"Nne na nna m nwụrụ ka ha na-achọ nwanne m na-amaghị na a kpọchiri ya nga mgbe ọ dị afọ 14"
- Onye dere ya, Marvelous Obomanu & Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist & Video Journalist
Ihe a bụ akụkọ otu nwoke na Rivas steeti ezinaụlọ ya chere na ọ nwụọla mana ha amaghị na ọ nọ n'ụlọmkpọrọ kamgbe.
Gospel Kinani bụ onye e tinyere n'ụlọmkpọrọ mgbe ọ dị afọ iri na anọ, ọ nọ n'ụlọmkpọrọ afọ iri na asatọ.
Nne na nna ya chọrọ ya ebe niile tupu ha laa mụọ mana o nweghi onye hụrụ ya
Paul Kinani, nwanne ya nwoke kwuru na ezinaụlọ ha chere na Gospel Kinani anwụọla dịka ọtụtụ afọ gachara ma ha ya.

Mgbe BBC Igbo gbara Paul ajụjụ ọnu, ọ kọwara na ha amaghị ndị nwuchịrị ya maọbụ ihe gbasara ikpe ya. "Ihe anyị ma bụ na o richara nri n'ụtụtụ ụbọchị ahụ, oge mgbede anyị ahụghị ya ọzọ. Ọ bughị onye na-anọ na-ezi. Anyi amaghị ihe na-eme"
Ujọ bara ezinaụlọ Gospel n'ahụ dịka ha chọwara ya. "Ụbọchị ahụ gara ma anyị ahụghị ya. Nke a bịa bụrụ ezigbo nsogbu dapụtara anyị"
"Etu a ka anyi si na-ata ahụhụ na-achọ ya tupu nne m ebido rịawa ọria n'ihi ofufu nwa ya, mana o mechara nwụọ. Nna m enweghi ike idi nwa ya furu efu na nwunye ya nwụrụ n'ihi ya, o soro nwunye ya laa kwa mmuo"

Paul onye na-amaghị na nwanne ya nwoke ka dị ndụ kamgbe, kọwara na Mgbe otu ụlọọrụ a na-akpọ Haven360 Foundation kpọrọ ya n'ekwentị ma gwa ya na nwanne ya nwoke ka dị ndụ mana ọ nọ n'ụlọmkpọrọ, obi ọma kpara ya nke ukwuu.
Okaiwu Cyrus Onu, onyeisioche ndị Haven360 Foundation — otu ndị na-ahụ maka ikike dịịrị onye lebara anya n'okwu Gospel n'afọ 2020 kọwara na e tinyere Gospel n'ụlọmkpọrọ site n'uzọ iwu na-akwadoghi.
Ọ si na mgbe mmadụ nọ n'ụlọmkpọrọ, ihe a ga-eji ama ihe o mere bụ akwụkwọ njide nke bekee na-akpo 'arrest warrant' na nkwupụta nke ụlọikpe na-enye e ji etinye mmadụ n'ụlọmkpọrọ nke bekee na-akpọ 'remand order' mana onweghị ihe ndị dị etu a tupu e tinye Gospel n'ụlọmkpọrọ.
Kaa ọ dị ugbua, a kpọrọla Gospel gaa n'ụlọọgwụ ebe ọ ga-enweta ọgwụgwọ zuruoke maka ahụike uche ya nwere nsogbu n'ihi n'ogologo afọ ọ nọrọ n'ụlọmkpọrọ.
Mgbe anyi kpọtụụrụ ndị uweojji Rivas steeti, ha sị na ndị ụlọmkpọrọ kwesịrị inwe akwụkwọ gbasara Gospel Kinani.
Onye na-elekọta ndi e tinyere na mkpọrọ na Rivas steeti bụ Felix Madumere kọwara na Gospel Kinani nwere akwụkwọ e ji kpọta ya n'ụlọmkpọrọ.
"Akwụkwọ e ji kpọta ya gosiri na e boro ya e bubo izu ohi. Aha ya n'akwụkwọ ahụ bụ Baridi Sunday, ọ gbara afọ iri abụọ na abụọ mgbe a kpọtara ya n'ụlọmkpọrọ".



