Ọtụtụ ụlọ gbara ọkụ na-adaruzi ala ugbua n'Ọchanja,
A na-asị na ala adịghị mma bụ uru ndị eze!
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Obi nke Onitsha esonyela na ndị na-eti ndị ọkụ tanka a metụtara aka n'obi.
Chimamaka Ihenacho, Chigozie Ohaka, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Adline Okere
A na-asị na ala adịghị mma bụ uru ndị eze!
Essy na-ekele Chukwu na ya na nne ya nwere ike gbapụ ọsọ oge ọkụ ahụ na-akpa ike ụbọchị Wenezde ahụ.
O kwuru na ọ bụ n'otu ebe ahụ ka nna ya sị azụ ha n'ụlọakwụkwọ ma nyekwa ha nri.
Obi Ọnịcha bụ Nnaemeka Achebe ekwuola na obi ya tiwara maka ihe ọkụ tanka a mere n'Ọnicha.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi o depụtara ka o tiri ndị ọkụ a metutara aka n'obi ma kelee onyeisiala bụ Muhammadu Buhari, Gọvanọ Willie Obiano na ndị Eze odinala zitere ha ozi iti aka n'obi.
O kwukwara na ọ na-echeta nke mere na Mee afọ 2015 ebe tanka bụ mmanụ ụgbọala dakwara ma gbuo ihe ruru mmadụ iri isii.
Obi Ọnịcha kwuru na mgbe ọ na ezi ozi Ofala ka o kwuru maka etu Anambra steeti si di.
O kwuru maka etu azumahia na mmepe obodo si bụru ọdachi nye Ọnịcha.
Ekele ya rukwara Gọvanọ Willie Obiano maka etu o siri gbatara ndị Ọnịcha ọsọ enyemaka.
Kama o kwuru, kwusie ike na ezigbo ndị ọrụ mmenyụ ọkụ dị ezigbo mkpa n'obodo mepere emepe dịka Ọnịcha.
Ọkụ mere ndị mmadụ ịwa!
Akụkọ na-eru anyị site n'Ọmaba na-ekwu na ọkụ gbara n'Ọchanja gbara ụlọọahịa otu nwoke ebe nke gbara na n"ọmaba gbara ụlọobibi ya.
Ọ bụ ndị agbataobi nwoke a gwara BBC Igbo ụdịrị ọdachi a metụtara nwoke a.
Gọọmentị Anambra steeti sị na ha emepela ọbaego maka iji nyere ndị ọkụ ọgbụgba a metụtara.
Ha rịọrọ ndị enyi, ndị agbataobi ka ha nyere ndị a aka etu ha nwereike.
N'otu aka ahụ gọvanọ Obiano etinyela atụmatụ inye ndị ọrụ mgbanyụọkụ ikike ịkwụrụ nke onwe ha.
Nke a ga-enwe isi ma ọ bụrụ na ndị ụlọomeiwu Anambra Steeti tinyeaka n'ime atụmatụ a.
Ikike a ga-eme ka ndị ọrụ mgbanyụọkụ hazie ego ọbụla batara ha aka na-abụghị gọọmentị itinye aka na ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uwojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị na ọ bụ ụgbọala iri abụọ na abụọ ka ọkụ gbapịara n'ụlọ a na-arụ ụgbọala dị n'ime ụzọ Udi street Ọmaba.
O kwuru na ọ bụ ụlọ asatọ ka ọkụ a metụtara.
Dịka a na-ekwu nke mere eme, ụgbọala Tanka ọzọ dara ma gbaa ọkụ n'okporoụzọ Ọmaba Phase 1 nke Ọnịcha na mgbede ụnyaahụ.
Mana ndị uweojii site n'ọnụ onye na-ekwuru ha bụ Haruna Mohammed sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ a gbara. Mohammed kwuru na ha ebupụla ụgbọala Tanka a n'ụzọ ka ọ ghara ibute kpachi kpachi okporoụzọ.
Gịnị na-afịọ BBC Igbo taa chakere anya n'ihe gbasara tanka dara n'Ọnịcha.
Ndị gọọmenti ekeupụtabeghi mmadụ ole mberede mere n'Ọnịcha.
Iwe na ọnụma jupụtara ndị Ọnịcha obi, ọ kachasị ndị ọkụ a gbara ụlọ ma ụlọahịa ha.
Ụfọdụ ụlọahịa ndị mmadụ ka na-enwu ọkụ ugbua.
Mkpu akwa na-ada n'elu n'ala.
Ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ ahụ.
Ọtụtụ ndị nwụkwara na ya, dịka onye ntaakụkọ anyị nọ n'Ọnịcha ugbua si kwuo.
Nnọọ nu, anyị na-ewetere unu etu ihe sị aga ebe ọkụ gbara n'Ọnịcha ụnyaahụ.Lee foto tanka ka o siri gbaa n'Ọnicha ụnyaahụ
Ọ gwara ndị ihe ahụ metutara okwu nkasị obi.
Ọ sịrị ha ndo maka ihe ọjọọ ahụ mere ha.
Ọ rịọkwara ndị mmadụ ka ha nyere ibe ha aka n’oge dị otu a.
Ọ rịọkwara ha ka ha ghara ịkpa aghara ma ruwe isi n’iwu obodo.
Ọ kwekwara nkwa na gọọmentị ga-eti ndị ya bụ ihe metutere aka n’obi tupu agbaa ekeresimesi.
Ọ kasiri ha obi na ha ga-agba ekeresimesi a n’ọṅụ.
Ọ sị na ndị kọmitii ga-abịa ebe ahụ echi ịmata ndị ya bụ ihe metutere.
Sị ha nyere ha aka.
Obiano kwekwara nkwa na gọọmentị ga-elebara ọrụ mmgbanyụ okụ Steeti ahụ anya ma nye ha akụrụngwa ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha.
Ọ kwuru na “anyị ga-ajụ ma gbochie ndị ọkanogori chọrọ iji ohere a zuo ihe ndị mmadụ”.
Ọ rịọsiri ha ike ka ha ghara ịda mba.