You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Governorship Election Results: E wepụla Rochas oche n'otele n'Imo steeti

Etu ntuliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu nke steeti si aga n'Ọwụwa-Anyanwụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

  1. Ebe a ka anyị ga-esu ya kpọm.

    Daalụ maka isonye anyị n'oge ntuliaka a.

    Ka ọ dị mgbe ọzọ.

  2. “Ọchịchị obodo ga-anọ n’aka ndị obodo” - Emeka Ihedioha

    Onye merịrị na ntuliaka ọkwa gọvanọ n’Imo steeti bụ Chukwemeka Ihediọha ekwela ndị Imo nkwa na n’oge nke ya “ọchịchị obodo ga-anọ n’aka ndị obodo.”

    Emeka Ihedioha kwuru nke n’ụlọ ya n’ Owere n’ụtụtụ Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

  3. Rivas nọ na gawa gawa adịghị mma, lawa lawa adịghị mma

    Odịnịhu Rivas Steeti ka nọ n'elu ugbua dịka Inec kwụsịrị ihe niile gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ na Rịvas steeti.

    Nke a bụ n'ihi na kọmịti nke Inec hiwere ka o lebanye anya n' akụkọ oke ọgbaghara nakwa ebubo wuruwuru so ntuliaka gọvanọ na steeti ahụ ewepụtabeghị ozi ọbụla banyere ya.

    Onye ntaakụkọ BBC bụ Karina Igonikon kọwara na ha gara n'ụtụtụ taa bụ Tuuzde ebe kọmiti ahụ kwesiri ịgbakọ dịka e nyere ha abalị abụọ ka ha wepụta ozi mana o nweghị onye ha hụrụ.

    Cheta na n'ụbọchị ụka(10/3/2019) Inec nyere iwu ka a kwụsị ihe niille gbasara nchịkọta mpụtara ntuliaka ganye na kọmịtị ha hiwere ilebanye anya n'oke ihe ike mere n'ọtụtụ ọdọ atụmvootu, ntọ ndị ọrụ ha nakwa ikposa ntuliaka, izu nakwa mmebi akwụkwọ ntuliaka.

    Mana ndị gọọmenti steeti ekwuola ka Inec jiri mpụtara ha nwetarala kpọ onye meriri na ntuliaka ahụ.

    N'aka nke ọzọ, onye na-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ na-aha otu AAC kporo Inec oku ka ha kpọpụta aha ya dịka onye meri

  4. A dọtịala mmachi ndị mmadụ na Taraba

    Aka na-achị Taraba steeti bụ Darius Dickson Ishaku ezipula ozi gbasara mmachi ndị mmadụ.

    O nyere ndị ọrụ nchekwa dị icheiche iwu ka ha hụ na mmadụ niile debere iwu a.

    Cheta na ọgbaghara na mwakpo na-akpọtụ n'obodo Jalingo kemgbe ụbọchị Fraide.

  5. Etu ọ dị n'Imo ugbua, Ndị Imo na-egosi etu obi dị ha maka mmeri Ihedioha.

  6. 'Ihedioha kwanyere onwe gị ugwu' - Charly Boy

    Charly Boy bụ otiegwu a ma ama nakwa onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, kelere Emeka Ihedioha maka mmeri ya.

    O kwuru sị na obi ụtọ ya bụ na ọ bụghị Rochas, Uche Nwosu na ndị otu ha meriri, n'agbanyeghi na ọ na-ahụta APC na PDP dịka otu ndị.

    O kwukwara na ọ na-atụ anya na ọchịchị ya ga-enye ndị Imo olileanya, ma dọkwaa ya aka na ntị sị "kwanyere onwe gị ugwu".

  7. Ndị Imo achagokwa anya!, Ndị Imo na-adọkazị mbadamba ọkọlọtọ ndị Uche Nwosu ji chụọ nta vootu.

  8. Ịgwa gị eziokwu, akụkọ dị n'ime ebe a ga-amasị gị

  9. Ihedioha ekeleela ndị Imo

    Onye meriri na ntuliaka gọvanọ n'Imo steeti bụ Emeka Ihedioha ekelela ndị Imo maka ị họpụta ya.

    N'ozi o wepụtara n'igwe okwu Twitter ya, Ihedioha sị,"Daalụnụ ndị Imo."

    "Mmeri a bụ mmeri anyị niile."

    O kwekwara nkwa na ihe niile ya kwuru ya ga-eme ya.

  10. Emeka Ihedioha: E wepụla Rochas oche n'otele n'Imo steeti

    Inec akpọpụtara aha Emeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Imo steeti

    Ihedioha jiri vootu 273,404 were merie Uche Nwosu nke pati AA onye nwetara 190,364.

    Nke a mere na agbanyeghị mbọ nile Rọchas Okorocha, gọvanọ steeti ahụ gbara iji hụ na Uche Nwosu, onye bụ onyeisi ndị ọrụ na steeti ahụ ma bụrụkwa ọgọọ ya nwoke nọchịri ya dịka gọvanọ.

    Ọ gbara mbọ ka Nwosu nweta ọkọlọtọ pati ya bụ APC maka ọkwa gọvanọ mana e meriri ya n'ntuliaka imeụlọ APC.

    O kwadoro Nwosu dịka ọ gafere n'otu AA ịchọ akara aka ya mana ihe mere.

    Nke ka njọ bụ n'ọkwa sineti e cheburu na Okorocha zọtara nwere ike ịgbalahụ ya dịka onye ọrụ Inec bụ Izuchukwu Ibeanwuchi onye kpọpụtara ya dịka onye meriri kwuru na a manyere ya amanye.

    Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-enwe ọṅụ ebe niile n'Imo maka akụkọ a.

  11. Oge a kara aka eruola!

    Oge ahụ ndị Imo niile na-eche eruola.

    Onyeisi ntuliaka Imo steeti bụ ọkamụta Francis Otunta, na-akpọpụta ihe onye nwetara nke ikpeazụ ya na mkpọpụta.

  12. Lee Ikpeazu na-ete egwu mmeri

    A gbaara gị afa, ị ga-ekwe na Okezie Ikpeazụ, aka na-achị Abịa nwere ike ị na-eti eti ka o si eti n'ihe onyonyo?

    O na-agba egwu mmeri o meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ.

  13. Imo Election Result: Ọṅụ, egwu na-akpọtụ n' Owere na ebe ndị ọzọ

    Ka a na-eche mpụtara ntuliaka n'Imo steeti, ụfọdụ ebidola nwewe aṅụrị na mpaghara dị iche iche n'Imo steeti

    A kpọbeghị onye meriri mana agụpụtaala mpụtara okpuru ọchịchị iri abụọ na asaa dị n'Imo steeti.

    BBC Igbo hụrụ ebe ọtụtụ mmadụ tinyere aṅụrị ha n'igwe Facebook:

    Lee ihe ndị mmadụ mere ihe gosi achụmtavootu Uche Nwosu n'abalị a :

  14. Dogara: Mahmood Yakubu ị ga-anọ n'ụlọ ewu amụọ n'ụdọ?

    Onyeisi ụlọmeiwu nke nta bụ Yahuku Dogara akatọọla nkagbu nke Inec kagburu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Okpuru Ọchịchị Tafawa Balewa dị na Bauchi steeti.

    Dogara onye rụturuaka na onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu bụ onye Bauchi dọọ ya aka na nti ya agbala nkịta ka ewu mụọ n'ụdọ dịka o sị gbasa ntuliaka gọvanọ na steeti ahụ.

    Dogara onye kwuru nke a n'ọgbakọ ha kpọrọ ndị ntaakụkọ na Bauchi, ụbọchị Monde sị na mkpebi nke adabeghị n'ihe iwu kwuru.

    Na nkọwa ya, Dọgara kwuru na ntuliaka e mere n' Okpuru Ọchịchị Tafawa Balewa gara siri,werere, na naanị nsogbu e nwere bụ n'ebe nchịkọta mpụtara.

    O kwuru na o were anya na ọ bụ Kauran Bauchi nke PDP na-emeri n'ihe kwesịrị ka Inec mee bụ ịgwa onye ọrụ ha ka odezie ihe otu o kwesịrị na ọ bụghị isi na enweghị ihe doro anya enwere onye mmeri.

    Ọ gara n'ihu kwuo na mkpebi Inec bụ inye ndị wakporo ma dọka akwụkwọ mpụtara ntuliaka ahụ ihe ha chọrọ nke bụ ka akagbuo ntuliaka ebe ahụ.

    O boro ebubo na ndị agboro bụ ndị na-arụrụ aka na-achị steeti ahụ bụ Mohammed Abdullahi Abubakar ma bụrụkwa onye APC ọrụ.

  15. Ọrụ,azụmahịa ebirikwala ọkụ ọzọ n'Anambara

    Azụmahịa na njem okporoụzọ ebirila ọkụ na ebe dị iche iche n'Anambara steeti.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo bụ Ken Udeh gaghariri ọtụtụ ebe di iche iche n' Ọka, isiobodo Anambara steeti were hụ n'udo dị na Ọka na gburugburu ya.

    N' ahịa Eke Ọka nakwa ahịa Nkwọ Ámáenyi n'etiti Ọka, BBC News hụtara ọtụtụ ndị na-azụ ahịa na ndị mmadụ na-eme njem.

    N' ebe a na-akpọ 'Aroma Junction ' na Ọka, BBC Igbo hụkwara ọtụtụ ndị mmadụ ka ha na-aga mkpa ha dị iche iche, ndị nchekwa okporo ụzọ nọkwa n'ọrụ.

    BBC Igbo hụkwara ndị mmadụ gbakọrọ n' ọdọ ahịa akwụkwọ akụkọ na-enwe mkparitaụka banyere ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Ndị BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ntuliaka ndị Ụlọomeiwu na Ọka na Steeti Anambara gba gburugburu gara nke ọma. Ha kwuru na tigbue zogbue adịghị, ebe ụfọdụ bokwara ebubo na ha hụtara nrụrụaka n'ebe ụfọdụ n'oge ya bụ ntuliaka.

  16. E bidola ngagharịiwe na Pọtakọt

    Ndị mmadụ pụtara n'igwe na Pọtakọt,isis obodo Rivas Steeti ime ngaghariiwe maka nkwusị Inec kwụsiri ihe niile gbasara antuliaka na steeti ahụ.

    Akwụkwọ ha bu n'aka were agagharị na-ekwu gụnyere: "Inec mechapụ ihe niile gbasara ntuliaka ka udo chịa ."

    Cheta na ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec kwụsịrị ihe niile gbasara ntuliaka n'ihi oke ọgbaghara , ihe ike mere na steeti ahụ kemgbe Maach 9.

  17. APC emeriela na Borno

    Babagana Zulum nke APC enwetala vootu kachasi na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ e mere na Borno steeti.

    Zulum onye nwetara vootu 1,175, 440 meriri Muhammad Imam nke PDP onye nwetara vootu 66, 115.

  18. Ndị agha agọrọla aka ha n'okwu Rivers steeti

  19. Adamawa, Bauchi, Plateau na Sokoto dị 'inconclusive'

    Inec ekwuola na ntuliaka e mere n’Adamawa, Plateau na Sokoto dị ihe Bekee kpọrọ “inconclusive” ebe a ga-atụgharị nke Bauchi n’ime ụbọchị iri abụọ na otu na-abịa.

  20. A ka na-akpọpụta mpụtara n'Imo steeti

    Chọpụta mpụtara ntuliaka Imo steeti ka o si aga ebe a:Mpụtara ntuliaka Imo steeti

    Okpuru Ọchịchị Ideatọ-South

    Accord : 130

    AA : 40, 438

    APC : 4, 893

    APGA : 4, 65

    PDP : 3, 600

    Ndị debanyere aha: 76, 341

    Ndị a nabatara ịtụ vootu: 56, 382

    Vootu niile a tụrụ: 55, 569

    Vootu a tụrụ dị mma :55569

    Vootu a jụrụ ajụ : 785

    &Z�����(@

    ______________________________________________________________________

    ISIALA MBANO

    Accord: 1, 639

    AA: 3, 383

    APC: 1, 893

    APGA: 17, 817

    PDP: 3, 589

    Ndị debanyere aha ha: 95, 104

    Ndị anabatara ịtụ vootu: 29, 975

    Vootu niile a tụrụ: 29, 652

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 28, 927

    Vootu a jụrụ ajụ: 725

    __________________________________________

    EZINIHITTE MBAISE

    Accord: 138

    AA: 2, 646

    APC: 1, 462

    APGA: 1, 356

    PDP : 30, 035

    Ndị debanyere aha ha: 87, 497

    Ndị anabatara ịtụ vootu: 37, 442

    Vootu niile a tụrụ: 37, 244

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 36, 510

    Vootu a jụrụ ajụ: 734

    ______________________________________________

    EHIME MBANO

    Accord: 538

    AA: 5, 477

    APC: 3, 094

    APGA: 12, 410

    PDP: 5, 238

    Ndị debanyere aha ha: 74, 329

    Ndị anabatara ịtụ vootu: 29, 700

    Vootu niile a tụrụ: 28, 700

    Vootu niile a tụrụ dị mma: 27, 969

    Vootu a jụrụ ajụ: 731