Coronavirus in Africa: Ahụhụ anyị na-ata n'inyocha ndị mmadụ ahụ maka coronavirus

Aha onyonyo, Coronavirus in Africa: Ahụhụ anyị na-ata n'inyocha ndị mmadụ ahụ maka coronavirus

Ndị ọrụ ahụike na Saụt Afrịka akọwala ihe ha gabigara dịka ha na-agagharị inyocha ndị mmadụ ahụ maka ọrịa coronavirus.

Otu n'ime bụ onye nọọsụ bụ Tshego Selona sị na tara ahụhụ dị iche iche n'oge nyocha a nke gụnyere ịgbahapụ ezinaụlọ ha, ibute coronavirus, ọnwụ na ihe ndị ọzọ.

Ọ sị na ndị mmadụ na-asọ ha asọ maka na ha nwereike ibunye ha ọrịa coronavirus.

Selona sị na ga anaghị ehi ụra ọfụma n'abalị dịka ha na-agba mbọ ịgazu mpaghara ime ime obodo Saụt Afrịka.

O kwukwara na ọtụtụ ndị ọrụ ahụike ibe ya nwụrụ n'ọrịa mana ọ gbakere na-agbanyeghi na o butere ọrịa a.

Kirie ihe o kwuru n'uju: