Ihe onye ezinaụlọ Anthony Joshua kwuru banyere ihe mberede o nwere
Ihe onye ezinaụlọ Anthony Joshua kwuru banyere ihe mberede o nwere

Otiọkpọ a ma ama Anthony Joshua ezutela ezinaụlọ ndị enyi abụọ ahụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ mere n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025.
Foto Anthony Joshua wepụtara n'akara Instagram ya n'ụbọchị Sọnde 4 Jenụwarị, 2026, gosiri ebe ya na ndị ezinaụlọ Latif Ayodele na ezinaụlọ Sina Ghami nọ dịka ọ gara zute ha ma tie ha aka n'obi maka oke ọdachi ahụ dakwasịrị ezinaụlọ.
Cheta na Latif Ayodele na Sina Ghami bụ ndị enyi Anthony Joshua nwụrụ oge ụgbọala ha na Joshua ji eme njem nwere ihe mberede n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025.



