Jude Eze and Lastma clash: 'Etu ndị ọrụ Lastma si mee ka afọ ime nwụnye m pụọ'

Jude Eze bụ onye Igbo na-azụ ahia akọwala ihe ya na nwunye ya bụ Sophia Eze gabigara n'aka ụfọdụ ndị ọrụ Lagos State Traffic Management Authority(Lastma).

O kwuru na agwa ọjọ ụfọdụ ndị ọrụ Lastma kpasoro ha ụbọchị June 25 ọ na-ebuga nwunye ya ụlọọgwụ mere ka nwa nọ ya n'afọ pụọ makana nwunye ya na-agba ezigbo ọbara ụbọchị ahụ.

O kwuputere ọtụtụ ihe n'ihe nkiri a dị ebe a.

N'aka nke ọzọ onyeisi Lastma bụ Olajide Oduyoye kwuru na ụlọrụ ha anabatala akwụkwọ mkpesa nke ọkaiwu Jude Eze degaara ha, nakwa ha na-elebanye ya anya ugbua.