Anambra election 2021: Ihe mere m ji si n'ọrụ dọkinta wee na-achọ ọdịmma ndị Anambra - Dkt Godwin Maduka

Aha onyonyo, Anambra election 2021: Ihe i kwesịrị maka Godwin Maduka na-azọ ọkwa gọvanọ

Dọkịnta n'ahụike bụ Dọkịnta Godwin Maduka, onye ji aha Accord Party azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra Steetị kọwara etu o siri taa ahụhụ ma bụrụ mmadụ taa.

Na Mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Maduka sị na ahụhụ ya malitere mgbe nna ya nwụrụ.

Ọ sị na ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na sekọndịrị n'obodo ha bụ Umuchukwu dị n'Orumba nke Anambra Steeti mana ego adịghịzi ịbanye mahadum.

Maduka sị na ọ bụ nwanne ya nwoke ọ tọrọ bụ onye nyere ya puku naịra ise o ji banye mahadum n'oge ahụ.

O mechara gụkwuo akwụkwọ na mahadum dị oke na mba Amerịka.

Ụfọdụ ndị obodo ya gbakwara ama ihe ọma niile ọ na-emere ha.

Kirie ihe ha kwuru n'uju;