You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Lee ka ọkụ si gbaa ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo dị na Lagos

Ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo bụ ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala na Legọs, nwurula ọkụ n'isi ụtụtụ Sọnde.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Ka chi bọọ

    Daalụ maka ịnọnyere anyị taa.

    Ihe ọma rukwaa gị aka.

    Iseee!

  2. Ndị oji egbe atọrọla ụmụakwụkwọ na Niger steeti

    Ndị oji egbe a na-amabeghi ndị ha bụ ji ọgbatumtum wakpoo ma tọrọ ụmụakwụkwọ 'Salihu Tanko Islamic school' dị n'obodo Tegina, n'okpuruọchịchị Rafi dị na Niger steeti.

    Ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ndị omekome a gbagburu otu onye na mwakpo a ha mere ebe elekere atọ nke ehihie Sọnde, ụbọchị 30 nke ọnwa Mee,2021.

    Wasiu Abiodun bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ kwukwara na amabeghi ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ ole a tọrọla na ya bụ mwakpo, mana ha ezipula ndị otu ha ịga tọhapụ ndị a tọrọla.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii akpọọla oku sị ndị mmadụ atụla ụjọ n'ihi na ndị ọrụ nchekwa ga-agba mbọ ịhụ na atọghapụrụ ụmụakwụkwọ ahụ na-enweghi ihe ọbụla mere ha.

  3. 'Ọ bụ obodo dị na Benue ka ndị ọchị ehi wakporo, ọ bụghị Ebonyi'

    Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị ọchị ehi wakporo otu obodo na steeti ahụ n'isi ụtụtụ Sọnde, Mee 30, 2021, dịka akụkọ si na-efegharị.

    Ha kwuru na ọ bụ obodo Nwori Ndobasi na Odoke dị n'okpuruọchịchị Ado dị na Benue steeti, ka ya bụ mwakpo na ogbugbu mere.

    Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ụfọdu ndị si n'okpuruọchịchị Ebonyi gafee Ado ịzụ ahịa dịka ha si emekarị kemgbe afọ ole ma ole, zutere ya bụ mwakpo.

    Aliyu Garba bụ kọmishọna uweojii steeti ahụ gara n'ihu sị ndị mmadụ atụla ụjọ dịka ha na-agara mkpa ha, n'ihi na ndị uweojii etinyechaala usoro ha ga-eji echekwa ndụ na ngwongwo ha.

    N'otu aka ahụ, Stanley Okoro Emegha bụ Kọmishọna na-ahụ maka ikpe udo na igbo esemokwu gbasara okeala n'Ebonyi steeti, kwuru na ha ezipula ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị Ebubeagu ga-echekwa obodo Okwofuruike, Odoke na Ohabuleodo dị n'okpuruọchịchị Izzi na Ebonyi dị nso ebe mkpamkpa a kpara.

    Emegha kwukwara na gọọmentị Ebonyi ga-akwụ ụgwọ nlekọta ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ, dịka gọọmentị ga-ekesakwara ezinaụlọ ndị ihe metụtara ihe enyemaka.

  4. Jiri otu nkeji gere akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

  5. Etu ọkụ si gbaa ụfọdụ akụkụ ahịa Ladipo

    Ndị na-azụ ahịa n'ụfọdụ akụkụ Ladipo na-ebe akwa maka etu ọkụ si gbatọchaa ụlọ azụmahịa ha.

    Ha kwuru na ọkụ ahụ malitere n'ụtụtụ ụbọchị ụka bụ May 30, 2021

    Ndị azụmahịa akụrụngwa ụgbọala na-ekwu na o nweghị ihe ha ji pụta makana ọkụ gbariri ụlọahịa ha kpamkpam.

    Onyeisioche ahịa Ladipo bụ Ernest Ajuluchukwu kwuru na ọ bụ ndị mmenyu ọkmụ gọọmenti Lagos steeti bia menyụọ ọkụ ahụ.

    Ha na-arịọ ka gọọmenti nakwa ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu gbatara ha ọsọ enyemaka maka ọdachị dakwasara ha.

  6. Praim minista mba UK alụọla ụtọ obi ya, Carrie Symonds

    Boris Johnson bụ praim minista mba UK alụọla ọ dị ya n'obi bụ Carrie Symonds n'emume ha zoro ezo kwado ma mee n'ụlọụka "Westminster Cathedral."

    Ọnụ na-ekwuru Johnson kwuru na ya bụ emume mere na "Downing Street" n'ụbọchị satọde May 28,2021.

    O kwuru na Johnson na nwunye ya ga akpọkọba ndị enyi naezinụlọ n'oge ọkọchị na-abianụ.

    Mazi Johnson bụ praim mịnista mbụ kamgbe afọ narị abụọ garalanụ (200 years)na-alụ nwaanyị dịka ọ nọ n'oche ọchịchi mba UK.

    Ọ bụ eziokwu na nke a abụghị mbụ Johnson na-alụ nwaanyị mana ụlọụka Katọlịk na-ekwe ka ndị gbarala alụkwaghịm lụgharịa nwaanyị maọbụ na ha lụbụrụ nwaanyị n'ụlọụka ọzọ.

  7. Olu ajọ mmụọ achụlala ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha

    Ndị isi ụlọakwụkwọ St Claire’s Anglican Girls Grammar School, Offa, Kwara steeti emechiela ụlọakwụkwọ ahụ maka ihe ha na-eche na ọ bụ "ọlụ ndị ajọ mmụọ gbagọjuru anya" ha nụrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ ụbọchị May 28,2021.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Nigeria Security and Civil Defense Corps (NSCDC) dị na Kwara steeti bụ Babawale Afolabi gwara BBC na ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ nọ n'eti mkpu mgbe ha nụrụ olu ajọ mmụọ ahụ.

    O kwukwara na udiri ụjọ ji ụmụakwụkwọ nakwa ndị nkuzi ha mere ka e mechie ụlọakwụkwọ ahụ ma gwa ndị nne na nna ka ha bia kpọrọ ụmụ ha lawagodu ruo mgbe ha ga agwa ha laghachite.

  8. A hụla udiri ọrịa covid ọzọ na mba Vietnam

    Mba Vietnam ahụla udiri ọrịa covid ọzọ gụnyere njịkọ udiri ọrịa covid dị na mba India nakwa UK nke nwerike is i n'ikuku fesaa ọsịsọ.

    Mịnista ahụike mba ahụ bụ Nguyen Thanh Long kwuru na chọpụta ọhụrụ a(udiri ọrịa covid ọzọ) ha hụrụ n'bọchị satọde May 29,2021 dị ezigbo njọ ma na-echekasị ha uche.

    Kamgbe ọrịa covid malitere n'afọ Janaury 2020, a hụla ọtụtụ udiri ya ọzọ nke ndị ọkamụta na-akpọ 'mutations' na bekee.

  9. Gere akụko dị mkpa n'ụtụtụ a n'otu nkeji

  10. Ụmụakwụkwọ mahadum Greenfield enwerela onwe ha

    Ụmụ akwụkwọ Greenfield University nke dị na Kaduna atọọrọ kamgbe ọnwa Aprel n'ụlọ akwụkwọ ha enwerela onwe ha.

    Ọ bụ n'ụbọchi satụde ka atọhapụrụ mmadụ iri na anọ a n'okporo ụzọ sitere Kaduna gawa Abuja.

  11. Anyị egbuola mmadụ anọ n'ime ndị chọrọ ịwakpo ụlọọrụ anyị - Imo Police

    Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha ememiela ndị omekome anọ dịka ha chọrọ ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii nke dị n'Izombe, Imo Steeti n'abalị satụde.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahu bụ Bala Elkana kwuru nke a ma sị na ndị uweojii ka na-arụ kwa ọrụ ha iji hụ na ejidechara ndị a na-enye obodo nsogbu.

    N'otu aka ahụ ka Kọmịshọna ndi uweojii na steeti ahụ bụ Abutu Yaro toro ndị uweojii maka ike ha kpara ma gbaa ha ume ka ha jisie ike n'ọrụ were nwuchie ndị niile na-enye obodo nsogbu.

  12. Unu abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  13. Gaanụ ụka ụbọchị ụka, unu egekwala 'sit-at-home' ọbụla ntị - Gọọmentị Imo steeti

    Gọọmentị Imo steeti akpọkuola ndị steeti ahụ ọkachasị ndị ụka Kraịst ka ha gaa ụka ma gbachi iwu 'sit-at-home' ndị na-achọ nnwereonwe Biafra tinyere nkịtị.

    Declan Emelumba bụ Kọmishọna Mgbasaozi steeti ahụ kwuru na enweghi onye nwere ikike ịkwụsị ndị mmadụ ife Chukwu maọbụ napụ ha ikike ha nwere ime okpukperechi ha nakwa nke ngagharị ha.

    Emelumba kwuru na ndị mmadụ atụla egwu dịka ha na-aga mkpa ha, na ha ga-enwe ezi nchekwa.

    O kwukwara na ọ bụ ihe ọjọọ na otu ọbụla ga-egbochi ndị mmadụ ife Chukwu nakwa ịchọrọ ihe ha ga-eri n'ihi 'nọrọ n'ụlọ'.

    O kwuru na gọọmentị etinyela usoro nchekwa dị iche iche iji gbochie ndị ga-achọ imekpa ndị mmadụ na-agara mkpa ha ahụ, ma kwuo na gọọmentị enyela ndị nchekwa ikike igosi onye ọbụla chọrọ inye nsogbu dịka ịnagide ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ, ihe ọkụ ji ntị oke eme.

    Emelumba kwuru na gọọmentị enyela ndị ji egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ nke iwu akwadoghi ụbọchị ise iji wega ha n'ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso.

    O kwuru na gọọmentị ga-agbaghara ndị ọbụla tụhapụrụ ngwaọgụ ha n'ime ụbọchị ise ahụ, ebe ndị na--ekweghi eme ya ga-ata ahụhụ dị n'elu ya.

  14. Jiri otu nkeji gere akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

  15. Ndị agha Naịjiria egbuola ndị Boko Haram iri, napụta ha ngwaọgụ

    Ndị agha Naịjiria ekwuola etu ha si bibie ndị Boko Haram iri ma napụta ha ngwaọgụ ha n'obodo Rann dị n'okpuruọchịchị Kala Balge dị na Borno Steeti.

    Mohammed Yerima bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjiria, kwuru na ndị oyi ndụ egwu ahụ bucha ụgbọala e ji agba egbe nakwa ụdịri egbe ndị ọzọ na-anyị ajọ arụ, nwara ịbata obodo ahụ mana ndị agha nyere ha ọsọ.

    Ha mebikwara otu ụgbọala ahụ ma napụta ha egbe ruru iri na otu.

  16. Ụmụ Naịjiria ka ga-ahụ ihe ga-atụ ha n'anya n'afọ abụọ fọrọ ọchịchị a - Femi Adesina

    Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ nye Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe gbasara Mgbasaozi, ekwuola na ọchịchị Buhari ka ga-eweta ihe ga-atụ ndị Naịjiria n'anya n'ime afọ abụọ ọ fọrọ ka ha chịzuo.

    Adesina kwuru nke a dịka ọ na-eme ncheta afọ isii Buhari banyere ọchịchị Naịjiria.

    Adesina gụpụtara ọrụ niile ọ sị na ọchịchị Buhari weterala na Naịjiria n'ime afọ isii a, me ebe ọ metụtara ma ọrụ ugbo, mmanụ agbịdị, ụlọ, ọkụ, ụzọ nakwa ihe ndị ọzọ.

    O kwuru na ọbụlagodi onye kpuru isi ga-ahụ ihe ndị Onyeisiala Buhari na-arụ na Naịjiria.

    Lee ihe o kwuru n'uju ebe a:

  17. Onyeisiala Buhari anatala ọgwụ mgbochi Astrazeneca nke abụọ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari anatala ọgwụ mgbochi Covid-19 ya nke abụọ.

    A gbara ya nke AstraZeneca/Oxford n'obi gọọmentị ya taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Mee.

  18. Mmadụ iri isii na atọ ọzọ ebutela ọrịa Covid-19 na Naijirịa

    Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ iri isii na atọ ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa.

    Legọs steeti kachasị dịka mmadụ iri abụọ na ise butere ya ọhụrụ, Ondo steeti nwere mmadụ iri abụọ na abụọ ọzo, Rivers mmadụ isii, Akwa Ibom mmadụ atọ, Kaduna mmadụ atọ kwa, Kwara abụọ ebe otu onye otu onye si Ebonyi na Abuja.

  19. Gere akụkọ ụtụtụ taa, n'otu nkeji

  20. Ozu ndị mmadụ mmiri riri na Kebbi steeti eruola 76

    Ozụ ndị mmadụ achọtarala n'obodo Warra, nke dị na Kebbi Steeti dịka ụgbọ mmiri bụ ihe ruru mmadụ narị abụọ kpuru n'ụbọchị Wenesde eruola iri asaa na isi.

    Ọ bụ onyeisi ode akwụkwọ ndị ntaakụkọ na steeti ahụ bụ Abubakar Muazu gwara ndị ntaakụkọ nke a .

    Muazu kwuru sị, " dịka o siri dị, achọtala ozu mmadụ iri asaa na isii".

    O kwu kwara na ndị ọrụ gbatagbata na ndị ụlọọrụ ndị ọzo ka na-achọ ozu mmadụ ndị ọzọ.

    Nzụkọ gọvanọ ugwu egosila obi uju ha maka ya bụ ihe mberede ebe gọvanọ steeti ahụ bụ Abubakar Atiku Bagudu garụrụ ebe ihe a mere ma zịgara ndị ọmetụtara ozi iti aka n'obi.