Ndeewonụ!
Ndị be anyị, n'ebe ka anyị na-achịsa ọwa na iwetara ụnụ akụkọ ihe mere taa bụ Monde ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 2018 na ntuliaka imeụlọ APC n' ọwụwaanywanwụ.
Sonyere anyị oge ọzọ.
Igbo mma mmanoo!
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
BBC Igbo na-eweta akụkọ usoro ndị APC ji ahọpụta ndị ga-anọchite anya ha na ntuliaka gọvanọ na 2019 ka o si aga.
Chioma Obianinwa and Uche Akolisa
Ndị be anyị, n'ebe ka anyị na-achịsa ọwa na iwetara ụnụ akụkọ ihe mere taa bụ Monde ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 2018 na ntuliaka imeụlọ APC n' ọwụwaanywanwụ.
Sonyere anyị oge ọzọ.
Igbo mma mmanoo!
Na nkeji ole no ole gara aga, Odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC n'Imo steeti bụ Jones Onwuasoanya gwara BBC Igbo na "o nweghị ntuliaka ọbụla e mere n'Imo tata."
N'okwu ya, Onwuasoanya kwuru na a ga-asị na e nwere ntuliaka naanị ma ọ bụrụ na akwụkwọ mpụtara ntuliaka(result sheets) nke pati ha wepụtara dị n'ọnọdụ ndị e hiwere maka atụm vootu.
O kwuru na ndị isiọrụ APC si Abuja ndị ji akwụkwọ ahụ eruteghị n'oge(dịka ha rutere n'ebe elekere abụọ nke ehihe), na ntuliaka emeghị n'Imo.
Dịka o siri kọwaa, ndị isiọrụ pati ha ka na-ezukọ iji tụọ alọ ma ha ga-eme ntuliaka ahụ echi.
Cheta na kemgbe ụtụtụ, BBC Igbo nọ na-ewetara ụnụ akụkọ ka o si aga na ntuliaka imeụlọ APC na mpaghara ọwụwaanyanwụ.
Ndị mmadụ pụtara n'igwe ịtụ vootu.
Ọtụtụ ndị a pụtara bụ ndị na-akwụnyere Osote Gọvanọ steeti ahụ bụ Eze Madumere.
Mana ọsọ tara dịka ṅdị agbaro dabatara bido gbaliwe egbe elu were chụsasịa ndị mmadụ.
Ọgụ dara n' isiụlọrụ APC dị n' Owere dịka eseokwu maka ego dapụtara n'etiti ndị ntorobia APC na ndịọrụ pati ha.
E kere ha otu puku naira(N1000) mana ha jụrụ, sị na o pere mpe.
Onye ntaakụkọ BBC enwenwughị ike isete foto ka nke a na-eme n'ihi ọgbaghara ahụ kpụ ọkụ n'ọnụ oge o mere.
Dịka ndịisi si Abuja na ndị na-ahazi ntuliaka nakwa ndị ọgbasara mechara nzuko, e higharịrị ntuliaka imeụlọ ndị Abịa steeti rue echi bụ Tuzde.
Ọ bụ onyeisioche kọmiti na-ahazị ntuliaka bụ David Nyoha kwupụtara nke oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Ụmụahịa.
Nyocha onye kwuru na ha kwekọrịtara na 'direct Primaries', kọwara na a ga-ebido ike ngwaarịa a ga-eji tụọ vootu nelekere isii nke ụtụtụ, ebe ntuliaka ga-ebodo ozigbo.
Na nkọwa ya, ọ bụ naanị onye aha ya dị n'akwụkwọ pati ha n'etiti, ji caadị ya maọbụ PVC ga-enwe ohere ịtụ vootu.
Ndị ahụ si Abuja bịa na ndị na-azọ ọchịchị nakwa ndị nwere agba na pati ha banyere nzukọ.
E kweghị ka ndị ntaakụkọ sonye n'ọgbakọ ahụ.
Isiụlọọrụ APC n’Ọlụ tọgbọrọ chakoo.
A gbachiri ebe niile agbachi.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'Imo steeti, Osote gọvanọ steeti ahụ bụ Eze Madumere kwuru na ya kacha mara ọrụ n'ime ndị niile na-azọ ọkwa govanọ.
N’okwu ya, ọ mara ebe ọ ga-akpa aka were dozie nke adịghị mma na steeti ahụ.
Gee ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a:
Ndị mmadụ nọkwa na-eche ka ndị ọrụ pati bịa n'Amụzukwu Urban Wọọdụ 2 dị n'Ụmụahịa ka ha wee tụọ vootu ha.
Foto gosiri ka ndị mmadụ si kwuru na-eche ka ha tụọ vootu na wọọdụ Akwakuma n'Owere. Mana o nwebeghị ndị ọrụ pati APC biagoro na wọọdụ ahụ.
Onye ntakụkọ BBC kwuru na a wakporo Emekuku wọọdụ 2 ma mee Uche Nwosu onye mmeri n'ike.
Ndị mmadụ wara mbombo ọsọ mgbe ndị a ji egbe bata.
Okorocha kwuru na ya ga-anabata ha niile dịka ụmụaka maọbụrụ na ha lagachị azụ.
Lee ihe nkiri ya ebe a.
Uche Nwosu bụ onye gọvanọ Rochas Okorocha na-akwado dịka gọvanọ na ntuliaka ime ụlọ a.
Uche Nwosu enwetaghị vootu ọbụla na wọọdụ 'Unity Primary School' Umuchoke Amaigbo na ntuliaka imeụlọ a na-eme n'APC ugbua.
Hope Uzodimma onye ya na Uche Nwosu nọ n'otu wọọdụ nwetara vootu niile merie Uche Nwosu.
Uzodimma nwetara vootu 50 ebe Nwosu nwetara 0.
Oge ndị ntaakukọ BBC Igbo ruru ụlọọrụ APC na Mbaitoli ebe niile dara chakpo!
Mbaitoli bụ ebe aka Madumere siri ike makana ebe a bụ obodo a mụrụ ya.
Cheta na otu ụlọikpe n'Owere n'ime izụka garaga kpebiri na Madumere ka bụ osote govanọ Imo steeti.
A ka na-eche ndị ọrụ pati n'ebe Uche Nwosu ga-eme ntuliaka.
Ọ bụ ụlọakwụkwọ a na-akpọ "Unity Primary School" dị n'Umuchoke Amaigbo.
Ndịọrụ pati APC abịabeghi n'ụlọọrụ ha dị n'Umuahia ebe a ga-eme ntuliaka imeụlọ ha.
A na-ele anya ndị ọrụ ahụ si Abuja ga-abịarute ilebe anya na ya bụ ntuliaka.
Nnukwu onunu a n'elu akwa mmiri dị n'ụzọ na-aga obodo Rochas Okorocha bụ gọvanọ na-achị imo steeti.
Onunu a dị n'obodo Ụmụchima n'Imo steeti.
Mmiri ozuzo na-ekele ndị Owere dịka ndị APC chọrọ ime ntuliaka imeụlọ ha taa.