Bishọpụ Paulinus Ezeokafor etinyela ọnụ na ngagharịiwe END SARS

Bishọpụ Paulinus Ezeokafor bụ bishọpụ ndị Katọlik nke Ọka Dayọsis etinyela ọnụ n'ihe gbasara END SARS.

O kwuru na ọ bụ emeghi ihe mgbe e kwesịrị ime ya na-ebute mmebi ihe.

O kwuru na ndị SARS emekarịala ihe e dinyere ha, mere ka ndị ntorobịa wewe iwe a ha na-egosi ugbua.

Bishọpụ gara n'ihu kwuo na ndị ntorobịa ekwuola uche ha, ndị isi anụ, na ọ ga-adị mma ịkwụsịlata ugbua.