You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nnamdi Kanu trial: Etu ikpe ya si gaa taa - Emma Powerful

Otu Indigenous People of Biafra (IPOB) etinyela ọnụ n'etu DSS si jụụ ịkpọpụta Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Ka chi fonu

    Daalụ maka isonyere anyị na mgbasaozi nke ụbọchị taa.

    Onye a hụrụ taa, sị hụkwa ya echi.

    Ya gaziere gị.

  2. DSS kpọpụtara anyị Nnamdi Kanu onye ndu anyị - Emma Powerful

    Otu Indigenous People of Biafra (IPOB) akpọọla oku ka ụlọọrụ nchekwa DSS kpọpụta onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu maọbụ kwe ka ezinaụlọ ya na ndị ọkaiwu ya hụ ya anya.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ha wepụtara n'ụbọchị Mọnde maka ọ jụjụ DSS jụrụ ịkpọpụta Kanu n'ụlọikpe.

    Ọ sị na DSS kpachaara anya mee nke a iji hụ na ha gaara n'ihu ijichi onye ndu ha nakwa ịga n'ihu na-ata ya ahụhụ na-ekweghi ka a nụ olu kamgbe ụbọchị asaa.

    Ọ gaara n'ihu sị na obi ezughi ha ike maka ọnọdụ nchekwa Nnamdi Kanu n'aka ndị DSS n'ihi nke a na DSS kpọpụta Kanu ka ọha hụ ya anya.

    Powerful kelere ndị azụmaahịa, ndị ọkwọ ụgbọala, ndị ọrụ ụlọakụ nakwa ndị ọzọ dị iche iche maka nkwado ọ sị ha nyere Nnamdi Kanu n'oge ikpe ya a.

    O kelekwara ndị enyi ndị Ipob si n'agbụrụ ọzọ bịara kwụnyere Nnamdi Kanu nakwa Ipob n'ụlọikpe taa ma kpọọ oku ka a tọhapụ ndị a sị na a nwuchiri n'ụlọikpe taa.

  3. Ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii nwụchiri m n'ụlọikpe Nnamdi Kanu - Chukwuka Ofoegbu

    Chukwuka Ofoegbu, onye e ji Ijele Speaks mara, ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii nwuchiri ya n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde.

    Akụkọ na-efegharị na soshal midia na anwuchiri nwa amadi a dịka ọ na-enye nsogbu n'ụlọikpe ebe a nọrọ kpee Mazi Nnamdi Kanu ikpe.

    Mana Ofoegbu ekwuola na nke ahụ bụ asị.

    Lee nkọwa o nyere.

  4. Ndị aka ha dị na nwuchigharị Nnamdi Kanu ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor

    Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu onye ndu Ipob ekwuola na ndị ọchịchị aka ha dị na nwuchigharị ya na mba Kenya buru ibu.

    O kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere tupu ha wuchie n'ụlọikpe n'ụbọchị 26 ọnwa Julaị, afọ 2021.

    Ejiofor sị na ihe ka mkpa ugbua bụ ịgbapụta Kanu n'aka ndị gọọmentị Naịjirịa tupu ha gbawa ndị so nwuchie ya n'anwụ.

    O kwukwara na a nwuchiri Kanu na mba Kenya bụ ebe e tiri ya ihe ụbọchị asatọ tupu a kpọbata ya na Naịjirịa.

    Kirie ihe o kwuru n'uju.

  5. Ihe mere ndị ọrụ nchekwa DSS akpọtaghị Nnamdi Kanu n'ụlọikpe

    Dịka ehiwere ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob n'ụbọchị Mọnde 26 Julaị 2021 mana e ruru n'ụlọikpe ahụghị ya n'ụlọikpe dịka ndị ọrụ nchekwa DSS akpọpụtaghị ya.

    Ajụjụ juru ndị mmadụ n'ọnụ bụ "gịnị mere nwamadị a awuchighi n'ụlọikpe?".

    Na ngwụcha ikpe a, BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị bịara n'ụlọikpe ahụ ajụjụ ịmata ihe mere n'ụlọikpe a.

    Otu n'ime ha bụ Goddy Uwazuruike bụ ọkaiwu nọchiri anya Ohanaeze Ndigbo sị na ụlọọrụ nchekwa DSS kwuru na ọ bụ n'ihi ihe ha kpọrọ 'logistics reasons' mere a kpọtaghị Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.

    Mana Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu sị na o chere na ọ bụ n'ihi ọnọdụ ụlọikpe a ji nọọ taa mere a kpọtaghị Kanu n'ụlọikpe.

    Ọ sị na ọkaikpe Binta Nyako sị na a ga-anata ikike n'aka onyeisi ndị ọkaikpe Naịjirịa maka ezumike ndị ọkaikpe nọ ya tupu ikpe Kanu enwee ike gaa n'ihu.

    Ejiofor sị na ha ga-anata ikike ahụ na-atụanya na ikpe a ga-aga n'ihu dịka e yigharịrị ya n'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba.

    Aloy Ejimakor bụkwa otu n'ime ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu sị na ọkaikpe Nyako nyere DSS iwu ka ha e kwe ha hụ Kanu anya.

    Ọ sị tupu izuụka a agwụ na ha ga-ahụ Nnamdi Kanu anya.

  6. Ndị mmadụ pụtara n'igwe ịkwado Nnamdi Kanu na-agbanyeghị mmiri na-ezo

    Lee etu ndị mmadụ siri pụta n'igwe were kwado Nnamdi Kanu dịka ebidoro ikpe ya taa n'Abuja.

  7. 'Nnamdi Kanu abụghị ekperima' - Ọkaiwu Goddy Uwazuruike

    Ọkaiwu Goddy Uwazuruike so na ndị ọkaiwu biara ihụ ka ikpe Nnamdi Kanu ga-esi aga ekwuola ihe ndị ọ hụrụ dịka ebugharịchara ikpe ahụ.

    Uwazuruike kwuru na aka Nnamdi Kanu dị ọcha ruo mgbe e mechara nnyocha ụlọikpe na-eme ya.

    “E kwesiri ime ihe dị mma.”

    "A gaghị eme ikpe ya dịka ihe a na-ahụ na North Korea maọbụ na China makana Naịjirịa na-eme ọchịchị onye kwuo uche ya dịka nke ndị mba ofesi."

  8. Lee etu Ekeoha shopping plaza si tọgbọ chakoo maka ikpe Nnamdi Kanu

    Iji gosi nkwado ha maka ikpe Nnamdi Kanu, Ekeoha Shopping Plaza nke dị n'Aba mechiri emechi.

    Ọdọ ahịa na-ekwop ekwo ọkachasị n'ụbọchị Mọnde.

    Kama ọtọgbọ taa ka ebe a gbara ọsọ.

  9. Ihe ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru dịka ekpechara ikpe taa

    Dịka ọkaikpe kwuru ka ebugharịa ụbọchị ikpe Nnamdi Kanu gaa ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa oktoba, lee ndị ọkaiwu ya nwere ikwu -

  10. 'E ji egbe si anyị mechie ụlọahịa anyị n'Anambra' - Onye na-azụ ahịa n'Anambra steeti

    Nwa amadi na-azụ ahịa n'Anambra steeti ekwuola ka ndị ji egbe si kwụsị ndị na-eme njem na Nnewi.

    O kwuru na ebe elekere ise nke ụtụtụ ọ na-akwado ime njem ka ụfọdụ ndị bu AK 47 chụsasia ndị mmadụ ma si ha na onweghị onye na-aga ebe ọbụla makana ikpe Nnamdi Kanu na-aga n'ihu taa.

    N'ọnụ ya, "ndị ahụ ji egbe malitere na-akụwa ụgbọala Sienna na-eme njem n'ụtụtụ ahụ,

    "Chukwu mere ebere o nweghị onye nwụrụ na ya bụ nwakpo."

    O kwuru na ugbua ezigbo ụjọ ji ndị mmadụ.

    O kwuru na ihe a metụtara ndị na-azụ ahịa, ndị na-eme njem, nakwa ndị na-akwọ ụgbọala nọ na Nnewi.

    O kwuru na ha kwuru ka onye ọbụla baa n'ụlọ, ọ bụ na ha amaghị na Nnamdi Kanu na-aga ụlọikpe taa.

  11. Nnamdi Kanu trial: E bugharịala ụbọchị ikpe Nnamdi Kanu gaa 21st Oktoba, 2021

    Ebuharịala ikpe Nnamdi Kanu gaa ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Oktoba afọ 2021.

    Ndị ọkaiwu nwere nkwekọrịta a maka ya bụ ụbọchị.

  12. Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru Ụnyaahụ maka Ikpe taa

    Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyị Ejiofor ekwuola okwu dị mkpa maka ikpe Nnamdi Kanu taa.

  13. Ọkaikpe enyela iwu ka enye ndị ọkaikpe Nnamdi Kanu ohere ka ha hụ ya

    Ọkaikpe Binta Nyako ekwuola na obi adịghị ya mma na Nnamdi Kanu anọghị n'ụlọikpe.

    Ọ dọrọ aka na ntị na ya agaghị anabata ụdịrị ikpe a ọzọ.

    Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ alloy Ejimakor kwuru na ekweghị ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu ka ha hụ ya.

    Okaikpe nyere iwu ka enye ndị ọkpaikpe Kanu ohere ka ha hụ ya.

    Ọkaiwu Nnamdi Kanu kwukwara ka akpọfee Nnamdi Kanu n'ụlọ nga nke ga-enye ha ohere ịleta ya.

    Kama Ọkaikpe ekweghị.

    Ha kwuru na arịrịo ha bụ maka nchekwa Nnamdi Kanu.

  14. Ebidola Ikpe Nnamdi Kanu kama ọnọghị n'ụlọikpe ugbua

    Ebidola ikpe Nnamdi Kanu n'ụlipe dị n'Abuja kama Kanu na onwe ya anọghị n'ụlọikpe ugbua.

    Okaikpe Binta Nyako anọrọla ọdụ, akpọpụtakwala ikpe a .

    Dịka anyị siri ghọta, ndị okaiwu Ohaneze na ndị ọkaikpe ndị ọzo nọ ebe ahụ.

  15. Ụfọdụ ndị na-eme njem n'park dị n'Aroma jụnction' dị n'Awka tọrọ atọ

    Ndị na-ame njem na 'Park' dị n'Aroma Juction' ahụghị ụgbọala ha ji eme njem n'ihi na ndị ụlọọrụ ụgbọala ama ama na park ahụ abiaghị ọrụ maka iji kwanyere ikpe Nnamdi Kanu na-aga n'ihu n'Abuja ugbua.

    Onye ntakụkọ BBC hụrụ na ọ bụ naanị ndị ọkwọ ụgbọala na-agba n'ime obodo pụtara taa.

  16. Anwụchiela Omoyele Sowore n'ogige ụlọikpe Nnamdi Kanu!

    Ndị uweojii nke onye ndu ha bụ A.A Hassan anwụchiela Omoyele Sowore!

  17. E gbochiela ụzọ n'ụfọdụ ebe dị n'Anambra steeti maka ikpe Nnamdi Kanu

    Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Indigenous People of Biafra(Ipob) egechiela ụfọdụ okporoụzọ dị n'Anambra steeti iji wee kwado ikpe onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

    Lee okporoụzọ ndị ahụ.

  18. Nnamdi Kanu trial today: Chukwu Emeka Ezeife na ndị ọzọ nọ n'ime ụlọ ikpe maka IKpe Nnamdi Kanu.

    Chukwuemeka Ezeife bụbu gọvanọ Anambra steeti nọ n'ụlọikpe maka ikpe Nnamdi Kanu.

    Lee etu ime ụlọikpe a dị.

  19. Nnamdi Kanu court: Lee ndị ọkaiwu a na-ekweghị banye ụlọikpe ebe a na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe n'Abuja.

    Ọtụtụ otu na ndị mmadụ dị iche iche kpọtara ndị ọkaiwu ha kama ekweghị ha banye n'ime ya bụ ụloikpe.

  20. Nnamdi Kanu in court today: 'Ekweghị m banye ụlọikpe' - Omoyele Sowore

    Onye zọbụrụ ọkwa onyeisiala Naijirịa ma bụrụ kwa onye bidoro otu 'Revolution Now' bụ Omole Sowore awụchiela n'ụlọikpe ebe a ga-ekpe Nnamdi Kanu ikpe kama o kwuru na ekweghị ya banye.

    O kwuru sị, " Anyị nọ ya, ọnye atụla ụjọ".