You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Solar Powered Vehicle: Lekwa ụgbọala latrik ndị Federal Polytechnic, Nekede rụpụtara
Ụlọakwụkwọ Federal Polytechnic Nekede, rụpụtara ụgbọala latrik nke ụfọdụ ndị nkuzi ngalaba 'Mechanical na Electrical' inginịa rụpụtara.
Enweghi ezi ọkụ latrik bụ otu n’ime nsogbu na-egbochi ụgbọala latrik ịdị ire na Naịjirịa.
Mana ụgbọala a na-eji ikike si n'anyanwụ a kpọrọ 'Solar Energy' arụ ọrụ.
Ụgbọala na-eji mmanụ na-emebi ọnọdụ ihu eluigwe nakwa gburu gburu ebe obibi mmadụ, dịka ndị ọkachamara si kwuo.
BBC gbara ndị nkụzị na ụmụakwụkwọ rụrụ ya bụ ụgbọala ajụjụ ọnụ ka ha kọọwa ka ha sị rụọ ya.
Pius Nwosu bụ onye nọ n'isi nrụpụta a sị na o were ha ọnwa isii iji rụọ ya, mana ịrụpụta ọzọ agaghị ewe ha karịa otu ọnwa.
Osote onyeisi Mahadum ahụ bụ Christopher Chijioke sị na ụgbọala a ga-nyere ha aka ịhazi ọnọdụ njem n'ime ụlọakwụkwọ ahụ.
Ọtụtụ mba na-eche na ụgbọala latrik ga-ewere ọnọdụ n'ụwa n'afọ 2030.