You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndọrịtaụka BBC Igbo nke Ebonyi steeti

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Ebonyi steeti na-eme ndọrịtaụka na steeti ahụ taa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa

  1. Ndị be anyị, anyị na-ekele unu maka isonyere anyị, Daalụ

    Kachifonu!!

  2. Ndị mmadụ na-ekwu maka emume a n'elu soshal midia

    Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka emume a n'elu social mediaNdị mmadụ gosiri mmasị ha ikiri ndọrịtaụka a n'elu soshal media.

  3. Etu o si eme ugbua n'elu Facebook anyị

    Sonyekwa na @bbcnewsigbo na Facebook nakwa Instagram

  4. Gọvanọ Umahi kwuru ka ya na Nnamdi Kanu sị gaa, Umahi rịọrọ ka Ipob kwụsị ikpọ ndị Naịjirịa iyi ma na-achụkwa ihe ọ bụla ha na-achụ.

    Chọpụta ya ebe a: https://www.facebook.com/BBCnewsIgbo/videos/2122986061122300/

  5. Pati AAP kwuru na goọmenti Umahi dara ada n'ihe gbasara ndị dọkịnta ahụike, Okorie katọrọ etu Gọvanọ Umahi si emeso ndị dọkịnta ahụike

  6. Ndị Ebonyi na-ajụ ajụjụ gbasara ndị ọrụ, ahụike, agụmaakwụkwọ,nakwa ugbo, Ndị Ebonyi chọrọ ka aza ajụjụ ha.

  7. Sam Egwu bụ aka chiburu Ebonyi steeti nọ na ya bụ emume, Umahi kpọtara aha gọvanọ chiburu Ebonyi steeti bụ Sam Egwu mgbe ọ na-aza ajụjụ nsogbu Ebonyi

  8. Ndị mmadụ juputara ebe ndọrịtaụka a na-eme, Ndị Ebonyi steeti putara n'uju isonye na ndọrịtaụka a

    Ndị Ebonyi chọrọ ịma ihe ọ hụrụ Gọvanọ Umahi ga-emere ha ma ọ banye ọkwa gọvanọ ọzọ.

  9. Etu ọ dị ugbua , ọ bụ naanị pati abụọ biara ndọrịtaụka a n'ime ise kwesiri ịnọ ya, Pati PDP na Pati AAP bụ ndị bịara ndọrịtaụka BBC Igbo hibere n'Ebonyi steeti.

  10. Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ma bụrụkwa onye otu pati PDP ekwuola uche ya, Umahi na onye nke otu pati AAP bụ Ogbonnaya Okorie na-akwata ya ugbua

  11. Onye otu pati Advanced Alliance Party bụ Ogbonnaya Okorie ekwuola ihe mere o ji achọ ịchị Ebonyi, Ogbonnaya kwuru na ọ chinwụrụ ndị be ya, ya mere ọ ga-achịnwụ Ebonyi

  12. Ndị mmadụ gụnyere onye chịburu Ebonyi steeti awụchiela, Sam Egwu bụ aka chiburu Ebonyi steeti na ndị ọzọ nọkwa ebe ahụ

  13. Ndọrịtaụka BBC Igbo na-eme n'Ebonyi steeti ugbua, Ndị mmadụ edenyechala aha ha n'akwụkwọ iji sonye na ndọrịtaụka na-eme n'Ebonyi

    Ndị be anyị, anyị na-anabata ụnụ na ndọrịtaụka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na-eme na Ebonyi steeti nke BBC Igbo hibere.