Africa Eye: Etu ndị nhazi egwuregwu bọọlụ si emetọ ụmụntakịrị nwoke na mba Gabon
Africa Eye: Etu ndị nhazi egwuregwu bọọlụ si emetọ ụmụntakịrị nwoke na mba Gabon
Idọ aka na ntị: Akụkọ a na-ekwu maka mmetọ ụmụaka.
Ọtụtụ ụmụaka n'ala Afrịka bụ ndị chọrọ ịso gbaa bọọlụ ma dịrị njikere ime ihe ọbụla ịhụ na olileanya ha bịara na mmezu.
Mana o nwere ihe dị njọ na-eme n'okpuru ọzụzụ ụmụntakịrị ọ kachasị ndị nwoke na-achọ ịgba bọọlụ.
Nyocha BBC mere gosiri na o teela aka, ihe dịka afọ kwuru afọ kemgbe ebidoro metọba ụmụntakịrị na-achọ ịgba bọọlụ na mba Gabon.
Otu onye gwara BBC okwu kwuru na a gwaala ngalaba na-elekọta ọgba bọọlụ na mba ahụ maka mkpamkpa na-akpa mana o nweghi ihe ha mere maka ya.
Ọ bụ naanị mgbe otu akwụkwọ ntaakụkọ mba Briten dere maka ya ka anwụchiri ndị nkuzi bọọlụ anọ ma mechaa tọghapụ otu onye.
Gee ntị ka ị nụrụ ihe a chọpụtara.




