Ụmụ nwoke abụọ anyụpụtala ọgwụ 'Cocaine' na Heroin n'ọdọụgbọelu Legọs

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Ngalaba na-ahụ maka ịkwụsị ọgwụike mgbasa na Naịjirịa bụ NDLEA n'ịchafụ ejidela ụmụ nwoke abụọ chọrọ ịbu ọgwụike Cocaine na Heroin aga mba UK na Amerịka.
Ngalaba ahụ kwukwara na nwoke abụọ ahụ nyụpụtara ihe ruru ọgwụ otu narị na iri itoolu na otu dịka edebere ha na nyocha.
Ha jidekwara onye ọzọ n'ụbọchị Fraịde si mba Brazil bata Legọs ma nyụpụta ọgwụ ruru iri itoolu na itoolu due ugbua.
Onyeisi ngalaba ahụ bụ Buba Marwa dọọrọ ndị niile na-agba mgbere ọgwụ ike aka na ntị ma sị ha na ozugo bụ na ozugo.
O jikwa ohere ahụ kelee ndị ọrụ ya niile sị ha jisike na mbọ ha na-agba megide ọgwụ ike.










