensttat Fathers

Ebe foto si, St Pauls Catholic Church Osu
Otu ụkọchukwu ụka Katọlik onye ndị ntọ tọọrọ n'ọdị nso a enwerela onwe ya.
Ozi si n'aka ụlọụka Katọlik 'St Pauls dị n'obodo Osu Aṅara n'okpuru ọchịchị Isiala Mbano, Imo Steeti, kwuru n'ezie na ụkọchukwu ahụ aha ya bụ Michael Asomugha apụtala n'aka ndị ntọ.
O dobeghị anya ugbua ma a kwụrụ ndị ntọ ahụ ụgwọ iji tọhapụ ụkọchukwu a, mand ụka Katọlik na Naịjirịa nwere iwu nke bụ na ha agaghị akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na a tọrọ ụkọchukwu ha ọbụla.
Oyu onye ụlọụka St Pauls Osu, aha ya bụ Chinedu Osuji, gwara onye ntaakụkọ na ụkọchukwu Asomugha nweere onwe ya n'ụbọchị Satọde.
Osuji kwuru na ha na-ekpe ekpere ma na-achụkwa aja Mass kamgbe a tọọrọ ụkọchukwu ha ma na-arịọ maka ntọhapụ ya.
"Obi bụ anyị sọ aṅụrị na ụkọchukwu Asomugha alọghachikwutela anyị. Otito dịrị aha Jesus," ka Osuji kwuru.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Legọs steeti ejidela otu nwoke na nwunye ya bụ ndị ha boro ebubo na ha ji aka ha hazie ntọrọ onwe ha n'ụzọ aghụghọ iji napụta ndị ezinụlọ ha nde naịra ise.
Ben Hundeyin bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs kwuru na ha jidere nke nwaanyị n'ụbọchị Wenezde ma jide nke nwoke n'ụbọchị Tọzde.
Hundeyin kwuru na ọ bụ otu n'ime ndị ezinụlọ ahụ wetara mkpesa ahụ n'ụlọọrụ ha dịka o nwetara ozi ekwentị na ndị ntọ atọrọla ụmụnne ya.
O kwuru na mmadụ abụọ ahụ kwetara na ha mere ya bụ ihe, mana ọ bụ maka na ụmụnne ha anaghị ekwe enye ha ego n'agbanyeghi na ha na-emecha nke ọma n'ebe dị icheiche ha nọ, ụfọdụ nọkwa mba ofesi.
Hundeyin kwuru na nwoke ahụ na nwunye ya chere na ọ bụrụ na ụmụnne ha nụ na ndị ntọ atọrọla ha, ha ga-ewepụtarịrị ego iji gbapụta ha.
Mana oge ndị uweojii nwetara mkpesa ahụ, ha gara na be di na nwunye ahụ ma hụ ebe ha na ụmụaka ha nọ na-enweta onwe ha.
Dịka Hundeyin si gwa BBC, di na nwunye ahụ egosila mwute maka ihe ha mere, mana ndị uweojii ga-akpọpụ ha ụlọikpe n'oge adịghị anya.

Ebe foto si, Getty Images
Otu jịkọrọ ndị dọkịnta na Naijirịa bụ Nigerian Association of Resident Doctors, Nard ewepụtala ozi ịdọ aka na ntị nye gọọmentị etiti Naijirịa ma na-ekwu ma ọ bụrụ na ha emezughi nkwekọrịta ha n’izu abụọ na ihe agaghi aga nke ọma na ngalaba ndị ọrụ ahụike na Naijirịa.
Nke a nọ n’ime akwụkwọ ozi ha wepụtara so ọgbakọ ‘National Executive Council’ (Nec) ha mere nke nọrọ abalị atọ n’ụlọọgwụ Federal Medical Centre, Abeokuta, Ogun Steeti.
Ndị dọkịnta chọrọ ka ebulie ego a na-enye ọrụ ahụike na Naijirịa ruo pasentị 15 iji hazie akụkụ ọrụ ahụ na Naijirịa.
Ka ọ dị ugbua, gọọmentị etiti na-enye ọrụ ahụike pasentị 5.7 n’ime bọọjetị kwa afọ.
Ha kwukwara na itinye ego a ga-enyere aka n’owuwe ndị ọrụ ahụike ọhụrụ ga-anọchị ndị nke gbapụrụla Naijirịa ma gawa mba ofesi ịrụ ọrụ.
Ha kwukwara na ha chọrọ ka ebulie na hazigharia usoro ego ndị ọrụ dọkịnta ruo pasentị 200.
Ozi a nke ha zipụtara kwuru na mkpebi ndị a nọ n’ime akwụkwọ ha nyere Minista ahụike Naijirịa bụ Dkt Osagie Ehanire, n’ụbọchị asaa n’ọnwa Jụlaie n’afọ 2022.
Otu Nard kwukwara na ha chọrọ ka ụlọomeiwu nta wepụ atụmatụ chọrọ ka ndị dọkịnta ọhụrụ natara ọzụzụ na Naijirịa ghara inweta akwụkwọ ikike ịrụ ọrụ n’uju ma ruo mgbe ha rụrụ ọrụ n’ụlọọgwụ Naijirịa ọbụla ruo afọ ise.
Cheta na onye omeiwu Ganiyu Johnson wepụtara atụmatụ a n’ọnwa Dịsemba 2022 dịka ya bụ atụmatụ gaferela ngụpụta nke abụọ n’ụlọomeiwu.
Ọtụtụ ndị mmadụ nke gụnyere otu jịkọrọ ndị dọkịnta katọrọ atụmatụ a.
Ndị dọkịnta nakwa ndị orụ ahụike agbala abụbọ ọrụ ugboro ugboro n’oge gara aga na Naijirịa.
N’ọnwa Ọgọst 2021, otu jịkọrọndị dọkịnta na Naijirịa gbara abụbọ ọrụ maka okwu ndị a nakwa ndị ọzọ nke ha na gọọmentị etiti ka na-adọ ndọrọndọrọ n’elu ya.

Ebe foto si, Otunba Moses Olafare
N’ozi onyeisi mgbasaozi ime obi Ooni bụ Otunba Moses Olafare wepụtara, o owuru na ya bụ ọkụ malitere n’ebe elekere 11 na ọkara nke ụtụtụ Satọdee a ma kwuo na ọ bụ ọkụ latrịk kpatara ya bụ ọkụ.
Olafare kwuru na ya bụ ọkụ efesaghi gafee ụlọ ndị nọ n’akụkụ ụlọ ahụ dịka ndị ọrụ mmenyụ ọkụ nke gọọmentị nakwa nke mahadum Obafemi Awolowo University (OAU) jịkọrọ aka mmenyụọ ya bụ ọkụ ngwa ngwa.
O kwukwara na enweghi onye merụrụ ahụ maọbụ nwụrụ n’ihe ọdachị a ma gbaa ma na ‘enweghi nka maọbụ ihe omenala ọbụla ọkụ a bibiri’.

Ebe foto si, Otunba Moses Olafare

Ebe foto si, Oyo State Police
Ndị uweojii n'Oyo Steeti ejidela otu nwata nwoke dị afọ 18, aha ya bụ Taofeek Adeagbo, onye ha boro ebubo na o gburu nna ya.
Ha jidekwara nne nwata nwoke ahụ aha ya bụ Rashidat maka na ọ matara na nwa ya gburu nna ya, mana o zochiri ya.
Ndị uweojii gosipụtara nne na nwa ahụ n'ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Eprel 2023, n'isiụlọọrụ ha dị n'Ibadan.
Dịka ụlọ ntaakụkọ Punch si dee, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Oyo Steeti bụ Adewale Osifeso kwuru na ya bụ ihe mere n'ụbọchị Fraịde nke gara aga, bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Eprel.
Osifeso kwuru na nnyocha ha gosiri na ọ bụ igwe ka Taofeek ji kụgbuo nna ya oge ọ na-arahụ ụra.
"Oge anyị jụrụ ya ajụjụ, nwata nwoke ahụ kwuru na nne ya ma na ọ bụ ya gburu nna ya mana o zochiri ya, ọ bụ ya mere anyị ji jidekwa nwaanyị ahụ," Osideso kwuru.
N'okwu nke ya, oriaku Rashidat Adeagbo kwuru na ọ bụ n'isi ụtụtụ oge ọ kpọlitere ụmụ ya ka ha kpee ekpere dịka okpukperechi ndị alakụba si dị, ka ya hụrụ ka di ya dina n'ozu.
"Amụtaara m di m ụmụ asaa, ọ bụ eziokwu na anyị na-enwe nghọtahie oge ụfọdụ, mana onweghị mgbe m ga-eji cheere ya echiche ọnwụ," ka nwaanyị ahụ kwuru.
"Ọ bụ oge ndị uweojii bịara jụọ ese ụmụ m niile, mana echere m na Taofeek pụrụ apụ, tupu e mechaa ya hụ ya ebe o zoro n'okpuru akwa.
"Ajụrụ m ya ma ọ ma ihe gburu nna ya o wee kwuo na ọ bụ ya gburu ya."

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka e bugharịa ụbọchị mmalite ngụkọ ọnụ ọha nke 2023 ruo mgbe ọbụla ọ ga-amasị onyeisiala ọhụrụ itinye ya.
Buhari nyere iwu a dịka ya na ndị isi ngalaba 'National Population Commission' (NPC) nakwa ụfọdụ ndị Mịnịsta nwechara ọgbakọ n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.
Cheta na ngụkọ ọnụ ọha Naịjirịa nke afọ a kwesịburu ịmalite n'ụbọchị atọ ruo ụbọchị asaa nke ọnwa Mee 2023.
Ozi si n'aka Mịnịstrị mgbasaozi kwuru na Buhari nyere NPC iwu ka ha gaa n'ihu na nkwado ha maka ya bụ ngụlọ ọnụ iji hụ na ihe ndị ha merela agaghị alaghachi azụ.
Nke a bụ ngụkọ ọnụ mbụ a ga-eme na Naịjirịa kamgbe nke ikpeazụ e mere n'afọ 2006, ya bụ afọ 17 gara aga.

Ebe foto si, APC
Pati All Progressive Congress (APC) ekwuola na onwebeghi mpaghara ọbụla na Naịjirịa ha kenyere iji ọkwa ndịisi ndị ụlọomeiwu.
N’ozi odeakwụkwọ mgbasasozi ha bụ Felix Morka wepụtara, pati kwuru na ha anụla kepukepu na efegharị nke kwuru na e kenyela otu mpaghara Naịjirịa ịbụ ndịisi n’ụlọomeiwu.
O kwuru na ike usoro ọchịchị n’ụlọomeiwu abụghị ha malitere, ya mere na ọ bụghị ihe ha ga-agbara nkịtị.
“Iji mee ka o doo anya, pati anyị ekenyebeghi mpaghara ọbụla ọkwa ndịisi ụlọomeiwu.
Ọ gara n’ihu kwuo na ha ga-eme ka ọha mara maka mkpebi ha mere site n’akara mgbasaozi ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọchịchị na Saụt Afrịka ekwuola na ha na-achọ mmadụ abụọ nọ na nga maka okwu ịdịna ndị mmadụ mmadụ n’ike dịka ha gbapụrụ otu ụlọ nga nọ na mpaghara Eastern Cape province.
A na-eche na mmadụ abụọ a bụ Siyabulela Khohliso na Athini Mzingelwa si ama egwuregwu ụlọ nga Ngqeleni Correctional Centre gbapụ n’ehihe ụbọchị Tọọzde a.
Ngalaba ụlọnga mba ahụ bụ Department of Correctional Services (DCS) kwuru
“Anyị amalitela nnyocha etu ihe a siri mee mana ihe kacha mkpa ugbua bụ inwụchi mmadụ abụọ a ndị mara.”
Ngalaba ahụ gwara ọha ka ha gbaara ha ama ma ha hụ maọbụ nata ozi ọbụla banyere ndị a ngwa ngwa.
Nke a na-abịa dịka nwoke ọzọ nke aha ya bụ Thabo Bester bụkwa onye a na-enyo makwa okwu ịdịna ndị mmadụ n’ike gbapụrụ ụlọnga ọzọ na mba ahụ site n’atụmatụ ime ka ọ dị ka ọkụ agbagburu ya ebe o n’azụ nga ahụ gbafuo.
A nwụchiri Bester onye ikpe ya na-ewu ewu ugbua n’ọnwa a na mba Tanzania.

Ebe foto si, reu
Nwaada ọlụ ọgụ Naịjirịa bụ onye busoro ogbo ya nke mba Saụt Afrịka agha n’asọmpị Extreme Fighting Championship (EFC) 102 enwetela mmeri.
Juliet Ukah onye bụ onye otu uweojii Naijirịa nwetere mmeri a ma napụ Crystal Van Wyk nke mba Saụt Afrịka ọkwa ya dịka enweghi onye meriburu ya tupu o mee nke a.
Onyeisi ndị uweojii Naijirịa bụ IGP Alkali Baba zipụtara ozi eleke nye ya maka mmeri ya.
N’ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi wepụtara, e toro ya maka etu mmeri si awalite mbọ ndị uweojii na-agba n’ọrụ nkwado egwuregwu na Naijirịa.
O tokwara ya maka etu o siri wetere Naijirịa ihuọma nakwa ezi aha.
Juliet so n’ụmụnwaanyị ndị uweojii Naijirịa abụọ e zipụrụ maka ọgụ MMA Fight nke ụmụnwaanyị na Thailand.

Ebe foto si, Reuters
Ndị otu ndịagha abụọ na-alụ ọgụ na Sudan enwela nkwekọrịta ọzọ ịdọtị nkwụsịtu ọgụ ha na-alụ dịka oge ha tinyeburu chọrọ ịgwụcha.
Mgbatị a maka ga-eru abalị atọ so mbọ ndị otu ọchịchị ụwa nakwa mba ndị nọ ha nso gbara n’ịrọ ha ka ha mee nke a nke gụnyere mba Amerịka, mba Briten nakwa otu UN.
Mana akụkọ na ọgụ ka na-aga n'ihu ka na adapụta n’isiobodo Sudan bụ Khartoum.
Nkwekọrịta nke gara aga nyere ọtụtụ puku mmadụ ohere ịgbapụ n'ebe ahụ ebe ọtụtụ mba ka na-agba mbọ ịgbapụta ụmụ amaala ha ebe ahụ.
Dịka ọ bụ ihe ruru izu abụọ ọgụ a malitere n’etiti ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa Rapid Support Forces (RSF) malitere, narị kwuru narị ndị mmadụ anwụọla.
Cheta na nkwekọrịta nke ochie a kwesibụrụ ibi n’ime abalị nke ụbọchị Tọọzde.
Ọ bụ na mgbede Tọọzde ka ndịagha Sudan zipụtara ozi nkwekọrịta a ebe ndị RSF wepụtara nke a ka obere oge gachara.
Mba South Sudan ekwuola na ha ga-anabata mkparịtaụka udo na mba ha dịka ndịagha ha na-ekwu na ha ga-ezite ndị otu ha maka atụmatụ a.
Onye odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken kwuru na Amerịka "na-arụsi ọrụ ike" n’atụmatụ mgbatị ahụ, ma kwukwa na n'agbanyeghị na nkwekọrịta adịchaghi etu e siri chọọ, na ya bụ ihe ebelatala ọgbaghara ebe ahụ.
Mana ọnụ na-ekwuchitere ime obi gọọọmentị Amerịka bụ Karine Jean-Pierre mechara kwuo na ọnọdụ ọgbaghara ebe ahụ nwereike ịkawanye njọ ọzọ.
N'ụbọchị Fraịdee, a gbaturu ụgbọelu ndịagha Turkey nọ n'ọrụ mbupụ ka ọ na-agbada n'ọdụ ụgbọ elu Khartoum. O nweghi onye merụrụ ahụ mana RSF gọnarịrị ebubo ndịagha na-ebo ha na ọ bụ ha mere mgbatu ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ndị RSF na ndị hụrụ ihe e mee na-ekwu na ndịagha na-azọ mpitimpi na Khartoum.
Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi na gọọmentị ndị nkịtị pụrụ apụ bụ Maryam al-Sadiq al-Mahdi, gwara BBC na n'agbanyeghị nkwụsịtụ agha a kwụsịrị na ndị mmadụ n’akụkụ ụlọ ya na Khartoum ka na-atụ egwu.

Ebe foto si, UKRAINE STATE EMERGENCY SERVICE
Russia amalitela ibu agha elu n’akụkụ dị iche iche n’Ukraine nke gụnyere Kyiv dịka opekatampe, mmadụ 12 nwụrụ na mwakpo ọhụrụ a.
Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na mmadụ iri gụnyere otu nwatakịrị nwụrụ na mwakpo a wakporo otu ụlọ dị n’Uman.
E gbukwara otu nwaanyị na nwa ya nwanyị dị afọ atọ n'obodo Dnipro, dịka onyeisi obodo ahụ siri kwuo.
A kọkwara na a tụkwara ogbunigwe n'obodo Kremenchuk na Poltava.
Onyeisiala Ukraine bụV olodymyr Zelensky kwuru na ụlọ ahụ a tụrụ ogbunigwe so n’ụlọ obibi iri mwakpo metụtara na Uman. Ndị ọrụ gbata gbata kwuru na a mụrụ nwa ahụ e gburu n'obodo ahụ n'afọ 2013 dịka ha kwuru mmadụ iri na otu ọzọ merụrụ oke ahụ nke bụ na-ekwesiri ibuga ha ụlọọgwụ.
Zelensky kwuru na mbuso agha ndị a gosiri na ndị isi mbaụwa kwesịrị iwepụta ntaramahụhụ megide Russia.
O kwuru n’akara Twitter ya ihe ọ che maka mmachị e kwesịrị inye Russia:
"Enwere ike ịkwụsị agwa ọjọọ site na mbuso agha - ndị agha anyị na-eme nke a ugbua. Enwekwara ike ịkwụsị ya site na mmachi – mbaụwa kwesịrị ihazị mmachi zuruoke."
Onyeisi ndịagha n’obodo Kyiv kwuru na ọ bụ mbụ kemgbe abalịọ 51 ogbunigwe ndị Russia na-ada n'ime isiobodo ha.
Enwebeghị akụkọ gbasara ndị nkịtị nwụrụ na isi obodo ahụ ugbua.
Ndị ọrụ nchekwa nke Ukraine gbaturu ogbunigwe ofe n’elu 21 n’ime 21 dịka ha gbatukwara oke ngwa elu abụọ dịka otu onye isi ha siri kwuo na Telegram.
Unu asaala chi?
Nnọọ n'ọbaozi anyị taa.
Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.
Igbo ndị ọma, n'ebe a ka anyị ga-apịachi mgbasaozi nke taa.
Daalụ maka isonyere anyị.
Ka chi fonu.

Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọnọdụ ndị agha Naịjirịa gbalitere nke ukwuu n'ọchịchị ya karịa etu ọ dị oge ọ malitere ọchịchị n'afọ 2015.
Buhari kwuru nke a n'emume pụrụ iche ndị agha Naịjirịa mere n'ogige 'Eagle Square' dị n'Abuja n'ụbọchị Tọzde iji gosipụta agwa njirimara ọhụrụ nke ndị agha Naịjirịa.
O kwuru sị: "Oge anyị malitere ọchịchị n'afọ 2015, ọnọdụ nchekwa obodo anyị jọrọ nnukwu njọ n'ihi ndị ọjọọ dị icheiche na-ebuso mba anyị agha."
"Mana taa, obi dị m ụtọ ikwu na ọnọdụ nchekwa akwanyela mma dịka m na-arụtụ aka n'agha dị icheiche anyị na-ebuso ndị oyi ndụ egwu, ndị ọgụ nnupuisi, ndị ohi mmanụ agbịdị, ndị ntọrị mmadụ nakwa ndị ekperima ndị ọzọ n'obodo anyị."
"Otu ndị agha Naịjirịa anyị na-eme emume ha taa agaraghị enwe ike ịrụ ọrụ ha etu o kwesịrị ma e wepụ ihe anyị merela.
"Ike nke ndị agha anyị gbaturu nke ukwuu n'oge ọnwa Mee 2015. Mana ugbua, ka afọ asaa gachara, ike ha arịala elu nke ukwuu, nke mere na ndị agha Naịjirịa bụzi ndị nke anọ n'ogogo ndị agha mba Afrịka, site na'ogogo ndị nke asaa ha nọbụ na ya na 2015."
Buhari kelere onyisi ndị agha Naịjirịa maka mbọ ya niile ma kwukwaa na ndị agha Naịjirịa ga na-agbakwasị ụkwụ na nkwado iji hụ na udo na nchekwa jupụtara Naịjirịa niile.