Anyị na-awụsa ọwa ebe a!
Ka o dịnụ mgbe ọzọ.
APC meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Beyelsa na Kogi dịka a ga-emegharị nke Dino Melaye na Smart Adeyemi.
Uche Akolisa, Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo and Chiagozie Nwonwu
Ka o dịnụ mgbe ọzọ.


Anyị alaghachitela.
Anyi ka na-etinyekwa anya na ntuliaka emere na Kogi nakwa Bayelsa
Dịka Inec siri kwuo Yahyah Bello nke APC ji vootu 406,222 merie Musa Wads nke PDP wetere 189,704 ji gba onye nke abụọ.
Natasha Akpoti nke SDP nwetere vootu 9,482.
Inec akpọọla aha Yahaya Bello dịka onye ga-achị Kogi ruo afọ anọ ga-abịa.
Natasha Akpoti agbajọọla ya bụ ntuliaka ma si ka akagbuo ya dịka Musa Wada na-ekwukwa otu ihe a.
Onye nnọchịte anya PDP n'ebe ngọkọ vootu ekweghị ibinye aka n'akwụkwọ eji gbakọ vootu enwetere na ntuliaka a.

Ebe foto si, @GYBKogi
Ma chetakwa na anyi ga-amalite n'ụtụtụ.
Ka ọ dị nụ.
Onye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati "All Peoples Congress" (APC) na Bayelsa Steeti bụ David Lyon ejirila vootu 331063 buru onyeisi na ntuliaka eji họpụta aka ga-achị steeti ahụ ruo afọ anọ n'abịa.
Onye gbara nke abụọ bụ Diri Duoye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati "Peoples Democratic Party" (PDP) bụ onye nwetere vootu 114828.

Dịka a ngụkọ vootu si okpuru ọchịchị Lokoja na Ibaji adịbeghị, Inec sị na-aga emechi na Kogi.
Mmalite ọzọ ga-abụ n'elekere itoolu nke ụtụtụ echi bụ Monde bụ ụbọchị iri asatọ nke ọnwa Nọvemba, 2019.
Na ngụko nke pụtara, APC na-aga PDP ebe SDP na-agba nke atọ.
PDP na SDP na-agbarụ ihu maka ọnọdị a dịka ndi zọrọọkwa n'okpuru na-ekwu ka akagbuo ya bụ ntuliaka maka nrụrụaka.

Anyị ga-ewetere unu ka o si aga oge ha laghacitere.
APC wetere ọnụọgụgụ 58,016 iji merie n'okpuru ọchịchi Ogbia bụ ebe onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan si.
PDP nwetere 13,763.
Onye nchịkọta vootu bụ Ọkammụta Victor Igbinedion sị na e nwere ebe ọgbaghara dị n'Ogbia nke mere eji kagbụo vootu.

Na Nembe Inec si na ọ bụ etu a ka o si kwụrụ: APC: 83,041 PDP: 874
Onye nchịkọta vootu bụ ọkammụta Joseph Osenekha si na enweghị nsogbu ọbụla si ebe pụta mana enwere pati wetere akwụkwọ mkpesa mana ọkpọghị aha pati a.
Pati Accord sị na ntuliaka gara nke ọma na Nembe.
Obodo ahụ bụ be Osote aka n'achị Bayelsa bụ Gboribiogha John Jonah.
Egburu mmadụ abụọ na Nembe oge PDP gara ịchụ nta vootu tupu eme ntuliaka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mmadụ iri atọ na-arụrụ Inec ọrụ na Kogi a na-achọ achọ anaruola be ha.
Onye mgbasa ozi onyeisi Inec bụ Rotimi Oyekanmi sị na ndị gara ọrụ n'okpuru ọchịchị Olamaboro gbara ọsọ mgbe ndị akpụ obi bịara chụsasịa ndị mmadụ ebe a na-eme ntuliaka.

Nchịkọta vootu Bayelsa di ebe a.

Akagbụrụ ebe anọ tụọ vootu 17 na Sagbama maka ihe pụtara na igwe eji agu vootu adabaghi n'ihe agụpụtara mgbe atụchara vootu.
Etu Inec sị na ọnụọgụgụ siri kwuru bụ: APC: 7831 PDP: 60,339

Lee etu o si aga na Bayelsa.
Ọnu na-ekwuru PDP bụ Kola Ologbondiyan si na pati ya anabataghị ọnụ ọgụgu Inec na-akpọpụta na Kogi ọkachasị ine si Okene pụta.
PDP sị ka agbajọ ya bụ ọnụ ọgụgụ vootu.
N'otu aka ahụ, Natasaha Akpoti bu onye zọrọ ọkwa gọvanọ n'okpuru patị SDP sị na ya chọrọ ka akagbuo vootu niile si Kogi pụta na ntuliaka a.
Akpoti sị na ọ bụ maka nrụrụ aka na ọgbaghara mere ya jiri kpọọ okwu a di na akwụkwọ mgbasa ozi o wepụtara.

Smart Adeyemi nọ n'ihu Maazị Dino Melaye na ntuliaka emegharịrị iji hopụta onye ga-anọchịte anya Kogi West n'ụlọ omeiwu nke ukwu.
Maazị Melaye katọrọ ya bụ ntuliaka maka ọ si na nrụrụaka na ogbubu mmadụ karịrị na ya.

Ebe foto si, Senator Dino Melaye
Ndị mmadụ wụsa na-eche ka Inec bido njem ịgụ vootu.


Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na otu nwata akwụwkọ so rụọ ọrụ ntuliaka na Kogi nwụru mgbe ụgbọ mmiri ọ nọ n'ime ya kpuru n'ebe akpọrọ Odogwu.
Dino Melaye so zọọ ọkwa na ntuliaka a emere na Kogi steeti.
O dere n'akara Twitter ya na nwa nwanne ya nwụrụ site na mgbọ egbe agbara ya na ntuliaka a.
BBC Igbo chọpụtabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post