Amerịka egbuola Ayman al-Zawahiri bụ onyeisi otu al-Qaeda

E gburu ya n’isiobodo Afghanistan bụ Kabul n’ụbọchị ụka dịka otu nchekwa mba Amerịka nke CIA wakporo be ya.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi

  1. Asuu adọtịala abuboọrụ ha ruo izu anọ ọzọ

    Emmanuel Osodeke

    Ebe foto si, Twitter/ASUUNGR

    Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) adọtịala abụbọ ọrụ ha na-agba ruo izu anọ ọzọ.

    Onyeisi otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru nke a taa bụ Mọnde dịka ọ kọwara na nke a bụ iji nye gọọmentị ohere ọzọ imezu nkwa ndị ha kwerela ha.

    Osodeke kwuru na ndị otu mere nzukọ gbatagbata n’ụbọchị ụka n’Abuja maka nke a.

    Cheta na e mechiri mahadum ndị nọ na Naịjirịa n’ihi ndị nkuzi nke otu Asuu malitere abụbọ ọrụ ha n’ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị, 2022.

    Asuu na-agba ya bụ abụbọ ọrụ maka ọnọdụ ọrụ ndị nkuzi mahadum nakwa etu ha sịrị gbajọọ imezu nkwa ndị Asuu sị gọọmentị etiti kwere ha nke gụnyere ibuli ego ụgwọ ọnwa ha.

    Dịka Asuu na gọọmentị nọ na-asọkọtaisi n’okwu ihe ndị a, onyeisiala Muhammdu Buhari pụtara n’izu abụọ gara aga kwuo na ọ na-enye Minista agụmakwụkwọ nke Naịjirịa bụ Adamu Adamu na Chris Ngige bụ Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ Bekee na Naịjriịa iwu ka ha hụ na ha kwụsịrị abụbọ ọrụ Asuu ma dajụọ iwe ha.

    N’izu gara aga, otu ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigerian Labour Congress (NLC) pụtara n’igwe n’akụkụ Naịjirịa niile mee ngagharịiwe iji gosi nkwado ha n’abụbọ ọrụ Asuu n’agba.

    Onyeisi NLC bụ Ayuba Wabba kwuru na ‘Ọ dị mwute na ụmụ ndị ọchịchị na Naịjirịa na-aga ofesi maka agụmakwụkwọ ha ebe ụmụ ndị nkiti nọ n’ụlọ maka abụbọ ọrụ Asuu’.

  2. E nyochapụtala nje Monkey Pox nke mbụ na mba Sudan

    Foto na-egosi etu nje ọrịa Monkey Pox dị n'okpuru onyokomita

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto na-egosi etu nje ọrịa Monkey Pox dị n'okpuru onyokomita

    Ministri ahụike na mba Sudan ekwuola na e nyochapụtara nje ọrịa Monkey Pox n’ahụ nwata akwụkwọ gbara afọ 16 na mpaghara Ọdịda Anyanwụ nke steeti Darfur na mba ahụ.

    Ha kwuru na e mere nnyochapụta a n’ụbọchị ụka.

    Otu ahụike ụwa nke WHO kpọpụtara aha ọrịa a dịka ọrịa ụwa kwesịrị ileba anya dịka ọnọzị n’ọnọdụ gbatagbata nye ndị ọrụ ahụike.

    Kemgbe ọrịa a malitere ifesa na nso nso a, mmadụ 21,000 ebutela ya n’akụkụ ụwa dị ịcheịche dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi mfesa ọrịa na mba Amerịka bụ US Centers for Disease Control and Prevention siri kwuo.

  3. Ebubo nrụrụaka adapụtala n’isi Onyeisiala Cyril Ramaphosa

    Cyril Ramaphosa

    Ebe foto si, Reuters

    Ebubo nrụrụaka na mpụ adapụtala n’isi Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka dịka ụlọọrụ na-ebuso mpụ agha na mba ahụ bụ Public Protector si kwuo.

    Ebụbọ a kwuru na Ramaphosa si n’ụzọ iwu akwadoghị ma kwụọ ụgwọ aka azụ ịhụ na atọọrọ ma nwụchịe ndị a na-enyo zupụrụ ego ruru nde dọla anọ n’ụlọọrụ ugbo ya na 2020.

    A na-enyokwa etu o siri nweta ego ruru etu a nke nọ n’ụlọọrụ ugbo ya.

    Ebubo bu ụzọ pụta ihe n’ọnwa Juun mgbe Arthur Fraserbụbu onyeisi ngalaba nchekwa nke State Security Agency na mba ahụ kwupụtara ihe a asị mere n’ọha.

    E kwuru na Ramaphosa kpụrụ ụkwụ n’ala ugboro ugboro ịbịa zara ọnụ ya n’ụlọọrụ ndị Public Protector dịka ha kporo ya oku.

    Cheta na okwu aka chịbụrụ mba ahụ bụ Jacob Zuma ka nọ n’ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka na mpụ gụnyere ibupụ ego gọọmentị n’ụzọ na-ezighị ezi.

    Otu pati African National Congress (ANC) bụ pati onyeisiala Ramaphosa nọ n’ime ya kwesịrị ịkpọpụta aha onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2024 na nso nso, anya ọha na-ele ịhụ ihe ga-eme dịka ebubo a dapụtarala n’isi ya.

  4. Ndewo nụ

    Ụnụ asaala chi?

    Anyị ekele unu. Chibiri akụkọ niile n'ihe na-eme n'ụwa ebe a taa.

  5. Ka chi foo nu!

    Daalụ dịka i sonyere anyị taa, ka ọ dị echi

  6. Folashade Lawal eriterela Naijirịa ọlaedo nke abụọ!

    Folashade Lawal eriterela Naijirịa ọlaedo abụọ ya n'asọmpị Commonwealth nke a na-eme na Birmingham.

    Ọ bụ site n'ịpa weeti ka oritere ya bụ ọlaedo.

    Lawal tịwakwara efere nke bụ na-enweghị onye ọzọ burula ihe na-anyị arụ etu o siri buo ya.

    Ugbua Naijirịa eritela ntụrụugo atọ, ha niile sitere n'ịpa ihe dị arụ.

  7. Gọvanọ Dave Umahi emeriela ntụliaka imeụlọ APC maka ọkwa omeiwu Ebonyi South

    Dave Umahi

    Ebe foto si, ESG Media team

    Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi emereila ntụliaka imeụlọ APC emegharịrị nke eji ahọpụta onye ga-anọchite anya patị ahụ na ntụliaka omeiwu Ebonyi South.

    Ọ bụ onyeisioche ntuliaka otu APC bụ Emmanuel Adebayo Kehinde kwuru na ọ bụ Umahi meriri n'ime mmadụ ise zọrọ ya bụ ọkwa.

    Ọ bụ Austin Chukwu Umahi, Ann Agom-Eze. Ibiam Margret Ezenwaanyị na Chiko Elizabeth Nwataego ka ha na Dave Umahi zọrọ ya bụ ọkwa.

    Ezenwaanyị nwetara vootu atọ, Nwakaego nwetara ise, ebe agụpụrụ vootu asaa.

    Agom-Eze enwetaghị vootu ọbụla,

    Umahi nwetara vootu narị abụọ na iri isii nke o ji were merie ya bụ ntuliaka.

  8. Ihe ịkwesịrị ịma maka Adenike Olarinoye, onye ritere Naijirịa ọlaedo mbụ ya n'asọmpi Commonwealth

    Adenike Olarinoye

    Ebe foto si, Getty Images

    Adijat Adenike Olarinoye ji ịpa igwe nke bụ weight lifting na bekee were ritere Naijirịa ntụrụugo ọlaedo mbụ ya na Commonwealth games nke afọ 2022 a na-eme na Birmingham.

    Olarinoye buliri igwe na-ada 203kg iji mereie na asọmpị nke ụmụnwaanyị.

    Ihe ị kwesịrị ịma maka Adijat Adenike Olarinoye

    Adijat Adenike Olarinoye dị afọ iri abụọ na abụọ dịka websaịt ndị Birminghan siri depụta.

    A mụrụ ya n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Julaị afọ 1999.

    Ọ bụ na mpaghara ọdịda anywnụ nke Naijirịa ka o si.

    Olarinoye ritere Naijirịa ọlaedo atọ n'asọmpị African Games nke e mere na Morocco n'afọ 2019.

    Ọ bụ n'ịpa igwe dara 55kg ka o jiri rite ọlaedo mbụ ya.

    Olarinoye ritekwara ọlaedo n'asọmpị International Weightlifting federation, World Championship nke e mere n'obodo Tashkent dị na mba Uzbekistan.

  9. E tigbuola otu nwoke bụ Alika Ogorchukwu na mba Italy

    Alika Ogorchukwu

    Ebe foto si, Nidcom_gov/Twitter

    Nkọwa foto, Alika Ogorchukwu

    Ụlọ nnọchiteanaya Naịjirịa dị na Rome ekwuola na ọ bụ eziokwu na etigburu otu nwoke aha ya bụ Alika Ogorchukwu n'obodo Civitanova Marche dị na mpaghara Marche na mba Italy.

    Akụkọ kwuru na otu nwoke onye mba ahụ tigburu Ogorchukwu n'ehihie ọcha, n'ihu igwe mmadụ niile mana o nweghi onye gbataara ya ọsọ enyemaka.

    Kama ndị nọ nso ebe ahụ wepụtara ekwentị ha na-ese ihe onyonyo ka a na-etigbu ya.

    Onye nnochiteanya Naịjirịa na mba ahụ Mfawa Omini Abam akatọọla ọnwụ Ogochukwu ma malite inye nwunye ya na ezinaụlọ ya enyemaka.

  10. Unu abọọla chi?

    Akụkọ ndị anyị kwadoro unu taa bụ akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ.

    Chebiri nu ya.

  11. Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke echeere gburu nwaanyị gara ịgba ya ụgwọ

    Kate Oguoh

    Ebe foto si, Dick Oguoh

    Ndịuweojii amalitela nnyocha otu nwoke akpọrọ Joseph Fekala maka ebubo na aka ya dị n’ọnwụ otu nwa agbọghọ achọtara ozu ya n’ime ụlọ be ya na Bayelsa steeti.

    Akụkọ na-ekwu na nwa agbọghọ ahụ bụ Kate Oguoh gara ịgba ya ụgwọ ego Fekala ji ya n'akwa ndị ọ zụrụ n'aka ya n'akwụghị ụgwọ mgbe nke a mere.

    Echeere na Fekala tọgburu Kate ma lie ya n'imeụlọ be ya.

    Nna nwaanyị ahụ bụ Dick Oguoh gwara BBC na amalitere ịchọ ya mgbe nne ya kpọrọ ya n'ekwentị gwa ya na ọ naghị enweta Kate.

    Achọọrọ ya gawa n'akụkụ ebe akpọrọ Okaka dị na steeti ahụ ebe a sị ọ gara ịgba mmadụ ụgwọ were chọtazia ozu ya ebe eliri ya.

  12. Nnọọ nụ

    Unu abọọla chi?

    Daalụnụ maka isonye anyị taa. Ka ụbọchị a maara anyị mma.

  13. Ụnụ akụjala maka egbe a wụrụ n'Owo ọzọ- Akeredolu

    Rotimi Akeredolu

    Ebe foto si, Rotimi Akeredolu

    Gọvanọ Ondo Steeti bụ Rotimi Akeredolu,ekwuola na egbe a gbara n'ụlọọrụ Craneburg Construction Company ụbọchị Wenezde bụ iji mebie ngwaọrụ ụlọọrụ ahụ, na ọ bụghị igbu maọbụ merụọ mmadụ ahụ.

    Akeredioolu kwuru nke a oge ya na ndị ọrụ nchekwa gara n'ụlọọrụ ahụ ileta ihe mere.

    Akụkọ feghariburu ụbọịchị Tọzde kwuru na ndi omekome wakporo ma wụọ mgbọ n’ụlọọrụ ewumewu 'Craneburg Construction Company',dị n' Owo ụbọchị Wenezde.

    Mana Akeredolu sịrị, "Achọrọ m ịgwa ndị mmadụ ụjọ atụla ha."

    "Ihe mere ụbọchị Wenezde abụghị mmadụ ka a chọrọ ịtọọrọ n'ihi na ha pụrụ na akpụghị onye ọbụla."

    "Enwere mmadụ otu nari n'ime ebe ahụ."

    "N'ezie, a gbara egbe n'aja mana ha abaghị ime igbu mmadụ."

    Njirimara Ondo steeti

    Ebe foto si, Rotimi Akeredolu

    Ihe ndị uweojii steeti ahụ kwuru

    Ndị naanị ndị agbara egbe bụ mmadụ abụọ bụ ndị ọrụ nchekwa ha hụrụ kwụ n'ilo."

    Mgbọ ahụ a kwara na-abịa izuụka asaa ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Francis Catholic Church dị n’obodo ahụ, gbuo mmadụ 40 n’abalị ise nke ọnwa Juun.

    Ndị nọ nso ebe ihe mere kwuru na ndị omekome wụrụ mgbọ n’ ụzọ Folahami Junction' dị nso n'ụlọọrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Funmilayo Odunlami kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie Mana o kwughị ma ọ bụ ndị oyindụegwu ka ọ bụ ndị ekperima gbara ya bụ egbe.

    Ọ sịrị, "A gbara egbe n'ụlọọrụ 'Craneburg Construction Company' dị n'Owo n'abalị."

    "Ndị uweojii gara ebe ahụ, ebugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ."

    "Ha nọ n'ezigbo ọnọdụ ugbua."

  14. Ụlọikpe enyela onyenkuzi iwu nyefee N120m, ụgbọala n'aka Gọọmentị Etiti

    Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja enyela iwu ka otu onye nkuzi Primarị a hụrụ otu narị nde naira na iri abụọ n’akpaego ya n’ụlọakụ hapụrụ ya Gọọmenti Etiti.

    Ngalaba gọọmentị na-alụ ọgụ megide omume n'ezighị ezi nke ndị ọrụ Bekee a kpọrọ ICPC n'ịchafụ kpụpụrụ Oriakụ Rose Egbuha na-akụzị nkuzi n’Ozala Primary School dị n’Abagana,Anambra steeti ụlọikpe n’afọ 2020 maka inweta ọtụtụ ụgbọala nakwa ego ruru nde narị ise na ụma iri anọ n’akpaego ya n’ụlọakụ na-agbanyeghị na ụgwọọnwa ya bụ naanị puku naira iri asaa na isii.

    Nnyocha ICPC gosiri na ego ahụ bụ ego ahụ bụ ego si na mpụ nke a sara asa ma nye iwu ka ụlọakụ jichie ya.

    Mana Egbuha na ndị otu ya gara ụlọikpe dị n'Abuja nata ikike mmahapụ ma kerie ego ahụ n'ụlọakụ na ụlọọrụ na-agbanwe ego.

    Dịka ICPC si kwuo, ha kpụpụrụ Egbuha na ndị ya na kpara nkata ahụ gụnyere one James Erebouye, Emon Okune, Chisom Iwueke, Alonge Ojo, Maureen Chidimma, Owoyemi Mayowa, Ejeaka Ifeoma, na ụlọọrụ abụọ ụlọikpe maka itinye aka na mp.ụ nakwa izu ego enwetara site na mpụ.

    Ọkaiwu ICPC bụ Adesina Raheem, onye wepụrụ ikpe ahụ n'ụlọikpe n'afọ 2021, rịọọ ụlọokikpe ka e nye iwu ka Egbuha hapụrụ Gọọmentị Etiti ego ahụ na ụgbọala ndị ahụ.

    Rose Egbuha

    Ebe foto si, ICPC

  15. A maala onye gburu Hanifa Abubakar ikpe ọnwụ

    Hanifa Abubakar

    Ebe foto si, Hanifa Abubakar's family

    Ụlọikpe dị na Kano steeti amaala Abdulmalik Tanko ikpe ọnwụ maka ịtọrọ nwata akwụkwọ ya bụ Hanifa Abubakar dị naanị afọ ise, ma mechaa gbuo ya n’ọnwa Disemba afọ 2021 na Nasarawa Steeti.

    A mara Tanko na enyi ya nwoke bụ Hashimu Isiyaku ikpe ọnwụ n'ụbọchị Tọzde dịka ha kwuchara na ikpe mara ha n'ezie.

    Ụlọikpe ahụ makwara otu nwaanyị bụbu enyi nwaanyị Tanko ikpe, ma tụọ ya mkpọrọ afọ abụọ, maka inyere ya aka tọrọ nwatakịrị ahụ bụ Hanifa.

    Cheta na ọ bụ n'ọnwa Disemba 2021, ka Tanko tọọrọ nwata akwụkwọ ya bụ Hanifa, iji napụta nne na nna nwata ahụ ego.

    Mana o mechara gbuo nwata ahụ n'ihi na ọ matara ihu ya.

    A chọpụtara ozu Hanifa n'akụkụ ụlọ akwụkwọ ha ebe Tanko liri ya dịka o gbuchara ya.

  16. Anyị ga-ata ụlọọrụ BBC na Daily Trust ahụhụ maka ikwado iyi ndụ egwu - Lai Mohammed

    Lai Mohammed

    Ebe foto si, Mínístrí Mgbasaozi

    Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-ata ụlọọrụ BBC nakwa Daily Trust ahụhụ maka ihe onyonyo ha wepụtara gbasara ndị omekome na ndị na-eyi ndụ egwu na Naịjirịa.

    Lai Mohammed bụ minista omenala na mgbasaozi bụ onye kwuru nke a n'ụbọchị Tọzde n'Abuja.

    "Mgbe ụlọọrụ a ma ama dịka BBC nyere ndị omekome ohere igosi ihu ha dịka ndị ejije Nollywood... A chọrọ m ka ha mara na isi ha agaghị apụta na ya, a ga ata ha ahụhụ kwesiri ekwesi."

  17. Gọvanọ Abia steeti amapụtala nde N450 maka ịkwụ ndị nkuzi Abia Poly ụkwọ ọnwa

    Okezie Ikpeazu

    Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/facebook

    Gọvanọ Abịa steetị bụ Okezie Ikpezụ etinyela aka n'akwụkwọ maka iwepụta ego dị nde narị Naịra anọ na iri ise (N450,000,000) maka ịkwụ ndị nkuzị Abịa Poly ụgwọ ọnwa anọ n'ime ụgwọ e ji ha.

    Okezie kwuru nke a mgbe ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị ụlọakwụkwọ a kpotuuru ya n'obi ya ụnyaahụ.

    Ọ sị na ihe gọọmentị ji ha n'ụgwọ nrite a na-agwụ ha kwa ọnwa ruru nde narị Naịra itoolu (N90,000,000).

    O kwuru na gọmmentị ya akwụọla ndị ụlọakwụkwọ ahụ ihe karịrị ijeri Naịra asaa na ụma ofu kemgbe ọ malitere ọrụ na 2015.

  18. Únu abọọla e!

  19. Emmanuel Macron akpọọla ndị ọchịchị Afrịka "ndị iru abụọ"

    Onyeisiala France, Emmanuel Macron

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Onyeisiala France, Emmanuel Macron

    Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron akatọọla ndị ọchịchị Afrịka maka ịgba nkịtị n’okwu gbasara agha nke mba Russia na-ebuso mba Ukraine.

    Macron, onye nọ njem ugbua na mba atọ n’Afrịka, kwuru na nkịtị a ndị ọchichị Afrịka gbara gosiri na ha bụ ndị iru abụọ.

    O kwuru nke a na mba Cameroon mgbe ọ gara leta onyeisiala mba Cameroon bụ Paul Biya taa bụ Wenezde, Julaị 27.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mba Afrịka ekweghị ekwu ihe ọbụla iji katọọ Russia hoohaa maka agha ha na-ebuso Ukraine.

    N'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị afọ a, otu mba ụwa bụ United Nations nwere ọgbakọ ebe ha nọrọ katọọ mwakp Russia wakporo Ukraine, mana oge e mere ntuliaka na ya bụ ọgbakọ iji mata mba ole katọrọ Russia, mba Afrịka iri na asaa jụrụ isonye na ntuliaka ahụ.

    Gbasara nsogbu dị na Cameroon ugbua, Macron kwuru na ọ bụ mkparịtaụka nakwa mgbanwe ndọrọndọrọ ọchịchị ka nsogbu a ga-eji bịa n'isi njedebe.

  20. "Buhari nwere izuụka isii iji wulite ọnọdụ nchekwa maọbụ..." - Ndị omeiwu

    Ndị omeiwu

    Ebe foto si, Screengrab

    Ndị otu pati na-anọghị n’ọchịchị n’ụlọ omeiwu Sineti nke Naịjirịa enyela Onyeisiala Muhammadu buhari izuụka isii iji mee ihe a hụrụ anya gbasara ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa.

    Ha mere nke a n'ọgbakọ ndị omeiwu nke e mere n'Abuja taa bụ Wednesde.

    N'ọgbakọ ahụ, Philip Aduda bụ onyeisi ndị pati ọnụọgụgụ ha dị nta n'ụlọ omeiwu, weliri aka ma kwuo na ha kwesịrị itinye ọnụ n'okwu ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa, nakwa ihe Onyeisiala na-eme maka ya.

    Mana onyeisi ndị Sinet bụ Ahmad lawan gwara Aduda na okwu ya achịtaghị aja ọbụla.

    Nke a mere ka Aduda na ndị otu ya niile bilie ma si n'ọgbakọ ahụ pụọ n'iwe.

    Ha mechara kpọkọọ ndị ntaakụkọ ma kwuo na ha enyela Onyeisiala Buhari izuụka isii iji wulie ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa, ma ọ bụghị ya, ha ga-amalite atụmatụ iji chụtuo ya, nke bekee na-akpọ 'impeachment'.

    Nke a na-abịa dịka ngalaba agụmakwụkwọ nyere iwu ka e mechie ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị n'Abuja, n'ihi egwu na ndị ekperima nwereike ịwakpo ha.

    Mwakpo ndị ekperima 'bandits' na-akawanye njọ ugbua na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa.

    N'ụbọchị Tuzde, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Julaị afọ 2022, ndị ekperima wakporo otu ndị agha na-eche onyeisiala nche, a kpọrọ 'Guards Brigade', na mpaghara Kubwa/Bwari n'Abuja.

    Ndịagha Naịjirịa kwuru na ụfọdụ ndị otu ha merụrụ ahụ na mwakpo ahụ, mana akụkọ ụfọdụ na-ekwu na ihe ruru mmadụ atọ tụfuru ndụ ha na ya bụ mwakpo.