BBC Africa Eye: Etu e si atụ ụmụaka dị bido afọ ise ịga ebe ha na-amụ ekpere

BBC News Arabic zoro ezo mee nchọpụta maka etu e si ata ụmụaka na-amụ maka ekpere alakụba ahụhụ na mba Sudan.

A chọpụtara na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ahụ na-aga ihe a kpọrọ 'Khalwas' bụ ebe a na-enye ha ọzụzụ a, na-eji anya ha ahụ nwịị n'aka ndị na-enye ha ya bụ ọzụzụ.

BBC mere nnyocha a n'ime Khalwa iri abụọ na atọ (23), ebe ha chọpụtara na ụmụaka dị afọ ise sokwa ata ya bụ ahụhụ gụnyere ịtụ ha ịga nakwa itikasị ha ahụ.

Ha chọpụtakwara na e nwere ụfọdụ ndị e dinara n'ike.

Lee ihe onyonyo a n'uju.

Onye haziri ya bụ Nnamdi Agbanelo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: