Lee mkpamkpa ọkụ si na Kerozin adigboroja kpara n'ahụ ndị mmadụ
Mmadụ anọ anwụọla pịị ebe otụ nwaanyị nọ na nnukwu ahụ ụfụ ugbua n'ihi na kerosene gbara ya ọkụ ụbọchị tọzde 19th August 2021 na be ya dị n'Aku Igboetiti LGA.
Nwaanyi ya bụ mkpa mkpa kpara n'ahụ ya bụ Nkechi Aka kwuru na ya gbatara ya bụ mmanụ Kerosene na Senom filling station dịka ya si emebu na mbụ.
Ngwa ngwa o ruru n'ụlọ ka o jiri kerosene ahụ ga tinyere ụmụ ọkụkụ ya mpanaka, ọkụ ahụ ọmụnyere gbara ka ogbunigwe munye ya ọkụ.
Nwaanyị ahụ nọzị n'ụlọ ya anara ọgwụgwọ.
Di ya bụ Emmanuel Aka kelere Chukwu na nwunye ya ji ndụ ya pụta ebe ọtụ ndị akụ tufukwara ndụ ha.
Oge BBC rutere na ya bụ Senom filling station Aku, anyị chọpụtara na ya bụ filling station gbachiri agbachi.
Dịka anyị chọpụtara na onye nwe filling Station ahụ gbachiri ya ka mgbe ndị ahụ nwụrụ.