Nigeria Paralympics: 'O nweghi mgbe m ji rọọ nrọ ịbụ onye egwuregwu' - Lauritta Onye
Lauritta Onye bụ onye na-anọchị anya Naịjirịa n'egwuregwu ndị ike dị n'obi ekwuola etu o si bido ya bụ ihe.
Ọ kọwara etu o si bịa Legọs ime ejije Nollywood, tupu mmadụ agwa ya maka isonye n'ihe egwuregwu.
Ọ malitere ịnọchite Naịjiria n'asọmpi n'afọ 2008.
Lauritta bụ akpụrụka n'ịtụ "shotput", ebe o riterela onwe ya na Naịjirịa ọlaedo abụọ nakwa ọlaọcha abụọ.
A mụrụ Lauritta bụ nwaanyị Imo state bụ "a kwaa a kwụrụ" n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1984.
Gere ọnụ okwu ya ebe a:

