Ihe gọọmentị sị ha ga-emere ndị Ebonyi maka mwakpo dakwasịrị ha

Gọọmentị etiti ekwela nkwa inyere ndị Ebonyi Steetị aka na mwakpo e mere ha n'izuụka a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Gọọmentị etiti aṅụọla iyi imemina ndị ọchịehi kpara arụ n'Ebonyi Steetị

    Osinbajo na Umahi

    Ebe foto si, Ebonyi State Government

    Gọọmentị etiti aṅụọla iyi ịnwuchi ndị ọchịehi ahụ aka ha dị n'ogbugbu ndị mmadụ nakwa ịla akụnaụba n'iyi n'Ebonyi Steetị.

    O nyekwara ndị ọrụ gbatagbata na ministri na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ ka ha gbapụ ya ọsọ n'ike ndị nke a onyinye iji tie ha aka n'obi.

    Ososte onyeisiala bụ Yemi Osinbajo kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta n'Ebonyi Steetị ịhụ ka ihe siri mee nakwa ihe ndị e mebiri n'ihi ọgbaghara dapụtara n'ọtụtụ obodo dị na steetị ahụ.

    Osinbajo bụ onye kwara arịrị maka ihe ndị lara n'iyi sị na gọọmentị agaghị agbanye ndị Ebonyi azụ n'oge ihe mwute a.

    Ndị ndu obodo

    Ebe foto si, Ebonyi State Government

    Ọ gakwara n'ihu rịọ ka ndị Ebonyi asịkwala ka ha were aka ha bọọ ọbọ ihe ndị ọchịehi mere ha kama na gọọmentị ga-esi imi n'ala chọpụta ma taa ndị a ahụrụ ruru ha.

    Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ David Umahi n'okwu sị na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ anatala ọtụtụ mkparị site n'aka ndị ha na-achị n'ihi oke nwakpo ndị ọchịehi na mpaghara ahụ.

    Ọ sị ka gọọmentị etiti hụ na a tara ndị ahụhụ ma nye ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ikpe ziri ezi.

    Umahi gwara gọọmentị etiti ka a kwụọ ndị obodo Ezza/Effium ego dị ijeri naịra abụọ iji rụzie ụlọ ha na akụnaụba ha lara n'iyi.

    Ebe ọ sị ka e nyekwa ndị Ishielu ebe ndị ọchịehi gburu ndị mmadụ ego dị ijeri naịra atọ iji tie ha aka n'obi maka ọnwụ ezinaụlọ ha.

    Ndị ọzọ bịara nzukọ a gụnyere ndị Eze ọdịnala, ndịisi ụka Kraịst ndị ndu obodo nakwa ndị ọzọ.

  2. Ihe Obasanjo, Sheikh Gumi na ndị ọzọ kpatara na nkata ime ụlọ

    Obansanjo na Sheikh Gumi

    Ebe foto si, Obansanjo na Sheikh Gumi

    Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obansanjo, onye nkuzi okpukpere alakụba bụ Sheikh Abubakar Gumi na ndị ọzọ zutere maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

    Nke a mere mgbe Sheikh Gumi kpọ ndị ndu ọzọ si na mpaghara ugwu ga-azute Obasanjo n'ụlọ ya dị n'Abeaokuta, Ogun Steetị n'ụbọchị 4 Eprelụ, 2021.

    Obansanjo, Sheikh Gumi na ndị ọzọ.

    Ebe foto si, Obansanjo na Sheikh Gumi

    Ụfọdụ mkpebi gbara ọkpụrụkpụ pụtara na nzụkọ ha mere gụnyere;

    • Okwu banyere ekperima, ntọrị, ohi, iyi ndụ egwu na ndị ọzọ bụ ihe zuru Naịjirịa niile ọnụ. Ndị mpaghara niile na-eme ya na-agbanyeghi na e nwere mpaghara na-eme ya karịa ibe ha.
    • Anyị agaghị akwado mpụ n'ụzọ ọbụla; n'okwu ọnụ, n'akparama agwa. Ọnọdụ nchekwa akarịala ibe nke mere anyị ji enwe ọgbakọ a.
    • Ha sị na ha hụtara nsogbu na-emekaarị n'etiti ndị Fulani na ndị obodo ọzọ ọkachasị na mpaghara ugwu. Ha chọpụtara na ohere agụmaakwụkwọ ahataghị na mpaghara Naịjirịa niile nakwa etu ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji nke kwara ngwa ọrụ.
    • Ha kpebiri na igbo nsogbu a ga-abụ nke gụnyere nwa mgbe nta, ogologo oge, tinyere ịta ndị mere ahụhụ nakwa iti ndị o metụtara aka n'obi.
    • Ha sị na ndị Naịjirịa niile chọrọ ọdịmma Naịjirịa ga-etinye aka n'igbo nsogbu nchekwa ndị a ma kwụsị ịta ndị ọchịchị ụta; ịkpa oke agbụrụ, nke okpukperechi maọbụ nke ebe onye si ma a bịa n'okwu banyere nchekwa.
    • Ha kpebiri sị ka e nwee nkwanyeta ugwu, ịhụnanya, ịdị n'otu, nzirita ozi n'ogogo ọbụla ma kwụsị ịnabata maọbụ ịkwado mpụ.
    • Ha sị na gọọmentị steetị ga-agba mbọ ịchọta ụzọ ha ga-eji na-echekwa ndụ na akụnaụba ndị steeti ha.
    • Ebe gọọmentị etiti ga-achịkọta amamihe banyere nchekwa obodo ọnụ ma tinye iwu ga-ezu obodo niile ọnụ banyere ọnọdụ nchekwa.

    Ihe ndị ọzọ ha rụtụrụ aka gụnyere agụmaakwụkwọ, ọrụ, azụmaahịa na ihe ndị ọzọ.

    Obansanjo na Sheikh Gumi

    Ebe foto si, Obansanjo na Sheikh Gumi

  3. BBC Nkeji mgbede

    Gere akụkọ BBC Igbo n'ime otu nkeji.

  4. Ụta dịịrị ndị ọchịchị maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa - Bishop Kukah

    Bishop Kukah

    Ebe foto si, Bishop Kukah

    Bishọp ụka Katọlik nke Dayọsis Sokoto bụ Mathew Kukah katọrọ etu ọchịchị dị ugbua ji chụsọ ihe banyere ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

    N'ozi Easter o wepụtara na Sọnde, a kpọrọ 'Tupu ebubo anyị apụọ', Bishọp Kukah sị na Boko Haram na-erepịazi obodo Naịjirịa n'ihu anya onyeisiala Buhari.

    Ọ sị na i cheta mgbe onyeisiala Buhari were ọchịchị n'afọ 2015 na ọ kwuru na Boko Haram bụ obere ọkụ na-ebute nnukwu ọkụ.

    Mana Kukah sị na ugbua n'ihu Onya onyeisiala Buhari, obere ọkụ ahụ ji nwaanyọ malite ire na-achọzi irepịa obodo.

    O kwuru "Na-agbanyeghi na nsogbu na-arị elu ụbọchị niile, mana ihe anyị ga-eme bụ ị na-ekpesi ekpere ike."

    Ọ gara n'ihu katọọ ndị nọ n'ọchịchị maka etu ekperima, ntọrị, iyi ndụ egwu nakwa izu ohi ji arị ibe ya elu maka na ndị a na-achọ ọdịmma ndị ntọrị ahụ karịa nke ndị a na-atọrọ.

  5. Unu adala mba n'oge ihe ọjọọ a - Pope Francis

    Pope Francis

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisi ụka Katọlik n’ụwa bụ Pope Francis agwaala ndị ụka Kraịst ka ha ṅaa Chineke ntị n’oku mmalite ọhụrụ ọ na-akpọ ha n’oge emume Easter a.

    Nke a dị n'ozi Easter ya a kpọrọ 'Urbi et Orbi' nke ugboro itoolu, o nyere n'ụlọụka St.Peter's Basilica.

    Pope Francis kwuru na njem mbụ Jesua Kraịst mere na Galilee n’oge mbilite n’ọnwụ ya gosipụtara mmalite ọhụrụ.

    Pope sị "ọ dị mfe ịmalitekwa ọhụrụ makana na ndụ ọhụrụ dị nke Chineke nwere ịkpalite n'ime anyị na-agbanyeghi erughi eru anyị"

    Ozi nke ọzọ bụ ma ịga Galilee pụtara ka i mepee obi gị ịmata Chineke nwereike ime ihe ga-atụ gị n'anya. O kwuru na "Okwukwe abụghị ihe mgbe ochie makana Jesus abụghị onye mgbe ochie."

    Pope gara n'ihu kwuo na Jesus hụrụ anyị n'anya na-agbanyeghi nsogbu na-adapụta kwa ụbọchị niile.

  6. BBC Nkeji

    Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.

  7. A tọhapụla kọmishọna Anambra Steetị ahụ a tọọrọ na mwakpo Charles Soludo

    Kọmishọna na-ahụ maka akụrụngwa e ji ebi ndụ n'Anambra bụ Emeka Ezenwanne

    Ebe foto si, Emeka Ezenwanne/Facebook

    Emeka Ezenwanne bụ kọmishọna na-ahụ maka akụrụngwa e ji ebi ndụ a kpọrọ 'public utilities' n'Anambra Steetị ndị ntọrị tọọrọ n'ụbọchị Wenesde e nwerela onwe ya.

    Ndị uweojii Anambra Steetị mere ka ọha mata na a tọhapụrụ Ezenwanne n'ụtụtụ ụbọchị ụka Easter 4 Eprelụ afọ 2021.

    Ha sị na ọ bụ mgbe ndị ọrụ ha na-achọsi ndị ntọrị ike mere ha jiri tọhapụ ya ma rie mbọmbọ ọsọ, ha sị na ọkọ ọbụla akọghị ya.

    Cheta na ndị uweojii anwụchiela mmadụ anọ bụ ndị a sị na aka ha dị na mwakpo mere e ji tọrọ kọmishọna a.

    Akụkọ yiri ibe ya

    N'ozi emume Easter nke odeakwụkwọ gọvanọ Willie Obiano bụ James Eze wepụtara, gọvanọ Obiano sị na ndị omekaome chere steetị ahụ aka mgba nso nso a mana ha ga-emeri dịka steetị nwere ezi nchekwa.

    "Anyị ga na-amụ anya na eche nche iji hụ na e chekwara ndụ na akụnaụba nke Anambra Steetị".

    Gọvanọ Obiano kelekwara ndị uweojii Anambra Steetị maka mbọ ha gbara n'oge a wakporo onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Charles Chukwuma Soludo tinyekwara inwuchi mmadụ anọ a na-enyo enyo.

  8. Nkeji BBC Igbo

    Gere akụkọ ihe mere n'ụwa n'otu nkeji nke BBC Igbo.

  9. Onyeisiala Buharị akatọọla ogbugbu ndị mmadụ n'Ishie Ebonyi Steetị

    Onyeisiala Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Presidency/Twitter

    Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu egburu ndị mmadụ n’obodo atọ dị n’okpuruọchịchị Ishielu nke Ebonyi Steetị n’ụbọchị Mọnde.

    Nke a si n’aka onye enyemaka ya bụ Garba Shehu bụ nke o wepụtara n'akara Twitter.

    O nyere ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha sie imi n'ala ma chọpụta ndị kpara arụọ iji taa ga ahụhụ ruru ha.

    O tikwara ezinaụlọ ndị nke a metụtara aka n'obi nakwa ndị obodo niile dị n'Ebonyi nke a metụtara.

    Onyeisiala Buhari gaara n’ihu katọọ mwakpo a wakporo Charles Chukwuma Soludo bụbu onyeisi ụlọakụ etiti ma tie ya aka n'obi n'ihi nke a.

    Ọ kwara arịrị etu e si ebubata ngwaagha dị iche iche na Naịjirịa ugbua ma kwee ngwa na gọọmentị na-agba mbọ ịkpachi ngwaagha ndị dị n'aka ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi.

    Ọ sị na gọọmentị ga-aga n'ihu n'ịkwado ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa ọzọ na Naịjirịa iji hụ na e chekwara ndụ na akụnaụba ndị Naịjirịa.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  10. Liverpool amịkpọọla Arsenal ka azụ mangala e ji esi ofe nsala

    Arsenal na Liverpool

    Ebe foto si, Getty Images

    Liverpool mere ndị Arsenal ụra aba n'anya n'ụbọchị Satọde site n'iji ọkpụ goolu atọ chara acha merie ha n'asọmpi Premier League.

    Nke a mere n'agbanyeghi na Arsenal nọ n'ụlọ ha mgbe Liverpool mere ha "o tiri nwata ihe n'ihu nne ya".

    Goolu mbụ si n'aka Diogo Jota nke Liverpool na nkeji 64', ebe nke abụọ si n'aka Mohamed Salah na nkeji 68' bụ nkeji anọ nke mbụ gachara.

    Arsenal malitere ịzọ onwe ha azọ mana tupu ha na-ama ihe ekwe na-akụ, Diogo Jota nyere goolu nke atọ nke Liverpool na nkeji 82'.

    Ugbua Arsenal nọzị na ndị itoolu na tebụlụ Premier league ebe Liverpool nọ n'ogogo ise.

  11. Igbo ndị ọma anyị ekele ooo

    Ka udo chịa n'ime ndụ unu n'emume ncheta mbilite n'ọnwụ nke kraịst.

  12. Ekpere na-aga elu dịka DMX na-azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ ugbua

    DMX

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị mmadụ gụnyere ndị a ma ama na-ekpe ekpere ugbua dịka otiegwu a ma dịka DMX nke ezigbo aha ya bụ Earl Simmons nọ n'ụlọogwụ ebe a na-azọ ndụ ya.

    BBC amabeghi nke bụ eziokwu n'ihe bugara nwaamadi a n'ụlọọgwụ, mana kepukepu si n'ụlọntaakụkọ TMZ dị na mba Amerịka na-akọwa na DMX dị afọ 50 ṅụfere ọgwụ oke n'abalị Fraịde.

    Ka ọ dị ugbua, enwebeghi onye ezinaụlọ DMX tinyerela ọnụ n'okwu a ikwu 'eeh' maọbụ 'mba' n'akụkọ a na-efegharị.

    Ndị a ma ama tinyerela ọnụ n'okwu a gụnyere Ja Rule bụ otiegwu, onye kwuru "ekpere na-aga elu n'isi nwanne m nwoke DMX".

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Missy Elliott bụkwa otiegwu tinyekwara ọnụ na ya bụ ekpere

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Viola Davis bụ ome ejije na Hollywood tinyekwara ọnụ na ya bụ ekpere:

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

    Mara na DMX wuru ewu ọfụma ebe afọ 1990-ruo ebe mbido afọ 2000, maka ịgụ egwu mbem (rap).

    O mekwaala ejije ndị gụnyere Romeo Must Die, Exit Wounds, Cradle 2 the Grave na Last Hour.

    O kwuputela ọtụtụ oge maka ọgụ ya na ọgwụ ike Cocaine na-alụ na ndụ ya, nakwa mbọ ndị ọ gbarala inyere ọnọdụ ya aka.

  13. Ụgbọmmiri niile Ever Given nọchiburu agafechaala na Suez Canal

    Ụgbọmmiri Ever Given

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụgbọmmiri niile na-emenwughi njem n’ihi ụgbọmmiri Ever Given nọchiri ụzọ na Suez Canal agafechaala ugbua, dịka ndị ọnụ na-eru n’okwu na mba Ijipt si kwuo.

    Mara na ihe karịrị ụgbọmmiri narị anọ tọburu ebe ahụ kemgbe ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị.

  14. Akụkọ ụwa na nkeji

  15. Na Akpọtụ Ugbu A, Yinka Odumakin, Ọnụ na-ekwuru Afenifere, anwuọla

    Yinka Odumakin

    Ebe foto si, @Odumakinofficial

    Akụkọ na-eru anyi ntị na-ekwu na Ọnụ na-ekwuru otu jikọ ndị Yoroba bụ Yinka Odumakin anwụọla.

    Akụkọ ahụ kwuru na o nwụrụ n'ụlọ ọgwụ "Lagos University Teaching Hospital" (Lasu) n'ụtụtụ Satọde.

    Ọkamụta Banji Akintoye gwara BBC Yoroba na ihe mere bụ eziokwu.

    Onye ntaakụkọ sobu zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 bụ Omoyele Sowore tinyekwere n'akara Twitter ya nwa amadi alaala mụọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Dkt Joe Okei-Odumakin bụ nwunye Yinka kwuru na ọ dị ya ka otu akụkụ ahụ ya anwụọla.

    O kwuru na ọnwụ di ya na-ewute ya nke ukwu, ma kwuo na ọ nwụrụ site na nsogbu iku ume dapụtara n'ọrịa Covid-19 o si na ya gbakee n'izu gara aga.

    O kwukwara na a ga-ewepụta ozi gbasara akwamozu ya n'oge adịghị anya.

  16. Na Akpọtụ Ugbu A, Ndị ojiegbe egbuola ndị isi Miyetti Allah na Nasarawa steeti

    Ndị oji egbe gburu onyeisioche otu Miyetti Allah Cattle Breeders Association nke Nasarawa sttei bụ Alhaji Mohammed Husain nakwa Mohammed Umar bu onyeisioche otu ahụ na okpuru ọchịchị Toto.

    Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii na Nasarawa bụ Ramham Nansel kwuru na ihe a mere n'abalị Fraịde.

    Ọ sị: "Ọ bụ n'amalị elekere asaa nke ehihe ka anyị wetere ozị na ndị ojiegbe eche na ha bụ ndị Fulani wakporo gbuo mmadụ abụọ."

    Ọ sịkwa: "Ka anyị nwetere ozi ahụ, onyeisi ndị uweojii bụ Bola Longe zipuru ndị atụmatụ Operation Puff Adder II ka ha gaa ebe ahụ. Ha hụrụ ozu abụọ ma buru ha gawa ụlọ ọgwụ."

  17. Ọ bu asị ka Boko Haram na-atụ na ha gbaturu ụgbọelu anyi - Ndị agha elu Naịjirịa

    Jet

    Ebe foto si, Nigerian Airforce

    Ndị agha elu Naịjirịa ekwuola na ọbụghị eziokwu na Boko Haram gbaturu ụgbọelu agha ha a na-achọ achọ Edward Gabkwet bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha elu Naịjirịa sị na ọ bu okwu ụgha ka Boko Haram na-agbasa site na-tinye onyonyo adigboroja.

    Ndị agha elu Naịjirịa si na ụgbọelu ahụ dara ada.

    Ha kwụrụ n'ụgbọchị Wenezde na ụgbọelu Alfa Jet (NAF 475) mmadụ abụọ nọ n'ime ya na-efu efu.

    Ihe onyonyo ndị Boko Haram wepụtere gosiri ndị agha ha bu egbe na-agba ogbunigwe nakwa ụgbọelu kpọkasiri.

    Ozu onye eche ga-abu onye agha elu Naịjirịa si ụgbọelu ahu nọkwa ebe ahụ.

    Ndị agha elu sị na ihe onyonyo ahụ egosighi etu e si gbatuo ya bu ụgbọelu nke mere ha jiri kwenye na o bu asị.

    Ha si ka ndị Naịjirịa gbajọọ akụko ụgha Boko Haram.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. O nweghị nsogbu ọbụla n'etiti ESN na ndị agha Naịjirịa na Nsụka - Gọọmentị Nsụka

    Gọọmentị okpuru ọchịchị ime obodo Nsụka awụọla miri oyi n'akụkọ na-efeghari na Soshal Midia na ndị agha Naịjirịa na ndị otu a kpọrọ "Eastern Security Network" (ESN) na-akwa mgbọ na mpaghara ahụ.

    N'akwụkwọ mgbasaozi gọọmenti okpuru ọchịchị ahụ wepụtara ụnyaahụ rutere BBC Igbo aka, ha sị na o bụ otu nwa amadị na-ede na o nwere ihe na-eme na Nsụka na soshal midia.

    Ha kwuru na edemede ahụ bụ okpotokpo asị.

    "Anyị ma na nsogbu dị na mba anyi ugbua, mana o nweghị ihe ọbụla di etu ahụ na-eme na Nsụka."

    Cheta na Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru na ndi otu ya na ndị agha Naịjirịa bịara inyere ndị Fulani aka na-alụ ọgụ na Nsụka.

    Kanụ gara n'ihu katọ ihe ụlọ ntaakukọ Sahara Reporters dere banyere ihe a, ma kwuo na ọ bụ "ndị Fulani anyi si EBonyi chụrụ " ka ha na-ebuso agha na Nsụka.

    BBC Igbo anụbeghị akaebe maọbụ mkpatụ na o were ihe di etu ahu mere na Nsụka.

    Ọ bụ sọsọ n'ọnụ Sahara Reporters, Nnamdi Kanu na ndị na-ede na soshal midia ma na-etinyeghi aka ebe ka akụkọ ndị a si.

    Ndi agha

    Ebe foto si, Getty Images

  19. Unu asaala chị?

    Anyi asapeela akwụkwọ nke taa dịka anyị na-ewetela unu akụkọ si ụwa dum.

    Ya gaziere onye ọbụla.

  20. Ebe ka ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nọ? - Bishop Katọlik nke Awka

    Bishop Paulinus Okafor nke Katọlik Awka Dayọsis

    Ebe foto si, Bishop Paulinus Okafor

    Nnukwu ụkọchukwu ụka Katọlik nke Dayọsisi nke Ọka bụ Bishop Paulinus Okafor akatọọla ọgbụgbụ ndị mmadụ n’Ebonyi na ebe ndị ọzọ n’ala Igbo ebe a na-eche na ọbụ ndị ọchịehi kpara mkpamkpa ahụ.

    N’ozi Ista ọ ziri dịka ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka na nsonso a, Bishopụ Okafor kwuru na nnu aghaala ofe n’ihe gbasara oke ogbugbu mmadụ nke na-eme n’Ọwụwa-Anyanwụ.

    Bishop, onye katọkwara ịchịgharị ehi were ya na-emebi ugbo ndị mmadụ na ogbugbu ndịuweojii na-eme aghara aghara, kpọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ oku ka ha teeta n’ụra n’okwu nchekwa n’Ọwụwa-Anyanwụ.

    “Ọtụtụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nọ n’agba nke abụọ ọchịchị ha,gịnị mere na ha akwụdosi ike kwuwapụ okwu banyere ọnọdụ nchekwa?”

    'ịkọ ugbo bụ ọrụ, o nweghị onye kwesịrị iji ịchị ehi bụ ọrụ nke ya emebisị ya. E kwesịghị ka a hapụ ehi na-akpa ike ka ọ na-akpagharị.