Ihe mere m ji hapụ ọrụ uweojii chie Fada n'ụka Katọlik

Aha onyonyo, Ihe mere m ji hapụ ọrụ uweojii chie Fada n'ụka Katọlik

Fada Cajetan Obiekezie nke ụka Katọlik Awka dayọsis gwara BBC Igbo ihe mere o ji hapụ ọrụ ya dịka onye uweojii ma chie Fada.

Ọ sị na ọ na-ewete ya ma ọ hụ ka mmadụ na-emegbu mmadụ ibe ya, na ọ ga-ahụ na onye tara ahụhụ ruru ya na-agbanyeghi onye ọ bụ.

Na ọ bụ mere o ji banye n'ọrụ uweojii, gụọkwa akwụkwọ dịka ọkaiwu nakwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

N'ihi ọrụ nakwa agụmakwụkwọ ya mere ọ jiri ruo ogogo 'Superintendent' n'ọrụ uweojii.

Mana n'ihi etu okwu Chukwu ji atọ ya ụtọ nakwa mmasị o nwere n'ịgụ akwụkwọ nsọ mere o ji hapụ ọrụ uweojii ma chie Fada.

Kirie ihe o kwuru n'uju.