Ka chi fo!
Ụmụ Igbo, njem anyị taa abịala na njedebe.
Biko gbanụ mbọ sonye anyị echi.
Ka ọ dị.
Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọ bụghị n'ime Aso Rock ka ọkụ gbara.
Chioma Obianinwa
Ụmụ Igbo, njem anyị taa abịala na njedebe.
Biko gbanụ mbọ sonye anyị echi.
Ka ọ dị.

Ebe foto si, EPA
Manchester United ejirila ọkpụ goolu abụọ asataghị kama otu nkịtị pịawa otu Manchester city azụ.
Nke a mere mgbe ha zutere n'asọmpị Premier Lig na mgbede ụbọchị ụka.
Ihe mmeri a jiri wutekarịa otu Manchester city bụ na ọ bụ mmeri mbụ ha n'asọmpị iri abụọ n'otu ha gbarala na Premier Lig afọ a.
Ọ bụ Bruno Fernandes nakwa Luke Shaw bụ ndị abụọ nyere goolu a nke kwalitere otu Man U n'ebe ibe ha bụ Man City nọ.
O nwekwaghị ihe ukwu gbanwere dịka otu Manchester City ka nọkwa n'isi tebulu otu Premier Lig ugbua.

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu ekwuola na ọ bụghị n'ime Aso Rock ka ọkụ gbara.
Ọ kọwara na ọ bụ n'akụkụ ọgba aja dị na mpụta obi gọọmentị ka ọhịa nwuru ọkụ were na-agba.
O kwukwara na ndị ọrụ mmenyụọkụ na-enyocha ịmata etu ọkụ ahụ si bido mana a na-eche na ọ bụ mmadụ na-agafe n'akụkụ ebe ahụ tụpụrụ sịga ọ na-ese n'ime ọhịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, NCDC TWITER
NCDC ekwuola na ọnụọgụgụ ndi mabutere ọria covid 19 sọsọ ụnyiahụ na ala naijeria di otu nariị itoolu na atọ nke gosturu mgbatute ala nyere ndi nebute yabụ nje kwa ụbọchi.
Sọsọ steeti Abia bụ steeti nọ na mpagara south east e nwere ọnụ ọgụgụ ndi butere ọria coronavirus ụnyịahụ dika ụmụamala ya ndi mabutere ya di iri abụọ ebe lagos kacha di elu dika ọ chitara iri asaa.

Ebe foto si, Getty Images
Nwa afọ Naịjirịa bụ Israel Adesanya amabuteghị ọkwa UFC nke ugboro abụọ dịka Jan Blachowicz kụpụrụ ya ọkwụrụ n’anya n'asọmpị UFC 259 e mere na Las Vegas.
Jan Blachowicz bụ onye Poland meriri Israel Adesanya dịka ndị ọkaipe asọmpị ahụ wepụtara ogo o ji meri Adesanya.
Mgbe ha malitechara ọgụ ahụ , Jan ji nwayọ na-eso Adesanya mana n’ogo nke anọ na nke ikpeazụ Jan tụgharịrị ṅyụwa Adesanya ikpakwụ.
Adesanya bidoro ya bụ ọgụ ọfụma mana Blachowicz ji ọkpọ wụọ ya ka mmiri ọzụzọ ma merie nwamadi a na-adatụbeghị kamgbe ọ malitere egwuregwu a n’afọ 2012.
Ihe mmeri a pụtara Israel dịka onye ji ọkpọ mere akaọrụ
Adesanya bụ onye New Zealander a mụrụ na Naịjirịa agaghị eso ndị dịka Amanda Nunes, Conor McGregor, Daniel Cormier nakwa Henry Cejudo merịri ọkwa UFC ugboro abụọ.
Ụnụ arahụkwara ọfụma.
Ụbọchị gị agaghị ezu oke maọbụrụ na isonyeghị BBC Igbo ịmata akụkọ na-eko ọkụ ugbua.
Bia ka anyị gbaa gị ukwụ n'eze.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ekperima atọrọla mmadụ iri na abụọ n'ogige ebe ndị na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu Kaduna bi.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV si kwuo, otu n'ime ndị atọọrọ bụ onye ọrụ Nigerian Airspace Management Agency (NAMA), ya na nwunye ya na ụmụ ya ise nakwa mmadụ atọ ọzọ bịara ileta ha.
Ihe a mere n'ụbọchị Satọde, mana ndị uweojii Kaduna steeti ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ya.
N'ebe ọzọ, ndị ntọ ahụ tọọrọ nwunye otu nwoke na-arụ ọrụ na Nigerian Meteorological Agency (NIMET) ya na nwa ya nwoke.
Onyeisi ụlọọrụ NIMET na mpaghara etiti Ugwu bụ Sani Majidadi gwara ndị Channels na ndị ekperima ahụ wakporo ogige ahụ ndịọrụ bi n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde.
Majidadi kwuru na ha si n'ime ọhịa dị n'obodo Ifira wee banye n'ogige ndị ahụ.
O kwukwara na ndị agha gbatara ọsọ oge he nụrụ ihe na-eme nke mere ndị ekperima ahụ ji gbalaga ọsọ.

Ebe foto si, Presidency
onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị gọvanọ steeti dị icheiche ka ha gbaa ọgwụmgbochi coronavirus, iji mee ka obi kaa ndị mmadụ ịgba ya.
Buhari kwuru nke a dịka ya na osote ya bụ Osinbajọ gbara ọgwụmgbochi nke ha n'ụbọchị Satọde n'Abuja.
O kwuru sị: "Ụnyaahụ ka a malitere ịgba ndịọrụ ahụike anyị ọgwụ mgbochi a."
"Taa, dịka ezigbo onye ndu, nakwa iji gosi na ọgwụ a dị mma, agbaala m ọgwụmgbochi nke mbụ, ma na-arịọkwa ka mmadụ niile gbaa ya ka nje a ghara ịmetụ anyị."
"Ana m agwakwa ndị ọchịchị gọọmentị steeti niile, ndị ọchịchị ọdịnala nakwa ndị ọchịchị ụka ka ha bute ụzọ n'ịgba ọgwụmgbochi a n'okirikiri ha."

Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari na Osote ya bụ Yemi Osinbajo agbaala ogwu mgbochi coronavirus ha taa n'Abuja.
Ha mere nke a iji kọwaara ụmụ Naịjiria n'ezie na ọgwụmgbochi a anaghị egbu egbu nke ọ na-emebi ahụike mmadụ.
A malitere ịgba ọgwụmgbochi coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Fraịde, abalị ise nke ọnwa Maachị afọ 2020.
Ọgwụmgbochi karịrị nde atọ nke si n'aka ụlọọrụ Oxford-Astrazeneca batara na Naịjirịa n'ụbọchị Tuzde, abalị abụọ nke ọnwa Maachị, mana gọọmentị nyere ohere ka ụlọọrụ NAFDAC nye nkwado tupu a malite ịgba ya bụ ọgwụ.

Ebe foto si, Reuters
N’ofesi, Pope na Ali Sistani nke Iraq enweela mkparịta ụka puruiche maka nchekwa na ọdịmma ndị ụka krịast fọrọ na mba ahụ.
Nke a bụ mbụ Pope na-eme njem kemgbe ọrịa coronavirus bụrụkwa mbụ pope ọbụla na-atụ ọkpa na Iraq.
Ndị ụka Kristi nọ n'Iraq ataala ahụhụ n'aka ndị ụka Alakụba ndị obodo ahụ.
Ọlọọrụ ya bụ onyeisi ndị Shia bụ nke kacha elu na okpukpere chi Alakuba sị na okwu ha gbadoro ukwu n'ịchọ udo tọrọatọ n'etiti okpukpere chị abụọ ahụ.
Ayatollah nabatara Pope na obi ya dị na Najaf, Iraq.
Covid-19 na enweghị ezi nchekwa n'ala ahụ mere ka njem a buru nke kacha dị egwu Pope megoro.
Ndị uweojii ajụla itinye ọnụ n'okwu gbara onye otu ha ejidere maka egbe o zuru na Abia steeti gbalaa Ebonyi steeti.
Akụkọ na-efegharị bụ na ebubo dị n'isi otu nwaamdị onye uweojii maka egbe AK47 ise a sị na o zuuru gbalaa obodo ha n'Ebonyi steeti.
Akwụkwọ akụkọ The Nation kwukwaranụ na e jidele ya bụ nwaamadị si Abia steeti ebe ọ na-arụ gbalaa Ikwo dị n'Ebonyi steeti.
Ya bụ akwụkwọ akụkọ sị na ya bụ nwaamdị aha ya bụ Shedrack Aleke Igwe na-azara ọnụ ya n'ụlọmkpọro ndị uweojii dị n'Abuja ugbua.


Ọkụ malitere ịgba na tanka bụ mmanụ ụgbọala n'ihu filin steshọnụ dị na Akute, Ogun steeti n'isi ụtụtụ Satọde a.
Ndị nọ ebe ya bụ ọkụ gbara gwara BBC na ọkụ ahụ si na okpuru tanka bu mmanụ petrolu bịara na NNPC dị n'ebe ahụ.
Ọ sị na ọkụ ahụ malitere obere n'ime filin stashọnụ ahụ mgbe ndị so ya bụ tanka bidoro ịgbanyụ ya.
Mgbe ọ mere ka ọ gbasiwara ike, ha kwarazịa ya kwapụ n'ebe ahụ, mana mgbe ahụ ya bụ mmanụ petrolu malitere ịwufu n'ime ọwa mmiri dị ebe ahụ, buruzia ọkụ na-agbada.
Nke a meziri ka ya bụ ọkụ basaa n'ụlọ ndị dị nso ma bakwa na filin steshọnụ ahụ bụ nke mere ka tank ha ji edowe mmanụ ha liri n'ime ala malite ịgbarị.
Ya bụ nwaadị sịkwa na ugbua ndị ọrụ mmagbanyụ ọkụ na ndị ọzọ emenyụọal ya bụ ọkụ.
Onwebeghị onye ma ihe bidoro ya bụ ọkụ.

Ebe foto si, Reuters
N'asiri gbakaa ute egwuregwu taa, Real Madrid na-eche na Manchester City ga-abụ nsogbu ha n’igote nwaamadị Norway na-agbara Borussia Dortmund bụ Erling Braut Haaland.
Haaland gbara afọ iri abụọ bụ akara ọkụ ma Chelsea na-arọ anya bụ Dortmund tụkwasara otu narị nde pound n'isi ya.

Ebe foto si, EPA
Pope Francis ga-enwe ọgbakọ idakorita nti ana anutubeghị mbu n'etiti ndi Shia na ndi ndu otu okpukperechi uka alakuba na mba Iraq.
Akuko kwuru na ọgakọ a ga adi n'abalị nke abuo ọ mere njem na mba Iraq.
Nnukwu ụkọchukwu a gbara afọ iri asato na ano ga-eleghara okwa ndi a amara maka orịa coronvirus anya dika ọ ga-azopu ya bụ njem a atuwara anya ya kamgbe.
Dika o nwechara mkparita uka n'etiti ndi uka unyaahu na Baghdad, Pope Francis ga-echewe ihu na mba Iraq na elekere itoolu nke ututu.
Isi sekpunti nyere njem a ọ ga-ewe n'ụbọchị nke abụọ ọ mapụrụ ya bụ njem bụ ọgbakọ ya na onye ndị ndị Shiite bụ otu n'ime ndị ụka Alakụba bụ Ayatollah Ali Sistani bụ onye gbara afo iri itoolu ana ahubeghi na oha.
Agaghị ekwe ndị ntaakụkọ bata ebe ahụ mgbe ha ga-ezute na-elekere itoolu nke ụtụtụ taa.
Ịkwekọrịta ka Pope nweeike hụ ochiedike a abụghị obere ihe dịka o richera ọnwa olenaole tupu ha ekwe na Pope na ya ga-ahụ ihu na ihu.
Onyeisioche ohuru nke ulooru EFCC bu Abdulrasheed Bawa ekwela nkwa iji echiche na amamihe ebuso mpu agha na Naịjiria.
Okwuru nke a n'Abuja Ụnyaahụ bụ Fraịde dịka ọ malitere ọrụ n'isi ụlọọrụ ha.
O kwuru na ya ga-ehiwe ngalaba ga-eji ezigbo echiche na akọ enyopu mpụ bụ nke ga-enyeaka ịmata ajọ nkata ndị omekome na-akpa n'oge.
Ọ sị na, "anyị ga-eme ka ọrụ anyị niile banye na kọmpụta bụ nke ga-enyere anyị aka ịnye gọọmentị ezi ntụzịaka ga-enyere ha aka n'ọchịchị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Office of the Deputy Governor
Umunwaanyi Abia steeti di puku abuo na nari ise e nwetala puku Naira iri abuo n'isi n'isi dika ego enyemaka site na nkwado ulooru na ahu maka onodu gbatagbata na ala Naịjirịa.
N'okwu ya n'ihe omume ikesa ego a, n'Umuahia, aka na achi steeti Abia, Okezie ikpeazu site n'onu Ude Okochukwu kwuru na nke a bu imejuputa nkwa onyeisiala Muhammad Buhari idoputa umuamaala anyi ruru otu nde na ubiam.

Ebe foto si, Ghana Police
A mala ụmụ Naịjirịa abụọ ikpeọnwụ na mba Ghana maka igbu ọchụ.
Aha mmadụ abụọ a bụ Samuel Udoetuk Wills na John Oji.
Ọkaikpe Richard Adjei-Frimpong bụ onyeisi ndị ọkaikpe asaa kpebiri ikpe a n'ụbọchị Fraịde, abalị ise nke ọnwa Maachị afọ 2021.
Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụ ụmụ Naịjirịa ahụ gburu ụmụnwaanyị anọ bụ ndị a tọọrọ ma gbuo ha na mpaghara Takoradi na Ghana n'afọ 2018.

Ebe foto si, Ghana Police
Dịka ndị uweojii mba Ghana si kwuo, mmadụ atọ ka a na-enyo kpara arụ a, onye nke atọ bụ Chika Innoidim John, onye mechara gbalọta Naịjirịa mana ngalaba 'NAPTIP' nwuchiri ya ma nyefee ya n'aka ndị uweojii Ghana n'ọnwa Ọgọst afọ 2019.
Ụlọikpe ahụ nyere mmadụ abụọ a ohere ruo abali iri atọ iji gbaghaa ikpeọnwụ a mara ha n'ụlọikpe mkpesa nke mba Gana.

Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị isi ọrụ nchekwa ọ họpụtara ọhụrụ na ha nwere izuụka abụọ iji mee ihe ndị mmadụ ga-ahụ anya gbasara ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Buhari kwuru nke a oge o duru ndị isi ncheka ahụ n'iyi ọrụ n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.
Ọ gwara ndị isi nchekwa ahụ ka ha gbaa mbọ mee ka nchekwa dịwanye mma na Naịjirịa tupu udu mmiri amalite, ka ndị ọrụ ubi nwee ike ịlaghachi n'ọrụ ha.
"Unu nwere naanị izuụka olemole tupu udummiri amalite," Buhari gwara ha.
"Anyị na-atụ anya na tupu udu mmiri anịa, ndị mmadụ enweela ntụkwasị obi iji laghachi n'ubi ha maka na nsogbu ga-adị ma ọ bụrụ na ha-enweghị ike ịkọpụta nri ga-ezuru anyị niile."