Otito na ndị nwunye na-alụ ọgụ

Mmemme akwamozu onye ndorondoro ọchịchị ama ama na ọsote onyeisi ala oge gara aga bụ Alex Ekwueme.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Eliela Ekwueme ka nnukwu mmadụ ọbụ

    Ndị biara akwa n'akwamozu Ekwueme alawala.

    Lotanụ na Yemi Osinbajo bụ osote onye isi ala kọwara Ekwueme dika okosisi Naijirịa ekwesiri ikwanyere nnukwu ugwu.

    O jikwa ohere ahụ kwupute na gọomentị etiti abaala Mahadum akpọrọ Ndufu-Alike Ikwo n'Ebonyi steeti n'aha Alex Ekwueme.

    Nonyere BBCIgbo.com maka akụkọ ndị ọzọ na bịa.

    Akwamozu Ekwueme
  2. Ọgụ ndị nwunye Ekwueme

    Dịka ichie ọ bụ, ọ fọrọ ntakịrị ka ndị nwunye Ekwueme kụọ ọkpọ ebe ha na-azọ oche. Nwunye nke mbụ ekweghi anọkete nwunye ya abụọ ndị ọzọ,sị n'aha bụ ụmụnwaanyị ndị ikom Ekwueme.

    Nwunye Ekwueme akpọrọ Beatrice
  3. Ihe ndị mmadụ n'ekwu n'ịgwe okwu

    Ka a na-akwa Ekwueme, ma ndị ukwu ma ndị nta na-esi igwe okwu na-egosipụta nkwado ha kwadoro ezi na ụlọ Ekwueme na akwamozu ya:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 3

  4. Ọkpara Ekwụeme n'ekele oha na eze

    Ihe onyonyo a n'egosi dị ọkpara Ekwueme ebe ọnọ n'ekele igwe mmadụ pụtara ikwado akwamozu nna ya:

    Aha onyonyo, Ọkpara Ekwụeme n'ekele oha na eze bịara akwamozu
  5. Ugwu ka ugwu - okpu mmemme n'elu akpatị ozu ya

    Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe mmemme a na-aga eziterela anyị foto.

    Foto nke a gosiri okpu mmemme edowere n'elụ akpatị ozu Ekwụeme, nke a gosiri naọbụ onye amama:

    Akpatị ozu Ekwụeme gosiri ugwu ukwu akwanyere ya

    Ebe foto si, BBC Igbo

    Ndị nnukwu mmadụ pụtara n'ime ụlọụka i so kwanyere ya ugwu. Nwunye onye bụ onyeisiala mbụ bụ Patience Jonathan na ndị ụkochukwu ukwu sonyere na mmemme a:

    Ndị nnukwu ukochukwu biara na mmemme a

    Ebe foto si, BBC Igbo

    Nwunye onye bụ onyeisiala mbụ bụ Patience Jonathan pụtakwara na nkwanye ugwu a

    Ebe foto si, BBC Igbo

  6. A donyela Ekwueme n'ala

    Ndị mmadu kariri puku iri zukọtara n' Oko dị na steeti Anambara iji gba aka ebe ka a donyela ozu Alex Ekwueme n'ili.

    Ha gụnyere onye isi ala chịburu mbụ bụ Goodluck Jonathan na oriakụ ya, Gọvanọ Sokoto steeti, Aminu Tambuwal,nke Abia steeti Gọvanọ Okezie Ikpeazu, nke Delta Steeti, Gọvanọ Ifeanyi Okowa.

    Ndị ọzọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na odeakwụkwọ nke gọọmentị etiti bụ Boss Mustafa.

    Ndị uwe ọjii kwu na ahịrị nkwanyere ukwu nye Ekwueme
  7. Agụgharịala mahadum Ebonyi aha Ekwueme

    Dika Ebere Ekeopara,ọnye ntaakụkọ BBC siri kwuo,osote onyeisi ala bụ Prof Yemi Osinbajo nọrọ na akwamozụ ahụ ma ọkwa na onyeisi ala bụ Muhammadu Buhari emeghariala aha Federal University Ndufu-Alike, Ikwo (FUNAI) dị n' Ebonyi steeti ka ọ bụrụ 'Ekwueme University'.

    Dr Alex Ekwueme hụrụ agụmaakwụkwọ n'anya nke ukwu, ma nwe ọtụtụ asambọdọ ọtụtụ mahadụ
  8. Ọtụ e si eli nnụkwụ mmadụ n'ala Igbo

    Ọ bụrụ na-akachara ya ụka n'ụlọụka, a ga-ebụ ọzu ya gawa n'ụlọ ya ebe ndị ikwu na ibe, ndị enyi na ndị ọgo ga-abiara ya ụlọ akwa.

    Ha ga-eji akwa, ego, mmanya na ihe onyinye dị icheiche. Ụfọdụ ga-akpọrọ ndị egwu bịa.

    Ọtutụ ndị otu na nzụkọ ga-abiakwa mgbaru iji kwanyere ya ugwu.

    Ana agbakwara onye dị otu a egbe mkpọna ala iji dulaa mụọ ya.

    Ndị mmadụ na-enubata akwamozụ Ekwueme
  9. Ebubatala ọzu Ekwueme n'ụlọụka

    Ebere Ekeọpara, onye ntaakụkọ BBC kwuru na ebubatala ozu ọke osisi Igbo ji eje mba bụ Dr Alex Ekwueme n'ime ụlọụka St John Divine Anglican Church, Oko, Anambra steeti ka akara ya uka ikpeazụ.

  10. Ndị eze na ndị ọdịnala so kwanyere ya ugwu

    Ụnyaahụ, ndị eze na ndị ọdịnaala sọ na ọtụ ndị gbakọrọ n'Ọka (Awka) , isiobodo, Anambara steeti maka nkwanye ugwu ikpeazụ:

    Ndị eze na ndị ọdinala biara na Ekwueme Square, Awka ụnyaahụ
  11. Ofufe nro ili ozu Ekwueme

    Onye ntaakụkọ BBC bụ Ebere Ekeopara nọ na St. John the Divine Anglican Church, Oko, Anambra Steeti maka ofufe nro ili ozu Ekwueme taata.

    St. John the Divine Anglican Church, Oko Anambra Steeti
  12. 'Ekwueme enweghị ebubo mpụ ọbụla'

    Foto Ekwueme

    Otu onye na ndị na-ekwu okwu ọma banyere Ekwueme bụ onyeisi Ohanaeze Ndigbo, Nnia Nwodo onyeisi Sineti n'ala Naijiria bụ Chief Ken Nnamani kwuru na ọ bụ onye eziokwu, na ọ nweghị ebubo mpụ ọbụla.

  13. 'Ṅomie nụ Ekwueme'

    Ụbọchị Wenezde, Bishop Emmanuel Chukwuma gwara ndị gbakọrọ n'emume ikwanyere Ekwueme ugwu ikpeazụ nke e mere n' Enugwu ka ha ṅyomie ezigbo ndụ Ekwueme biri mgbe ọ nọ ndụ:

    Aha onyonyo, Akwamozu Ekwueme: Ụka nkwanye ugwu ikpeazụ ya
  14. Ndị bịara akwa juputara n'Oko

    BBC ga-ewetara ụnụ ka o sị eme n' akwamozu Alex Ekwueme.

    Onye ndọrọndọrọ ọchịchị a amara amara nwụrụ na ọnwa Nọvemba afọ gara aga ka ọgbara afọ iri asatọ na ise. Ọtụtụ mmadụ bịara mmemme akwamozu ya na-etọ ya na-ekwupụta na o nweghị ebubo mpụ ọbụla.