Igbo ndị ọma ka anyị pịachie ihu akwụkwọ nke izuụka a
Unu emeela n'isonyere anyị n'izuụka gara aga.
Biko gbalịa na-esosi anyị ike n'ọgbakọ BBC Igbo dị na Facebook, Instagram nakwa Websaịt.
Taa ka ndị ụka Kraịst na-eme emume 'palm sunday' iji nabata izuụka nso
Unu emeela n'isonyere anyị n'izuụka gara aga.
Biko gbalịa na-esosi anyị ike n'ọgbakọ BBC Igbo dị na Facebook, Instagram nakwa Websaịt.

Ebe foto si, Police
Ndị uweojii Anambra steeti anwuchiela mmadụ abụọ a sị n'aka ha dị n'ọgbaghara ndị otu nzuzo n'Ifite Awka, Zik's Avenue, Awka, Anambra steeti n'ụtụtụ taa bụ ụka.
Ọgbaghara ahụ tara isi mmadụ abụọ ndị ọzọ amatabeghị ugbua ozu ha dị n'ọba ozu.
Ka ọ dị ugbua ndị uweojii awerela ọnọdụ n'ogbe ahụ ịhụ na udo lọghachitere dịka ha na-achọ ndị otu nzuzo ahụ gbara ọsọ.
N'otu aka ahụ ka ndị uweojii Okpoko divishọnụ siri nwuchie mmadụ anọ ha na-eche so eme ndị mmadụ ụra adị n'anya site n'izu ohie, nnapụ na ịkpa ụmụ ajọ agwa dị iche iche.
Ha sị na ha chọpụtara na ndị a so na otu ndị ekperima n'emesi ndị mmadụ ike n'ogbe ahụ.

Ebe foto si, KCEE, E-Money, Jude Nnam/Instagram
Jude Nnam bụ onye ama ama n'ịrụ egwu ụka ekwuola na ya achọghị ikwu ihe ọbụla gbasara okwu ya na Emeka Okonkwo ana etu E-Money nakwa Kingsley Chinweike ana etu KCEE Limpopo.
Mana ọ gwara BBC Igbo na "ndị ọkaikpe m degara ndị a akwụkwọ ịgbama na-echezị ka ha zaa ya".
Ọ sị na ya amaghị ihe ọzọ ga-eso ya maka na ndị ọkaikpe ya dọrọ ya ka na ntị ka ya ghara ikwu ihe obụla ọzọ maka ya bụ okwu maka imebi ya.
Akụkọ na-efegharị na ọbaozi ntaneti bụ na Jude Nnam agbaala mmadụ abụọ a akwụkwọ.
KCEE azaghị ekwentị ya mgbe anyị kpọrọ ya.

Ebe foto si, Reuters
Ụmụibe agbanyeghị dọndọkịrịdọ niile a dọrọ ya ụnyaahụ bụ Satọde, ụgbọmmiri Ever Given ka tọọrọ na Suez Canal mba Egypt.
Ndị ọrụ na Suez Canal na-ekwu na ha gbaliri mana ha na-atụanya ịdọpụta ya na mgbede Sọnde.
Suez Canal bụ ọdọụgbọmmiri kacha ekwo ekwa n'ụwa.
Mana ụgbọmmiri ndị ọzọ n'achọzị ụzọ ọzọ ha ga-esi gawa njem ha.
Oke ọnụ dara ụnyaahụ ka ụgbọmmiri dọndọkịrịdọ iri na anọ kpụgharịtụrụ ya ntakịrị.
Ụzọ a bụ nke kacha nso iji si Europe gawa Asia.
Ụzọ ọzọ bụ nke si "Cape of Good Hope" dị na mpi Afịrịka bụ nke ga-ericha izuụka abụọ ji gafee.
Ndị ọrụ Egypt sị na ihe karịrị nde dọla iri na anọ na-efunahụ ha maka mgbi ụzọ ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, NPF
Otu ndị uweojii ọtawike nke puruiche nke onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu hiwere agbaala ukwu na Markudi taa maka ịmalita ya bụ mwakpo awakporo gọvanọ steeti Benue bụ Samuel Ortom.
Onye ndu ya bụ otu ọtawaike bụ Abba Kyari, onye ama ama gbasara ụdị ọrụ ahụ.
Ndị ọzọ so na ya bụ otu bụ ndị uweojii ọzọ riri amoosu gbasara ọrụ nnyocha, irụgharị, nkọwa na ịkpaze ogbunigwe.
Ndị otu a, dịka Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjriịa si kwuo, ga-eweghara ọrụ ndị uweojii nke Benue na-arụbụ.

Ebe foto si, Defence HQ
Ndị nchịkọta ndị agha elu, ala na mmiri Bekee kpọrọ 'Service Chiefs' ekwekọrịtala irubere onyeisi ha bụ Chief of Defence Staff, Lucky Irabor isi n'ọrụ dịka e si eme ya n'ụwa niile.
Ọchịagha na ahụ maka agha elu bụ Air Marshal Oladayo Amao kwuru nke a site n'ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ha na ọhaneze bụ Air Commodore Edward Gabkwet n'akwụkwọ o ziputere taa.
Na ya bụ akwụkwọ, ọ siri, "ọchịagha ndị agha elu bụ Chief of Air staff (CAS), Air Marshal Oladayo Amao ekwuola na ndị agha elu na ndị isi agha niile ekwekọrịtala irubere isi na isi ụlọọrụ "Defence Headquaters" nke Ọchịagha Lucky Irabor nọ n'isi ya.
Oladayo Amao na-akọwa na ọ bụ otu a ka e si eme ya n'ụwa niile.
Nke a na-abịa dịka nghọtahie riri ibe ya elu na etiti ndị nchịkọta ndị ọrụ ndị agha dị icheiche na ọchịagha,Chief of Defence Staff nke gara aga bụ Gabriel Olonisakin.
Ugbua, ha gana anarazi ikike na isi ụlọọrụ ha bụ Defence Headquaters.
Gere akụkọ mere n'ụwa n'ime otu nkeji.

Ebe foto si, Alex Chineke
Taa ka ndị ụka kraịst na-eme emume ụka nkwụ 'palm sunday' nke e ji egosipụta njem mmeri Jesus Chris gara n'obodo Jerusalem.
A na-emekaarị ụka nkwụ a n'otu izuụka tupu e mee ncheta ụbọchị Jesus Christ biliri n'ọnwụ a kpọrọ 'Easter'.

Ebe foto si, Alex Chineke

Ebe foto si, Alex Chineke
Na nke afọ a ọtụtụ ụka Kraịst dị iche iche ji ahịhịa ọmụ ha bụ nke si n'osisi nkwụ gaa n'ụlọụka maka ịnata ngozi.
Ụka nkwụ (Palm Sunday) bụ ụbọchị mbụ nke izuụka nsọ bụkwanụ izuụka a na-echeta ọnwụ na mbilite n'ọnwụ nke Jesus Christ.

Ebe foto si, Alex Chineke

Ebe foto si, Alex Chineke

Ebe foto si, Alex Chineke

Ebe foto si, Alex Chineke

Ebe foto si, Alex Chineke

Ebe foto si, Getty Images
‘Passover’ bụ emume ụbọchị ezumike nke ndị Jew na-eme iji cheta nwereonwe ha n’aka ndị Ijipt dịka e dere ya n’akwụkwọ nsọ.
A na-eme emume ‘passover’ a n’otu izuụka mana ụbọchị ọ na-amalite na-agbanwe kwa afọ,ọ na-adakaarị n’ọnwa Nisan nke ndị Hebrew.
N’abalị mbụ na nke abụọ n’ime izuụka a emume a malitere, ezinaụlọ ọbụla ga-anọ n’ime ụlọ ha rikọọ nri ọnụ.

Ebe foto si, Getty Images
Nri a na-eri n’oge ahụ bụ nri ntụaja a kpọrọ ‘Seder’ nke gụnyere Matzah bụ achịcha na-ekoghi eko (Unleavened bread).
N’oge ahụ, ndị Jew anaghị eri nri ọbụla e ji yist mee maọbụ achịcha koro eko.
A na-agụpụta akwụkwọ a kpọrọ ‘Haggadah’ bụ nke na-akọwa ọpụpụ ụmụ Izrel site n’aka ndị Ijipt.
Nkwado emume a gụnyere nzacha na nkpochasị ụlọ ha iji wepụ obere achịcha koro ekon’ụlọ. Ha na-agbakwa ọtụtụ ngwongwo ụlọ ọkụ nke ga sị gosipụtara adịghị ọcha n’ụlọ.

Ebe foto si, RCCG
Ndị ụka Redeemed Christian Church of God abanyela n'ekpere ka a tọhapụ ndị otu ha mmadụ asatọ a tọọrọ na Kaduna n'ụbọchị Fraịde.
Ọnụ na-ekwuru ụlọụka a na Kaduna bụ Olaitan Olubiyi kwuru na ndị ntọrị sị ka a kwụọ ha nde naịra iri ise iji tọhapụ ha.
O kwuru na ha a kọsarala ndị uweojii etu ihe si kwụrụ, na ha na ndị uweojii na-arụkọ iji hụ na a tọjapụrụ ha.
N'ụbọchị Fraịde 26 Maachị, 2021 ka ndị ntọrị wakporo ụgbọala bu ndị ụka na ebe a kpọrọ Doka dị n'okporoụzọ Kachia-Kafanchan mgbe ha si emume na-alọta.
Ndị ntọrị a nwụrụ ha ma hapụ ụgbọala ha ka ọ tọgbọrọ n'ụzọ.

Ebe foto si, AFP
Otu na-eyi ndụ egwu bụ Boko Haram ejirila ogbunigwe gbatuo igwe ọkụ latrik dị na Maiduguri ma tinye ha n'ọchịchịrị ọzọ n'ụbọchị Satọde.
Nke a na-eme n'ime ụbọchị atọ e mezichara ọkụ latrik bụ nke ndị otu a mebiri n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
O were ndị ọrụ ọkụ latrik ọnwa abụọ iji mezie ọkụ site na nchekwa ndịagha mgbe ha na-arụ ọrụ makana Boko Haram liri ogbunigwe aghara aghara n'ala ebe ha na-arụ ọrụ.
Maiduguri bụ obodo a ma ama na mpaghara ugwu dịka ebe ndị Boko Haram na-akpa ike dị egwu.
Anyị ji obi ọcha na-ekele unu n'ụbọchị taa.
Buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

Ebe foto si, Favour
Ndị amakekwu wakpọrọ ụmụaka gara njem nleta na Agụ Abọ dị n'Enugu steeti n'ehihie Satọde.
Ụmụ ntorobịa ahụ ruru otu narị sị na ndị omekome a gbagotere enu Ugwu ebe ha nọ bịa nawa ha ego.
Ha sị, "ka anyị nyechere ndị nke mbụ puku Naịra ise, ndị ọzọ pụtara bịa tiwe anyị ihe, meruwe anyị ahụ".
Ha sị na ndị ajọ mmadụ ahụ gburu otu onye n'ime ha bụ onye ndu ha na-egosi ha ụzọ mma meruo ya ahụ.
Ha sị na ha enweghị ike ịga mkpesa n'aka ndị uweojii maka na egwu ekweghị ha.
BBC gbara mbọ ịkpọtụrụ ndị ọrụ njem nleta n'Enugu steeti ịmata ka ha anụrụ ya bụ ihe mana ekwentị ha agaghị.

Ebe foto si, Police
Ndị uweojii Anambra steeti azọpụtala otu nwata nwoke gbara afọ anọ ndị onye ntọ chọrọ izuru n'Awka, Anambra steeti ta bụ Satọde.
Ha ekunyela ya bụ nwata nne ya ebe ndị mmadụ tiri ya bụ onye ntọ ihe tinka kụrụ panụ.
Ndị uweojii kpọrọ aha ya bụ onye ha hụtara ka onye ntọ Yusuf (35) sị Shagamu dị na Ogun steeti bụ onye ndị mmadụ kụtara isi aba okpu tupu ndị uweojii azọpụta ya buga ya ụlọọgwụ ebe ndị dọkịnta bekee kwuru n'ọnwụọla.
Onyeisi ndị uweojii bụ MB Kuryas nyere ndị ọrụ ya iwu ka ha chọpụta ihe gburu Yusuf.

Ebe foto si, NFF
Otu egwubọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa etozuola ịgba n’asọmpi nke AFCON 2022 dịka Sierra Leone na Lesotho sugoro ike n'ala site n'igba onwe ha onye lewa onye lawa.
Otu Super Eagles nke na Squirrels nke Benin Republic chipuru ya na mgbede a dịka Naịjirịa ji otu ọkpụ asataghị ihe merie ha na be ha.
Na nkeji iri itoolu na atọ ka Onuachu nyere ya bụ goolụ mere ka Super Eagles Nọzie ọfụma na ọgbọ nke ha.
Mmeri a mere ka Super Eagles were akara anọ gafee Sierra Leone nke nyeziri ha akara asatọ ma agụkọọ ya.
Lekwa ndị so asọ ya bụ mpi.

Ebe foto si, NFF

Ebe foto si, EPA
N’Afrịka, ndị mba Ijipụ amalitela ịnwa oko ha maka ịkpụpụta ya bụ ụgbọmmiri dachiri ụzọ na Suez Canal.
Ugbommiri dọkiridọ iri na anọ agbazuola maka ịkpụta ya bụ agada gbachiri ụzọ mere ka ụgbọmmiri karịrị narị atọ ghara ịgafe.
Ha na-atụ anya na ebili mmiri na-achị ụbọchị asatọde ga-enyaaka ịkpụpụta ya.
Ever Given sụrụ ike n'ala mmiri Suez Canal kemgbe Tuzde.
Ndị ọrụ na-egwu ala ekpoputala aja karịrị tọnụ puku iri abụọ kemgbe Fraịde ha gwuwere aja n'ike ya bụ ụgbọ mmiri.
Onyeisi ụlọọrụ Suez Canal Authority bụ Osama Rabie gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Satọde na-egwuputara ikpo ahịhia ruru tọnụ puku itoolu n'okpuru ya bụ ụgbọmmiri.
Onyeisiala Mohammadu Buhari na onyeisiala mba Chad bụ Idriss Deby Itno ezutala n'Abuja n’ihihie Satọde.
Mkparịta ụka ha hiwere isi n’ọrụ nchekwa nke mba abụọ ahụ na ihe ndị ọzọ.
Buhari nabatara Deby Itno mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere iri na abụọ nke ehihie n'obi ya dị n'Abuja.
Ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ nọ be ahụ gụnyere Godfery Onyeama, Minista mba ofesi, Onyeisi ọrụ nzuzo bụ Ahmed Rufa’i, onyeisi ndị ọrụ nchekwa bụ Ọchịagha Babagana Monguno na ndị ọzọ.
Mgbe ikpeazụ ha zutere bụ n'ọnwa Juun nke 2019 na mba Saudi Arabia.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post


Ntuliaka ntuliaka iji họpụta onye ga-anọchite mpaghara ahụ n'ụlo omeiwu nke nta n'Abuja. Ntuliaka pụtara site ọnwụ Ossy Prestige, bu onye nnọchite anya mpaghara ahụ.
N'Abia polytechnic nke bụ ọdọ vootu Eziama ward mbụ n'okpuru ọchịchị Aba Nọt ka o ji ọkara gaa elekere asatọ nke ụtụtụ ntuliaka malitere.


Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ nke Bekee Kpọrọ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ekwuola na ụlọikpe amaala mmadụ iri ikpe banyere nrụrụaka ịntanet na Warri.
Ọ bụ ogige EFCC na Bini nwetere mkpebi a site n’ụlọ ikpe gọọmentị etiti dị na Warri, Delta steeti.
Ọkaikpe Emeka Nwite kwenyere na mkpesa EFCC na mmadụ iri a mere ihe ha sị na ha mere.
Ndi a bụ Agbi Favour Alaba, Otasowie Kelly Osaremen, Chukuwdi Greater, Simeon Asein, Onosemuode Eyube Abel, Aigbata Joseph, Momodu Abdulmalik, William David, Erhirouture Precious na Obibi Odemaro.
Dịka EFCC siri dee n’akara Twitter ha, ihe eji kpụpụ ndị a ụlọikpe bụ iji aghụghọ napụ ndị mmadụ ego nakwa imi ka ha abụ onye ha abụghị. Ha sị na ndị niile kwenyere na ha mere ihe a e boro ha.
Ha sị na Alabi mere ka ọ bu nwoke Chaịna Lei Wei bu onye agha Amerika iji were kapụ ndị mmadụ ego n’elu igwe ịntanet a kpọrọ WeChat.
Ihe o mere megidere iwu Naịjirịa hibere maka mpụ e mere n’elu ịntaneti.
Ọkaiwu nọchitere anya ndi bụ Pascal Ugbome na John Arih rịọrọ ka e mere ndị a ebere.
Ọkaikpe Nwike tụrụ Alaba, Osaremen, Chukwudi Greater, Asein, Onosemuode Eyude na Aigbata Joseph nga afọ abuọ maọbụ ha akwụọ naịra 200,000 na naịra 300,000.
Abdulmalik na David ketere nga ọnwa isii.
Gọọmentị napụkwara ndị ọzọ ụgbọala, ekwentị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Jiri akukọ ụwa n'otu nkeji malite ụtụtu taa.