George Obiozor so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo daara n'ala n'ọgbakọ Imeobi

Otu n'ime mmadụ ise so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor daarala n'aka n'oge ọgbakọ ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụlọ omeiwu Naịjirịa ebinyela aka na bọjeetị 2021

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa

    Nkọwa foto, Ọ bụ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọkụtoba afọ 2021 ka Onyeisiala Muhammadu Buhari wegara bọjeetị afọ 2021 n'ụlọọmeiwu

    Ụlọ Omeiwu Naịjirịa ebinyela aka na akwụkwọ usoro mkpata na mmefu nke afọ 2021, nke a kpọrọ 'Budget of economic recovery and resilience' na Bekee.

    Ọ bụ n'ọgbakọ pụrụ iche nke ndị ụlọ omeiwu ukwu na nke nta nwere n'Abuja n'ụbọchị Mọnde ka ha binyere aka na bọjeetị ahụ.

    Ha kwadoro na ego ole Naịjịrịa ga-emefu na 2021 bụ tarị naịra iri na atọ na ụma (N13.588 trillion).

    Ego a karịrị tarị naịra 13.082 bụ nke onyeisiala Muhammadu Buhari depụtara oge o wegara akwụkwọ bọjeetị ahụ n'ụlọ ndị omeiwu n'ọnwa Ọkụtoba afọ 2020.

    Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya bụ bọjeetị:

    • Ego a ga-eji arụpụta ọrụ gbara ọkpụrụkpụ (Capital expenditure) - Tarị naịra 4.125
    • Ego a ga-eji na-egbo mkpa na-adapụta kwa mgbe kwa mgbe (Recurrent expenditure) - Tarị naịra 5.641
    • Ego 'statutory transfer' - Ijeri naịra 496.528
    • Ego eji akwụ ụgwọ (Debt Servicing) - Tarị naịra 3.324
    • Ego ole a ga-ere otu akpati mmanụ agbịdị - $40

    Ọ fọziri ka Onyeisiala Buhari binye aka na bọjeetị a ka o wee bụrụ ihe a ga-etinye n'ọrụ malite n'abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

  2. George Obiozor so azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo daara n'ala n'ọgbakọ Imeobi

    Geroge Obiozor

    Ebe foto si, Geroge Obiozor

    Otu n’ime ndị so na-azọ ọkwa onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ George Obiozor dara n’ala mgbe ndịisi Ohanaeze na-eme ọgbakọ imeobi n’Enugwu n’ụbọchị Sọnde.

    E buru Obiozor gawa n’ụlọọgwụ ozugbo bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ ụgbua.

    Akụkọ sị na nke a mere mgbe ha nọ n'etiti ọgbakọ imeobi a dịka ọnọdụ Obiozor gbanwere mana mgbe a sị ka edupula n'ezi ka ọ dara n'ala n'otu ntabi anya.

    A sị na e ji otu ụgbọala nchekwa gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodinma buru ya gawa n'ụlọọgwụ.

    Obiozor bụbu onye na-anọchiteanya Naịjirịa n'Amerịka nke a kpọrọ 'Ambassador'.

    Ndị ọzọ bịara ọgbakọ a gụnyere Gọvanọ Hope Uzodinma, Ministri na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige, Ogbonnaya Onu, Anyim Pius Anyim, Osita Izunaso, Chekwa Okorie.

  3. Mmadụ narị ise na otu butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n'ịchafụ sị na ha chọpụtara coronavirus n'ahụ mmadụ narị ise na otu n'ụbọchị Sọnde.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ steetị gụnyere Legọs, Kaduna, Imo, Ebonyi na ndị ọzọ amachiela ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi ọrịa a.

    Ndị buterela ọrịa coronavirus na Naịjirịa kamgbe ọ malitere achụwala puku iri asatọ ebe o gbuola mmadụ karịrị otu puku.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Igbo ndịọma unu asaala chi ee?

    Anyị ji obi ọcha anabata unu n'ụbọchị taa, biko gbalịa sonyere anyị.

  5. Ka chi foo nu

    Daalụ dịka ị nonyere anyị taa...Ka ọ dị echi

  6. 'Ọchịchị Muhammadu Buahri egosila na ọ nwereike ịchekwa ndụ ndị Naijirịa' - Garba Shehu

    Garba Shehu

    Ebe foto si, Garba Shehu/Twitter

    Garba Shehu bụ onye enyemaka onyeisiala Naijirịa n'ihe gbasara mgbasa ozi ekwupụtala ihe ise gbara ọkpụrụkpụ ọ tụrụ anya na ndị mmadụ ga-amụta dịka azọpụtara ụmụakwụkwọ narị atọ na iri anọ na anọ.

    Gụọ ya na nkenke

    Nke Mbụ

    Garba Shehu kwuru na gọọmentị Muhammadu Buhari egosila na ha dị njikere ma nweekwa ike ịchekwa ndụ ndị Naijirịa niile.

    O kwuru sị "na-agbanyeghị ọkụ ọtụtụ otu nọ na Naijirịa na ndị nke nọ ofesi, ndị ọrụ ha bụ ịchọta ụmụaka a ekweghị ka ọ duhee ha".

    Nke Abụọ

    Ndị agha Naijirịa anaghị anata ekele na otito dịrị ha maka ọrụ ha na-arụ.

    O kwuru sị, 'Ndị agha Naijirịa kpara nkata ha nke ọma ma zọpụta ụmụaka a na agbaghị otu ọnụ egbe".

    Garba Shehu kwukwara na ọkpa ekele ya na-agara ndị agha Naijirịa maka ọrụ ọma ha.

    Nke Atọ

    Ọ bụ ndị agha Naijirịa ka mmerị dị n'aka, anapụla ya ndị otu oyi egwu.

    Sheu kwuru sị, "Ha gbawa ọsọ, ma ha enweghịzị ebe nzụzọ ọzọ".

    O kwukwara ka ndị mmadụ chere aka ghọrọ etu ndị agha si emegide ndị omekome niile.

    Nke Anọ

    Ndị Naijirịa hụrụ onyeisiala ha bụ Muhammadu Buhari n'anya.

    O kwuru sị "ndị Naijirịa ka dị n'otu ma ị lee anya na Soshal Midịa na ebe akụkọ ndị ọzọ".

    Ọ kọwara na oge a gosikwara na mgbe ihe siri ike, ndị Naijirịa na-akwado onwe ha.

    Nke Ise

    O kwuru na e nwere ndị na-eji ọdachị dakwasara ndị mmadụ erite uru.

    Shehu kwuru sị "ma ọ bụrụ na ometụtaghị ha, ha ejiri ya mere ihe akaja".

    O kwuo sị, " ụgbụ a gịnị ka ha ga-eji uwe otu nde ha biri ugbua mee? Ihere bụzị nke ha".

  7. PDP emeriela ntuliaka n'okpuru ọchịchị niile dị n'Abia steeti

    Onye na-atụ vote

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka n'Abia steeti bụ 'Abia State Independent Electoral Commission' (ABSIEC) ekwuola na ọ bụ pati PDP meriri ntuliaka e mere n'okpuru ọchịchị niile dị na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde.

    Onyeisioche ABSIEC bụ Mkpa Agu Mkpa kpọpụtara mpụtara ntuliaka ahụ n'ụbọchị Sọnde n'Umuahia.

    Mkpa kwuru na ọ bụ naanị n'Ikwuano ka otu Labour Party meriri ntuliaka ọkwa 'councillor' anọ n'ime iri dị n'okpuru ọchịchị ahụ.

    N'ebe ndị ọzọ, ọ bụzị naanị PDP ji azịza zakọrọ mmeri.

    Lee etu mpụtara ntuliaka ahụ si dị:

    Mkpa Agu Mkpa

    Ebe foto si, ABSIEC

    Nkọwa foto, Onyeisioche ABSIEC, Mkpa Agu Mkpa

    Clinton Ebere - Aba South

    Prince Ikonne - Aba North

    Ibe Nwoke - Obi Ngwa

    Kamalu Christian - Osisioma Ngwa

    Nnata Chinasaokwu - Ugwunagbo

    Nwagbara Chuks - Ukwa East

    Kanu Levi - Ukwa West

    Ochulor Chinwendu - Isialangwa North

    Anyatonwu Ikechi - Isialangwa Saouth

    Dan Kalu - Arochukwu

    Onwuchekwa Emmanuel - Bende

    Ugochukwu Njinkonye - Umuahia North

    Benson Humphery - Umuahia South

    Madu Ifeanyi - Umunneochi

    Agbaeze Chimaobi - Isiukwuato

    Ukaiwe Okoroafor - Ohafia LGA

    Mpamaugo Stephen - Ikwuano

    Chijoke Chukwu

    Ebe foto si, Facebook/Chijoke Chukwu

    Nkọwa foto, Chijoke Chukwu

    Cheta na Chijioke Chukwu, bụ onye na-anọchite anya ndị Bende n'ụlọ omeiwu n'Abuja, gwara BBC Igbo n'ụbọchị Satọde, na onweghị ntuliaka ọbụla e mere na mpaghara ahụ n'ụbọchị Satọde.

    Chukwu kwuru na anya ha ahụghị ndị ABSIEC maọbụ ndị ọrụ ha ọbụla n'ụbọchị ahụ.

    Ọ kpọrọ oku ka a kagbuo ya bụ ntuliaka.

  8. Gee akụkọ n'otu nkeji

  9. Ọtụtụ mba Europe amachiela ndị UK ịbata mba ha

    Ọdọugbọelu tọgbọrọ chakoo na mba UK

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọdọugbọelu tọgbọrọ chakoo

    N'ihi etu ọrịa coronavirus si arị elu n'ike n'ike na mba UK, ọtụtụ mba dị na mpaghara Yurop amachiela ndị njem si UK ịbata na be ha.

    Mba ndị a gụnyere Belgium na Netherlands, ebe Italy, France, na Germany nwekwara ike ime otu ihe ahụ.

    Ma ụgbọelu ma ụgbọ oloko si mba abụọ a agaghị agazi mba UK, o nweghịkwa ụgbọelu maọbụ ụgbọoloko ga-esi UK ga mba ndị a.

    Ndị ọkachamara na-ekwu n'ụdị nje coronavirus na-efesa na mba UK ugbua dị iche n'ụdị nke gbasaburu n'oge gara aga.

    Kama ha kọwara na ọbụghị na nje nke ọhụrụ a ka njọ kama ọ na-agbasa ọsịsọ karịa nke mbụ.

    Ihe karịrị mmadụ puku iri na atọ ka a chọpụtara nje covid-19 n'ahụ ha na UK.

  10. Etu Ọkaikpe Ishaq Bello si kụọ afọ n'ala na ụlọikpe ICC

    Ishaq Bello

    Ebe foto si, FCT High Court

    Nkọwa foto, Ishaq Bello, onyeisi ọkaikpe n'Abuja

    Akụkọ apụtala na Ishaq Bello, onye bụ onyeisi ndị ọkaikpe n'Abuja akụọla afọ n'ala n'ụlọikpe 'International Criminal Court' nke dị n'obodo The Hague na mba Netherlands.

    Bello bụ onye Onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara ka ọ nọchite anya Naịjirịa dịka otu n'ime ndị ọkaikpe ICC.

    Mana na ntuliaka nke mbụ e mere n'ụbọchị Satọde, Bello kụrụ afọ n'ala dịka ọ chịtara naanị vootu ise n'ime mmadụ otu narị na iri (110) soro tụọ vootu.

    Mmadụ abụọ meriri na ntuliaka nke mbụ a bụ Joanna Korner onye mba UK, na Gocha Lordkipanidze onye Georgia.

    Mana a ga-emekwa ntuliaka ọzọ n'ụbọchị Mọnde iji họpụtazuo ndị ọkaikpe ole a chọrọ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Oge onyeisiala Buhari họpụtara Bello ka o soro zọọ ọkwa ọkaikpe ICC n'ọnwa Ọkutoba, ọtụtụ kwuru na ọ gaghị achịta aja n'ihi na etu ụlọikpe ahụ si arụ ọrụ edoghị ya anya.

    ICC bụ ụlọikpe kachasị n'ụwa ebe a na-ewepụ ọkpụrụkpụ okwu dịka ịkpa arụ n'oge agha (war crimes), ikpochapụ agbụrụ (genocide), na ndị ọzọ.

    Ha dị mba otu narị na iri abụọ na atọ (123) hibere ụlọikpe a, nke Naịjirịa bụ otu n'ime ya.

    Ndị ọkaikpe iri na asatọ na-ekpebi ikpe na ICC. Dịka iwu ha sị dị, afọ atọ ọbụla gachaa, a ga-agbanwe mmadụ isii n'ime ndị ọkaikpe ahụ, tinye ndị ọhụrụ.

    Ndị ọhụrụ a ga-anọ n'ọkwa ahụ ruo afọ itoolu tupu a gbanwekwaa ha.

    Cheta na onyeisi ụlọikpe ICC ugbua bụ nwa afọ Naịjirịa aha ya bụ Chile Eboe-Osuji.

  11. Gọọmentị Kaduna ekwuola na ọgbakọ ofufe niile ga-abụ nanị otu awa maka coronavirus

    Nasir El Rufai

    Ebe foto si, The Governor of Kaduna State/Facebook

    Gọọmentị Kaduna site n'akwụkwọ ozi gọvanọ steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai depụtara n'ụbọchi sụnde were kwuo na ọ bụ nani otu awa ka a ga-aka ụka na steeti ahụ iji luso mgbasa coronavirus ọgụ.

    Ha kwukwara na ndị ọrụ gọọmentị site na agba 14 gbadawa ga-esi n'ụlọ ha arụ ọrụ site n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba.

    Ụlọ okpukpere chi nille ga-ahụ na ndị biara ofufe na-ekpu mkpuchi imi ha, hu na ha nyere onwe ha ohere ziri ezi ma wepụta kwa ncha pụrụ iche eji ehicha aka.

    Ndị na-akwa ụgbọala ekwesịghị ibu karịa etu gọọmentị si kwuo.

  12. Ndị uweojii atọghapụla ụmụakwụkwọ 84 atọọrọ na Katsina

    Ndị agha na ndị ha tọhapụrụ

    Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

    Ndị uweojii na Katsina steeti atọghapụla ụmụakwụkwọ islamiyya ruru iri asatọ bụ ndị a tọọrọ dịka ha si ụlọakwụkwọ alachite

    Ndị uweojii kwuru na ndị ntọ ahụ tọọrọ ndị ọzọ ma zurukwa ehi ndị obodo Danbaure tupu ha ejide ha.

    Ọnụ na-ekwuchitere ha na steeti ahụ bụ Gambo Isah kwuru na ọ bụ n'ebe elekere iri n'abalị satọde ka akpọrọ ndị obodo Dandume kporo ha oku enyemaka nke ha zara.

    Ndị agha na ndị ha tọhapụrụ

    Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

    Ndị agha na ehi ha tọhapụrụ

    Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

    Ndị agha na ndị ha tọhapụrụ

    Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

  13. Tanka agbaala ọkụ ọzọ na akwa mmiri Otedola dị na Legọs

    Otu tanka bụ mmanụ agbịdị agbaala ọkụ ọzọ na akwa mmiri Otedola dị n’okporoụzọ Legọs na Ibadan n’abalị ụbọchị Satọde.

    Ndị ọrụ gbatagbata na Legọs kwuru na o nweghi onye nwụrụ mana amabeghi ọnụ ego ihe ndị mebiri emebi n’ebe ahụ.

  14. Gọọmentị Legọs steeti agbachiele Cubana

    Ụzọ Cubana

    Ebe foto si, @Mr_JAGss/Twitter

    Gọọmentị Legọs steeti agbachiela ụlọ egwu na oriri a ma ama bụ Cubana maka ịda iwu covid-19.

    Onye enyemala pụrụiche nke Gọvanọ steeti ahụ bụ Jubirl Gawat kwuputere nke a n'elu Twitter ya n'abalị Satọde.

    Dịka ọrịa coornavirus na-abawanye, Babajide Sanwo-olu nyere iwu ka amachie ụlọ egwu, mmemme nakwa ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Ụtụtụ ọma!

    Igbo ndị ọma ka ụbọchị taa baara gị uru.

    Ị na-ejekwa ụka?

  16. Ndị nnọchite anya gọọmenti Anambra agaala mgbarụ n'ezinụlo nwoke ndị uweojii gbagburu.

    Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ezịgala ndị nnọchite anya gọọmentị ya na ndị otu ọzọ n'ụlọ umu nwoke abụọ bụ ndị na-anya 'ọkada' egburu na steeti ahụ n'ụbọchị Tuzde na Wenesde n'okpuruọchịchị Aguata.

    Ọ bụ onyeisi Transition Committee nke okpuru ọchịchị Aguata bụ Eche Ezeibe bụ ndị gara hụ ezịnụlọ Chidiebere Nwoga n'obodo Igbo ukwu na ihe dịka elekre iri nke ụtụtụ ebe ha gara ezinụlo Izuchukwu Alaka n'obodo Ogboji n'elekre abụọ na ụma iri na ise nke ehihe.

    NDị so ya gaa njem a gụnyere onye na-achịkọta otu Civil Society Organisations n'Anambra steeti bụ Chris Azor, osote onyeisi mbụ nke ndị ntoroọbịa otu Association of Anambra Town Unions bụ Chukwuka Nkwado na onye enyemaka Gọvanọ maka ihe gbasara ndị ntoroọbịa bụ Chigozie Henry Nweke.

    Akụklọ na-ekwu na ọ bu onye uweojii gbagburu Nwoga n'Igbo ukwu ebe Alaka nwụrụ oge a na-eme ngagharịiwe n'ogige ndị uweojii dị n'Ekwulobia.

    NDị ezịnụlo abụo a nabatara ndị a ezitere na kelee kwa Gọvanọ steeti ahụ maka ego iti aka n'obi nke bụ puku narị ise.

  17. Liverpool ejirila goolu asaa supee aha C R Y S T A L Palace n'ụlọ ha

    Takumi Minamino

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu mkpụrụ ịsọ anya maọbụ ebere adịghị n'obi ndị otu Liverpool dịka ha jị ọkpụ goolu asaa asatara ma ncha were bie Crystal Palace ka ọkwụrụ n'ụlọ ha.

    Takumi Minamino

    Ebe foto si, Getty Images

    Liverpool achọghị imere ndị Crystal Palace ebere dịka Minamino ji goolu na nkeji atọ were sị ha ndewo nụ.

    Ọ bụ Sadio Mane nyere ya bọọlụ o jiri nye goolu a.

    Nke a na-eme ya ugboro abụọ Liverpool nyere goolu n'ime nkeji atọ na asọmpi premier league afọ a. Nke mbụ bụ nke ha nyere Everton.

    Sadio Mane

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mane enyela goolu ugboro asaa nile Liverpool zutere Crystal Palace.

    Mane gọsịkwara na ya abịaghị nkiri dịka o nyere goolu nke ya n'ime nkeji iri atọ na ise dịka Roberto Firminho nyere ya bọọlụ.

    Roberto Firminho

    Ebe foto si, Reuters

    Ọ dịzị ka Liverpool ehiwere iwu na onye ọ bụrụ nyere onye nyere goolu bọolụ ga-enye nke ya.

    Ọ bụ maka na Roberto Firminho nyere goolu nke atọ na nkeji iri anọ na anọ n'agba nke mbụ na ya bụ asọmpi.

    Roberto Firminho

    Ebe foto si, Reuters

    Na nkeji iri ise na abụọ ka Jordan Henderson ji bọolụ Alxander-Arnold nyere ya were kpuhee ite goolu n'agba nke abụọ na asọmpị ha.

    Nke a mere ya goolu nke anọ.

    Jordan Henderson

    Ebe foto si, Reuters

    Na nkeji iri isee na asaa ka ewepụrụ Sadio Mane were Mo'Salah dochie ya. Ihe onyonyo gosiri na obi adịghị Mane mma maka etu esiri wepụ ya.

    Roberto Firminho mezụrụ ya ise na nkeji iri isii na asatọ dịka Mo Salah nyere ya bọọlụ o ji nye ya bụ goolu.

    Roberto Firminho

    Ebe foto si, Getty Images

    Mo Salah tinyere aha ya na akwụkwọ ndị nyere goolu dịka o ji isi ya zịga bọọlụ ozi n'azụ neti ndị Crystal Palace na nkeji iri asatọ na otu.

    Nke a ka o jiri mezuo ya goolu isii.

    Mo Salah

    Ebe foto si, Getty Images

    Na nkeji iri asatọ na anọ ka Mo Salah nyere goolu nke o jiri mezuo aha Crystal Palace n'ụlọ ha.

    Mo Salah

    Ebe foto si, Getty Images

  18. Nwa agbọghọ ejirila ogbunigwe gbuo onwe ya na mmadu atọ na Borno

    Otu nwa agbọghọ bu ogbunigwe ji ya gbuo onwe ya na mmadụ atọ dịka mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ.

    Ihe mere na-ebe a na-eme ọgbakọ n'obodo Konduga dị na Borno steeti.

    Ụlọ ntaakụkọ AFP sị na ndị ma maka ihe a mere sị na ọ bụ n'ụbọchị Satọde ka ihe a mere.

    Otu onye ọrụ enyemaka sị: "Anyị ebupula ozu mmadụ atọ nwụrụ nakwa mmadụ abụọ merụrụ ahụ ebe ahụ."

    Nwa agbọghọ ahụ gbara ogbunigwe o yi n'ahụ n'etiti ndị mmadụ.

    Konduga eteghị aka na Medụgụrị bụ isi obodo Borno steeti.

    Onwebeghi onye kwuur na ọ bụ ya mere nke a mana o yiri ụdịrị ihe Boko Haram na-eme.

  19. Atọrọla mmadụ 35 n'ụzọ si Damaturu gawa Medụgụrị

    Uweojii

    Ebe foto si, Get

    A tọrọ ihe ruru mmadụ 35 n'ụbọchị Fraịde n'ụzọ si Damaturu gawa Medụgụrị bụ isi obodo Borno steeti.

    Ndi ọrụ nchekwa gwara ụlọntaakụkọ Cable na ndị ji egbe a na-eche na ha bụ Boko Haram wakporo ndị na-aga njem n'ebe dị nso n'obodo Kuturu di n'okpuru ọchịchị Jankara n'ehihe ụbọchị Fraịde.

    Ndị oji egbe a yi uwe ndị agha gbachiri ụzọ n'ogologo ụzọ ahụ ma jiri ụgbọala Hilux eburu ndi mmadụ.

    Otu onye ma maka ihe a mere gwara Cable na ndị njem a hụrụ ka tire na-agba ọkụ mana ha amaghị na ọ bụ ndị ntọrị.

    "Ọtụtu ndị njem ahụ gbabara n'ime ọhịa mana anwụchiri mmad 35 n'ime ha."

    Onye a ma maka ihe mere si na ọ bụ mmadụ itoolu fọrọ n'ime ha dika ndị omekome ahụ zuru ihe niile dị na ụgbọla ndị e jidere.

    Otu onye uweojii isi ya gbagotere kwuru na a azọpụtara mmadụ iri, dịka e buru ndị merụru ahụ gawa Medụgụrị

  20. Fada Valentine enwerela onwe ya n'aka ndị ntọ

    Valentine Oluchi Ezeagu

    Ebe foto si, HMMMS

    Atọghapụla Fada Valentine Ezeagu bụ nke atọọrọ n’ụbọchị isii gara aga ebe ọkwọ ụgbọala ya aga akwamozu nna ya nwụrụ n’Igboukwu.

    Otu onye ma ezinaụlọ ahụ bụ Ugochukwu Okafor gwara BBC Igbo na ọ hụrụ Fada n’akwamozu nna ya.

    O kwukwara na ọ maghị ma akwụrụ ụgwọ maọbụ ndị uweojii agbapụtara ya mana o so na ndị kara ụka maka nna ya nwụrụ anwụ.

    Fada Valentine bụ onyeisi ụlọakwụkwọ Holy Family Secondary School Osusu dị n'Umahia, Abia steeti.