Covid-19 Vaccine: Lee etu ọgwụ mgbochi a si bata ala Igbo

Ọgwụ mgbochi Covid-19 si n'ụlọọrụ Astrazeneca eruola alal Igbo taa bụ ụbọchị Wenzde dịka ezigara nke ga-ekpuchi Anambra, Imo nakwa Enugu steeti

Kọmịshọna ahụike Enugwu steeti bụ Ike Obi kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị gọọmentị, ndị ọrụ ahụike nakwa ndị okenye na-arịabụ ọrịa ga-ebu ụzọ keta oke na ya.

Ọgwụ mgbochi ahụ ndị anabatara n'ụbọchị Wenzde bụ mbụ ọ nba-eru mpaghara ala Igbo kemgbe ebubatara ya Naịjirịa n'ụbọchị abụọ nke Maachị.