Ndị bandits na ụfọdụ ndị agha Naịjirịa na-arụkọ ọrụ - Sheikh Gumi

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye ụkọchukwu a ma ama n'okpukperechi Islam na Naịjirịa bụ Sheikh Gumi Ahmed ekwuola na ndị ekperima ọchịehi a na-akpọ bandits na ụfọdụ ndị agha Naịjirịa na-arụkọ ọrụ.
Gumi kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Punch.
Ọ gara n'ihu na-ekwusi ike na ihe ga-eme ka ndị ekperima a kwụsị iyi ndị mmadụ egwu bụ ma gọọmentị gbaghara ha.

Ebe foto si, Facebook/Sheikh Gumi
1Gumi kwuru sị: "Ekwuola m ya na mbụ na ihe ha ji ego niile ha na-enweta n'ịtọrọ mmadụ eme bụ ịzụ egbe na ngwa agha dị icheiche."
"Ugbua, ha na-achọ ịzụta egbe ndị nwere ike ịgbatu ụgbọelu, nke ha ga-eji na-aluso ndị agha naịjirịa ọgụ."
"Ihe a abụghịzi ihe gọọmentị ga-eji ọgụ egbe na ịkwa mgbọ kwụsị. Chetakwa na ndị ekperima nwere ndị dị icheiche na-enyere ha aka, ma ụfọdụ ndị agha Najirịa na-enyere ha aka."
"Ihe ka mma bụ ịkpọ ha ma gbaghara ha, mee udo. Naanị oge ahụ ka gọọmentị ga-enwe ike ịgwa ha ihe ha ga-eme."
















